Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n’ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ na ndị ọrụ ya na-enwe nsogbu na Benin di ochie.
Na mbipụta n’ụbọchị Thursday, Olusegun Ogungbemide, onye nkwuchita ọnụ FRSC, kwụrụ na-esere ihe ngosị ahụ n’ụbọchị iri n’isii nke ọnwa Julaị nke afọ 2020 n’okporo ụzọ siri Benin gawa Sapele, ma gbakwunye na e kpeziela nya bụ okwu.
O kwụrụ na nkesa ihe ngosi ahụ bụ ụzọ ndị ọchọnganọkọ ji enweta ntụnye ọnụ na soshal midia.
“Uche ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) abiala na ihe ngosi na-éwù ebe onye ọkwa ụgbọala ụkwụ atọ, gba ọtọ, na abara onye ọrụ anyị mba, mana emebisikwa ụgbọala n’okporo ụzọ sịrị Benin gawa Sapele na Edo steeti,” ozi ahụ kwuru.
“Ozi ahụ bụ ụzọ ndị ọchọnganoko chọrọ ịji nweta ntụnye ọnụ na soshal midia, dughe ndị mmadụ, ma kpalite ebere ndị mmadụ na okwu e kpezichagoro.”
Ogungbemide kwuru na onye ọkwa ụgbọala ahụ bụ Adeshine Adeyemo, bụ onye a kpọpụrụ n’ihu F. Ojehumen, onye ọka ikpe nke Evbuoriaria Magistrate Court dị na Benin nke ọ́nụ́ọ́gụ́gụ́ okwu ahụ bu MEV/117C/2020.
Ogungbemide kwụrụ na-akpọchiri Adeyemo na nga ọnwa atọ maka ịma ụma emebi ihe na ịmesa udo ndị mmadụ n’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa Januwari nke afọ 2021.
O kwukwara na FRSC hibere òtù maka ịleba anya n’omume ndi ọrụ ha nke a hụtara n’ihe ngosị ahụ.
Ka nke a gachara, ndị ọrụ ahụ dị asaa bụ ndị e weturu ọkwa ha maka agwa n’ezighi ezi ha kpara,” onyenkwuchita ọnụ FRSC kwuru.
“Anyị bịara kpọga ha ụlọrụ ọzọ n’usoro iwu anyị, nke na anaghị anabata omume n’ezighi ezi.”
Ogungbemide kwụrụ na FRSC agaghị anabata agwa n’ezighi ezi ebe ndị ọrụ ya nọ, ma sị na ọ ga ata onye ọrụ ọbụla nke kpara àgwà n’adịghị mma.
O kwụrụ na-ịkesa ihe ngosi ahụ bụ ụzọ ịdughe ndị mmadụ ikweta na ihe ahu mere na nso-nso a.
“FRSC na-ayọ ndị mmadụ ka ha wezụga ozị ochie ahụ nke e kpezichara n’ụlọ ikpe ebe onye ọkwa ụgbọala ahụ na onye ọrụ anyị nwetara ntarama ahụhụ rụrụ ya.
Ogungbemide kasịrị ndị Naijiria obi na ngalaba ahụ dị njikere ịkwalite ezi mmekọrịta n’etịtị ndị ọkwa ụgbọala na ndị ọrụ FRSC.
Ọ yọkwara ndị Naijiria ka ha na ndị na-akwado iwu na-arụkọ ma gbakwunye na FRSC ga-akwado ùgwù ndị mmadụ.