TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íbuụzọ̀ àwụ́sá ḿmíri n’ísí m̀gbè ḿmádụ̀ nà-àsá àhụ́ ọ̀ nà-èbúté ọ́rị̀à stroke?
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íbuụzọ̀ àwụ́sá ḿmíri n’ísí m̀gbè ḿmádụ̀ nà-àsá àhụ́ ọ̀ nà-èbúté ọ́rị̀à stroke?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published October 31, 2023 4 Min Read
Share

Edemede á hụtara nà ịntanetị na-akọwa nà ọ̀tụ́tụ́ mmadụ na-enwe nkpọnwụ ahụ, nke ndị bèkéè na-akpọ stroke, ébé há nà-àsá ahụ maka nà há bù ụzọ wụ́sá mmiri n’isi.

Edemede a kwuru na usoro a na-eme kà ọbara gaa n’isi ngwa-ngwa, nke nwere ike ịgbawa ákwárà.

“Dịka ọtụtụ nnyocha sayensị n’ụwa niile kwuru, ọnụ ọgụgụ ọnwụ mmadụ maọbụ nkpọnwụ akụkụ ahụ mgbe á nà-àsá ahụ na-arị kà ụbọchị na-aga. Dịka ndị dibịa oyibo kwuru, e kwesiri kà e soro ụfọdụ usoro dịka anyị na-asa ahụ,” edemede ahụ kwuru.

“Ọbụrụ na ịsoghị ézí usoro dịka ị nà-àsá ahụ, ị nwere ike ịnwụkwa.”

Edemede à gbakwunyere nà ndị dọkịta nyere ndụmọdụ megịde ibu ụzọ àwụ́sá mmiri n’isi m̀gbè mmadụ na-àsá ahụ, maka n’onwere ike iweli òtú ọ̀bàrà sì aga n’akụkụ ahụ, nke nwere ike iweli ikike ńkpọ́nwụ́ ahụ stroke, ọkachasị màkà ndị nwere ọbara mgbali elu, oke choloestorel, maọbụ isiọwụwa.

Edemede áhụ̀ kwuru kà á na-asa ahụ site n’ịbịanye ụ́kwụ́ na mmiri, ma jiri nwayọ sárá gbagowezie elu, ma werezie nwayọ wụsa mmiri n’isi.

Nnyocha TheCable mèrè kpughere na edemede ahụ bụ nke ekegoro kamgbe 2019, mgbe Mohammad Ulah, onye ji Facebook ezịsa ọzị, biputara ya n’asafe nke ya.

Onye ọzokwa zipu ótù ozi à nà ịntanetị n’afọ 2020, nke nwetara ihe karịrị mmasị narị atọ, nkesa ótù narị nà iri asaa, ya na ntụnye ọnụ iri isii n’ise.

N’otu aka ahụ, n’áfọ̀ 2021 na 2022, edemede a bụ nke ekesara ọtụtụ ugboro.

N’izu ụka gara aga, edemede à bụ nke á bịara hụta ọzọ na ịntanetị n’okwu kwa okwu. Nya bụ edemede jìkwà ótù ihe ngosi gbásà.

ÍHÉ NA-EBUTE Ọ́RÌÀ STROKE

Ụlọrụ màkà njikwa ọrịa ná ḿbà US bụ Centre for Disease Control (CDC) kọwara nà nkpọnwụ ahụ na-eme m̀gbè enwere mgbochi ná ngazu ọbara n’ụfọdụ akụkụ ụ̀bụ́rụ̀, maọbụ mgbe ákwárà ná-eziga ọbara n’ụbụrụ gbapuru. Mgbe nke à mere, ụfọdụ akụkụ ụbụrụ ga-enwe nsogbu, nkwarụ oge tere áká, maobu búté ọnwụ.

TheCable gara n’ọba ozi nke otu di iche iche na-eneba anya màkà ahụike mmadụ. Nke a gụnyere ọba ozi National Health Service nke mba UK, Mayo Clinic, nà John Hopkins Medicine. Ebumnuche nnyocha a bụ ịchọpụta ihe na-akpata nkpọnwụ akụkụ ahụ.

Mànà onweghị nke kwuru nà esoghị nya bụ usoro eji asa ahụ na-akpata nkpọnwụ akụkụ ahụ.

‘ÒNWÉGHỊ ÍHÉ JIKỌTARA STROKE NÀ ÚSÒRÒ Ị́SA ÀHỤ́’

Omojowolo Olubunmi, onye ọkachamara na-ahụ màkà nkpọnwụ ahụ ma bụrụkwa dọkịta na-ahụ màkà ụ̀bụ́rụ̀ nà UK, gwara TheCable na edemede ahụ abụghị eziokwu.

Ọ kọwara nà ịwụ mmiri n’isi na-emetụta sọsọ ákwárà isi ndị nọpụtara-anọpụta, nke na-eme kà há kpákọ́ọ́ maọbụ méghéé site nà ọkpọmọkụ nya bụ mmiri.

 

“Ákwárà ndị nọpụtara-anọpụta anaghị akpata stroke. Ndị na-akpata stroke bụ ndị nọbara n’ime ụbụrụ. Nakwa, mmiri anaghị emetụta ha n’ụzọ adịghị mma, nke mere edemede ahụ jiri ghara ịnwe nnyocha sayensị ọ gbadoro ụkwụ nà yá,” ihe à kà o kwuru.

“Mkpọnwụ ahụ anaghị eme òtù ahu. Enwere ihe ndi na-akpata nkpọnwụ ahụ. Onweghị ụzọ usoro ịsa ahụ siri metụta ya. Mà ìsìrì n’isi maọbụ n’ụkwụ saa ahụ, ọ gbanweghị ihe ọbụla.

“Ihe na-ebute stroke bụ nsogbu dịka ọbara mgbalị elu, ọrịa suga, ákwárà ịgbawa, obi ịkụ n’usoro n’adịghị mma. Ọtụtụ nkpọnwụ ahụ na-abụkarị màkà ọbara enweghị ike ịga n’ụbụrụ.”

NCHỊKỌTA

Edemede nke na-ekwu nà ibuụzọ awụsa mmiri n’isi mgbe mmadụ na-asa ahụ nwere ike ibute ḿkpọ́nwụ́ akụkụ ahụ bụ àsị́. Onweghị nnyocha sayensị kwadoro ya.

TAGGED: health Fact-Check, stroke

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu October 31, 2023 October 31, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?