TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: ICT ọ̀ sò nà ǹgàlàbá káchá ákwàlíté àkụ̀ n’ụ̀bá Naijiria kámgbè 2021?
Share
Latest News
FACT CHECK: Is Nigeria 4th fastest-growing economy in the world in 2025?
FACT CHECK: How true are Obi’s claims about poverty rate in Nigeria, China and Indonesia?
FACT CHECK: No, Finnish court didn’t approve Simon Ekpa’s extradition to Nigeria
FACT CHECK: Is Cardinal Arinze eligible to be elected as the next Pope?
Rárá, Jonathan kò sọ pé Tinubu yóò se àṣeyọrí nínú ètò ìdìbò fún Ipò Ààrẹ ní ọdún 2027
A’a, Jonathan bai yi hasashen nasarar Tinubu a zaben shugaban kasa na 2027 ba
No, Jonathan no predict Tinubu victory for 2027 presidential election
Ḿbà, Jonathan ágbaghị àmà na Tinubu gà-èmérí ńtùlíáka ónyé ísíàlà ǹkè áfọ̀ 2027
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

ICT ọ̀ sò nà ǹgàlàbá káchá ákwàlíté àkụ̀ n’ụ̀bá Naijiria kámgbè 2021?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published February 2, 2025 4 Min Read
Share

Vincent Olatunji, onye kọmishọna na-ahụ maka ụlọọrụ nchekwa ozi a kpọrọ Nigeria Data Protection Commission (NDPC), kwuru na ngalaba Information and Communication Technology (ICT) bụ ya na-ewebatakarị ego kachasị na mmụba akụ n’ụba Naijiria nke a na-akpọ gross domestic product (GDP).

Ọ sị na ICT ewetala pasentị iri n’isii ruo ịrị n’asaa kámgbè afọ anọ maọbụ ise gara-aga.

Olatunji kwuru nke a n’ụbọchị Tuesday n’ihe omume Arise TV a kpọrọ Prime Time programme.

“N’ọnwa anọ ruo ise gara-aga ngalaba ICT nwere mmụba ego nye akụ n’ụba Naijiria nọ n’etiti pasentị iri n’isii ruo iri n’asatọ (16-18%),” Olatunji kwuru.

“Ebum n’uche anyị n’afọ ole na-abia bụ ịhụ na ngalaba nka n’uzu ọgbara ọhụrụ webatara ihe ruru pasentị iri na abụọ na akụnụba Naijiria, ma i lee ya site n’akụnụba otu tari dollar ($1 trillion) nke Tinubu na-achụ.

“Ị ga-amazị ihe nke a ga-apụta m’ọbụrụ na ngalaba ndị ọzọ webata atụmatụ gbara ọkpụrụkpụ, ihe ga-abịa dị mma.”

ŃNYÒCHÁ

CableCheck nyochara ozi sị na n’ụlọọrụ n’edekọ ozi na Naijiria bụ National Bureau of Statistics (NBS) ebe e dekọrọ mmụba ego Naijiria bụ GDP kámgbè afọ 2021 ruo n’ọnwa Septemba 2024.

Ozị a gosịrị na n’afọ 2021, ngalaba na-ahụ maka ọrụ úgbo bụ ya webatakarịchara ego na akụnụba Naijiria, nke nwere pasentị iri abụọ n’ise n’ụma iri asatọ n’asatọ (25.88%). Ngalaba na-esonye ya bụ nke azụmahịa nke nwere pasentị iri na ise n’ụma iri isii n’itoolu (15.69%). Ngalaba ICT webatara pasentị iri n’ise na ụma iri ise n’otu (15.51%).

N’afọ 2022, ngalaba ọrụ úgbo nodosịrị n’ógó mbụ na ngalaba na-ewetakaricha ego na akụnụba Naijiria, nke nwere pasentị iri abụọ n’ise n’ụma iri ise n’asato (25.58%). Nke na-esonye ya bụ ngalaba ICT, nke nwere pasentị iri n’isii n’ụma iri ise n’abụọ (16.52%) na ngalaba azụmahịa nke nwere pasentị iri n’isii (16%).

