TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: È nwèrè ńdị́ Naijiria 1.3m nọ́ n’ụ́lọ̀ ǹgá n’obodo India dị́kà Ọhaneze kwùrù?
Share
Latest News
Did Tinubu attend same school with Alexander Zingman? Here is what we know
FACT CHECK: Did Nigeria deploy peace support mission to Israel?
FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?
FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?
FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015
Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé
Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

È nwèrè ńdị́ Naijiria 1.3m nọ́ n’ụ́lọ̀ ǹgá n’obodo India dị́kà Ọhaneze kwùrù?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published November 24, 2024 4 Min Read
Share

Ọhaneze Ndigbo, òtù na-akwalite omenala, ekwuola na e nwere ndị Naijiria otu nde na ụma narị puku atọ (1.3 million) nọ n’ụlọ nga na obodo India.

Okechukwu Isiguzoro, onye secretary -general nke òtù ahụ, kwuru nke na mbipụta okwu iji nabata Narendra Modi, onye isiala obodo India, na Naijiria.

Isiguzoro, onye sịrị na ọnụogugu a bụ nke sitere na “ozi e nyochara ọfuma”, kwuru na ndị Niajiria nọ na ngã na India bụ ha kachasị na obodo ndị ọzọ.

“Ihe nwute nye anyị bụ ọnọdụ ndị Naịjirịa na mba ofesi — nke mmadụ otu nde na ụma narị puku atọ (1.3m) nọ̀ na nga na steeti iri abụọ na asatọ nke obodo India, nke bụ ọnụogugu ndị Naijiria kachasị na obodo niile,” ozị a kwuru.

“Ọnụogugu dị otú a kwesịrị ị nata nleba anya nke obodo ahụ.”

Isiguzoro boro ndị ǹdú obodo India ebubo ịkpọchi ndị Naijiria n’enweghị ihe ha mere na nga, ma yọ ka e welite okwu dị ótú a elu n’ime ihe ndị dị mkpa Tinubu na Mordi ga-àkpá.

“Anyị na-ayọ onye isi ala Bola Tinubu ka o kwuo gbasara ịtọghepụ ndị a kpọchịrị na ngã n’obodo ahụ, site n’ọnọdụ ịgbaghara ha mpụ ha mere, nke n’egosi nkwenye n’ikpe nkwụmọtọ,” Isiguzoro kwuru.

Isiguzoro kwuru na ozi a bụ ịji chekwaa ugwu ndị nọ na mmekpa ahụ na mmegide nke agbụrụ ha a na-akpọ racism.

È nwèrè ńdị́ Naijiria 1.3m nọ́ n’ụ́lọ ǹgá na India?

Ị́ nyocha okwu a, TheCable lebara anya na website ụlọrụ ngã obodo India bụ National Prisons Information Portal (NPIP), nke bụ atụmatụ gommeti obodo ahụ ịhụ na e gosiri ọnụogugu ndị niile nọ na ngã India.

Dịka website ahụ kwuru, ozi dị na nya bụ̀ nke ana e dezighara kwa áwà anọ ọbula. Ozi dị ebe ahụ na egosi ndị niile nọ n’ụlọ nga n’obodo ahụ.

TheCable bịara yọchasia ọnụogugu ndị nga nile na website ahụ, ma chọpụta na ọ bụ naanị na steeti iri abụọ na ise (25) n’ime steeti iri abụọ n’asaato (28) ka a kpọchiri ndị Naijiria na nga n’obodo ahụ.

Dịka n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Novemba, website ahụ na-egosị ọnụ ọgụgụ ndị a kpọchiri na nga dị puku narị ise, iri abụọ na isii, narị ise na iri isii na itolu (526,569 inmates). Ebe ndị bụ ndị Naijiria pụtara otu puku, narị itoolu na iri atọ n’atọ (1,933 inmates).

Steeti Manipur nwere ọnụogugu ndị Naijiria nọ na ngã kachasị nke bụ mmadụ otu puku na itoolu (1,009 inmates), Ebe steeti ndị dị ka Meghalaya, Andhra Pradesh, Assam, and Puducherry nwere naanị otu onye kwa steeti bụ ndị akpọchiri na ngã.

Nchikota ha bụ nke gosịrị na e nwere nweli n’ọnụ ọgụgụ mmadụ otu puku na otu nari (1,100 inmates) ndị a kpọchiri na ngã n’afọ 2015 n’obodo ahụ, dịka, Ajjampur Ghanashyam, onye bụ bụrụ high commissioner obodo India na Naịjiria, kwuru.

Okwu Isiguzoro bịara karịzie nchịkọta ọnụogugu ndị niile nọ nga n’obodo ahụ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na e nwere ndị Niajira otu nde na ụma narị puku atọ (1.3 million) na ụlọ nga dị n’obodo India bụ asị.

Ozi si na ngalaba gọọmenti obodo ahụ kwuru na naanị ndị Naijiria otu puku, narị itolu na iri atọ n’atọ (1,933 inmates) nọ na nga n’obodo ahụ.

TAGGED: fact check in Igbo, news in Igbo, Nigerians in Indian prisons

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu November 24, 2024 November 24, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Did Tinubu attend same school with Alexander Zingman? Here is what we know

During the launch of the renewed hope mechanisation programme in Abuja on Monday, President Bola…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did Nigeria deploy peace support mission to Israel?

A Facebook video purports that Nigeria deployed troops for a joint peace support mission in…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?

A viral X post claims that Nigeria’s new national anthem was not recited during the…

June 13, 2025

FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?

Reports of a military coup in Cameroon ousting President Paul Biya have gone viral on…

June 13, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert Francis Prevost, Pope Leo XIV…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu

One Facebook user claim sey Pope Leo XVI and oda bishops join mouth beg President Bola Tinubu to release Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba

Wani mai amfani da Facebook ya yi ikirarin cewa Paparoma Leo na 16 da wasu limaman coci sun roki shugaban…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?