Ị́hé ngosi ebe Aliko Dangote, onye ịsị oche òtù ụlọrụ Dangote, na-ekwu na-ohibela atụmatụ mmụba ego “ga-enyere ndị Naịjirịa aka ịwulị akụ ha” aputala ihe na soshal midia.
N’ihe ngosi nkeji abụọ ahụ, a hụrụ ka Dangote na-akwado nya bụ atụmatụ nke n’enweghi aha, ma na-ayokwa ndị Naijiria ruru afọ iri atọ (30 years) ka ha tinye ego ha.
E jiri isi okwu dere “atutumatu akụnụba m nye ndị Naịjirịa” were bipụta nya bụ ozị.
“N’afọ a, ị nwere ike ịsonye na atutumatu a kwadoro ịji nyere ndị Naijiria aka wulite akụnụba ha. Puku kwụrụ puku ezinụlọ e bidola ihụta ndịche atụmatụ a nwere ikike ịnwe,” ozi ahụ kwụrụ.
“Mara na ị sonye n’atumatu a, ị ga-erita nde Naira abụọ na ụma puku iri isịị n’ịsịị (N2.66 million) n’izu ụka nke mbụ. Ihe a abụghị nrọ, ọdi ị̀rè ma bụrụkwa nke e jịrị ụlọrụ pụtara ìhè were kwado.
“Ótú a ka nya bụ atutumatu si-arụ, ị tinye puku narị Naira atọ na iri asato (N380,000), ị bido rịtawa ego kwa ụbọchị.
ŃNYÓCHÁ
Nyocha CableCheck mere gosịrị n’onweghi ụlọ oba ozi amara ofuma bipụtara ya bụ ozị nke kwesịrị ịbụ ozi gbara ọkpụrụkpụ ma ọbụrụ n’ọbụ eziokwu.
Nyocha miri-emi ọzọ anyị mere gosiri na e nwogharịrị ihe ngosị ahụ ka o di ka Dangote ọna-ekwu gbasara atụmatụ mmụba akụ ahụ.
Anya anyị lere n’ọnụ Dangote n’ihe ngosi ahụ gosiri na atukwasara ihu ya n’elu ihu onye ọzọ.
Nyocha akụkụ ihe ngosi ahụ anyị mere gosịrị na-ewetara nya bụ ihu Dangote site na ajụjụ ọnụ o mere n’ụbọchị iri abụọ n’asaato nke ọnwa Ọktoba na ihe mmemme Future Investment Initiative na Riyadh, Saudi Arabia.
Dangote yi otu akwa dịka nke ihe ngosi ahụ, ihe ndị e sere n’azụ ya bụkwa otu. Okwu ya bụ nke a gbanwere maka na ọ bụghị ihe ndị okwuru n’ihe ngosị nke ezigbo ya ka a nụrụ ọna-ekwu n’ihe ngosi a. Nke a pụtara na a gbanwere ihe ngosi ahụ.
Anthony Chiejina, onye nkwuchitaonu Dangote Group, kwụrụ na ihe ngosi ahụ abụghị eziokwu.
Chiejina gara n’ihu kwuo n’ọbụ AI a kpọrọ “deep fake” ka e jịrị nwogharia nya bụ ihe ngosi.