N’afọ 2023, ngalaba ọrụ ubi webatara pasentị iri abụọ n’ise n’ụma iri n’asatọ (25.18%), sonyere ICT nke nwere pasentị ịrị n’asaa n’ụma iri atọ n’anọ (17.34%), ebe azụmahịa nwere pasentị ịrị n’ise n’uma ịrị asaato n’atọ (15.83%).

Ozi nke afọ 2024 aputabeghị, mana nke a hụrụ bụ nke sitere n’ọnwa January nke afọ ahụ ruo June n’otu afọ ahụ.

N’ọnwa atọ mbụ nke afọ 2024, ngalaba ọrụ ubi webatara pasentị iri abụọ n’otu n’ụma asatọ (21.08%), ngalaba ICT webatara pasentị iri n’asaa n’ụma iri asatọ n’asatọ (17.88), ebe ngalaba azụmahịa webatara pasentị iri isii n’ụma iri atọ n’itoolu (16.39%) nye akụnụba Naijiria.

Site n’ọnwa April ruo June nke afọ 2024, ngalaba ọrụ ubi webatara pasentị iri abụọ n’abụọ n’ụma iri isi n’otu (22.61%), ngalaba ICT nwetara pasentị iri itoolu n’uma asaa n’asaa (19.77%), ebe ngalaba azụmahịa webatara pasentị iri n’isii n’ụma iri atọ n’itoolu (16.39%).

N’ọnwa atọ ikpeazụ nke afọ ahụ, ngalaba ọrụ ubi webatara pasentị iri abụọ n’abụọ n’ụma iri isi n’ise (22.65%), ngalaba ICT webatara pasentị iri n’isii n’ụma iri atọ n’isii (16.36%), ebe ngalaba azụmahịa nwetara pasentị iri n’anọ n’ụma iri asaa n’asatọ (14.78%).

ḾKPÉBÌ

Site n’ozi ndị a, okwu na ngalaba ICT webatakarịchara ego kachasị na akụ n’ụba Naijiria bụ asị. Ngalaba ọrụ ubi bụ ya webatakarịchara ego na akụnụba Naijiria.

TAGGED: fact check in Igbo, ICT, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu February 2, 2025 February 2, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Is Nigeria 4th fastest-growing economy in the world in 2025?

A viral post claims, based on International Monetary Fund (IMF) projections, that Nigeria ranks fourth…

May 9, 2025

FACT CHECK: How true are Obi’s claims about poverty rate in Nigeria, China and Indonesia?

Peter Obi, Labour Party (LP) presidential candidate in the 2023 elections, sparked a debate with…

May 5, 2025

FACT CHECK: No, Finnish court didn’t approve Simon Ekpa’s extradition to Nigeria

On Tuesday, some social media users and blog sites made a post claiming that a…

April 24, 2025

FACT CHECK: Is Cardinal Arinze eligible to be elected as the next Pope?

A social media user has claimed that Francis Arinze, a Roman Catholic cardinal, is the…

April 21, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Jonathan kò sọ pé Tinubu yóò se àṣeyọrí nínú ètò ìdìbò fún Ipò Ààrẹ ní ọdún 2027

Ní ọjọ́ ajé, ọ̀rọ̀ kan to sọ pé Goodluck Jonathan, Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà tẹ́lẹ̀ sọ pé Ààrẹ Bọla Tinubu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
April 20, 2025

A’a, Jonathan bai yi hasashen nasarar Tinubu a zaben shugaban kasa na 2027 ba

A ranar Talata ne wani rahoto da ke ikirarin cewa tsohon shugaban kasa Goodluck Jonathan ya yi hasashen nasarar Shugaba…

CHECK AM FOR WAZOBIA
April 20, 2025

No, Jonathan no predict Tinubu victory for 2027 presidential election

On Tuesday, one report wey claim sey former President Goodluck Jonathan predict President Bola Tinubu victory for di 2027 presidential…

CHECK AM FOR WAZOBIA
April 20, 2025

Ḿbà, Jonathan ágbaghị àmà na Tinubu gà-èmérí ńtùlíáka ónyé ísíàlà ǹkè áfọ̀ 2027

N’ubọchị Tuesde, ozi na-ekwu na onye bụburu onye isiala Naijiria, bụ Goodluck Jonathan, gbara àmà na onyeisiala Bola Tinubu ga-emeri…

CHECK AM FOR WAZOBIA
April 19, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?