TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Share
Latest News
RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 29, 2025 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị na-agbasa na sosha midia, ma na-egosị ebe àkwà mmịrị na-ada. A kọwara na ọ bụ na India maọbụ Naijiria ka o mere.

N’ihe ngosị nkeji ise ahụ, a hụrụ ka ụgbọala na-agafe n’okpuru àkwà mmịrị ahụ dịka ọ na-ada, ma hụkwa ka ndị mmadụ ji ụkwụ na-agba ọsọ ndụ.

Ụfọdụ ndị Naijiria bipụtara ozị ahụ na soshal midia dịka o mere n’obodo ahụ.

Otu onye ji Facebook ebiputa ozi a kpọrọ Goodluck Pyagbara, onye nwere ndị na-eso ya ruru puku asaa (7,000 followers), dere isi okwu na-ekwu: “Ótú àkwà mmiri APC jiri nde iri rụọ siri daa”.

A screenshot of the Facebook post

Onye ọzọkwa a kpọrọ Eze Ferdinand, dere isi okwu kwuru: ” Lee ka àkwà mmiri a siri daa, gịnị kpatara o jiri da?”

N’ụbọchị Wednesday, onye ọzọ na Facebook a kpọrọ Abass Tom, biputara ihe ngosị, ma kwuo na ọ bụ na Lafia nke dị na steeti Nasarawa ka nya bụ ihe mere.

A screenshot of the Facebook post

Onye ahụ kwuru na àkwà mmịrị ahụ dara ka izu ụka atọ gara site mgbe ehibere ya, nakwa na e jiri nde naira iri (N10 million) were rụọ ya.

“Ozi mberede: àkwà mmiri dara naanị ịzụ ụka atọ ka ehibechara ya, e jiri nde naira iri were ihebe ya,” onye ahụ biputara na Facebook.

Ka ụfọdụ oge gachara, onye ahụ degharịrị ozi ahụ, ma sị na o mere na India.

CableCheck chọpụtara ńwòghárị́ ahụ site na nnyocha ebe esi enwogharị ihe mbipụta anyị mere.

A screenshot of the edit history

Ótù asafe na Facebook a kpọrọ Dee Elegantz nke nwere ndị na-eso ya ruru pụkụ iri n’otu (11,000 followers) kesakwara ihe ngosị ahụ ma sị na o mere na Lafia nke dị na Nasarawa.

A screenshot of the post

Ótú onye India a kpọrọ @ManishCEO bipụtara ozị ahu ma kwuo na ihe ahụ mere na Bihar, steeti dị na obodo India.

A screenshot of the X post

Onye ọzọkwa ji X e bipụta ozi sịkwa na nya bụ mberede mere na Bihar.

ŃNYÒCHÁ

Na mbụ, CableCheck chọpụtara na ndị mmadụ nọ n’aka nri na-agba ọsọ na-agbaga ebe nya bụ àkwà mmiri na-ada. Nke abụghị ka mmadụ si eme mgbe ihe mberede dị ótú a na-eme.

Ọzọkwa, ụgbọala SUV n’ihe ngosị ahụ na-aga ebe nya bụ ihe mberede na-eme, tinyere na ụzọ ebe ụgbọala ahụ na-agba egosịghị mmebi ọbụla.

Osisi ndị dị n’aka nri na aka ekpe nke ihe ngosị ahụ ezighị ọfụma, tinyere nà mgbe àkwà mmiri ahụ dara n’aka nri, ọ bịara dịka onweghị osisi ọbụla dị ebe ahụ.

Mfokasị anyị mekwụrụ gosịrị ótù asafe na-ebipụtakarị ihe ngosị ejiri AI wogharia. Asafe ahụ bipụtara ihe ngosị ahụ nke zịpụtara ofuma n’ụbọchị ịrị n’anọ nke ọnwa Julaị (July 14).

Nya bụ ihe ngosị kwuru n’isi okwụ ya na ejiri AI mepụta ihe ngosị ahụ.

A screenshot of the post saying it was made with AI

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ahụ bụ nke e jiri AI wogharịa.

TAGGED: bridge collapse, fact check in Igbo, Nasarawa state, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 29, 2025 July 29, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12

RoundCheck, a fact-checking organisation, is set to host a youth-focused poetry festival on media and…

December 8, 2025

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?