TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Customs: Íhé ńgósị́ kọ́wárá nà á gbàgbùrù nwókè màkà égó áká azụ N5k mèrè n’áfọ̀ 2019
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Customs: Íhé ńgósị́ kọ́wárá nà á gbàgbùrù nwókè màkà égó áká azụ N5k mèrè n’áfọ̀ 2019

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published June 7, 2025 3 Min Read
Share

Ngalaba Nigeria Customs Service (NCS) ebiputala ozi gbasara ihe ngosị ebe onye ọrụ ha bara na nsogbu maka ịgbagbu ótù nwoke.

Ihe ngosị a pụtara ìhè na soshal mịdia n’ụbọchị Tuesdea, dịka ótù onye na Facebook bipụtara ya, ma kwuo na o mere n’ụbọchị ahụ.

“Onye ọrụ ngalaba Customs n’okporo ụzọ siri Lagos gawa Benin Expressway gbagburu onye si njem n’ihi na o kweghị enye ya ego aka azụ puku naira ise (N5,000),” isi okwu sochiri ihe ngosị ahụ kwuru.

“Ndị njem ahụ si mba US and UK na-aga Benin.

“Ihe a mere taa, ụbọchị atọ nke ọnwa June nke afọ 2025. Biko kesaa ya ka o rute ndị nọ n’ọchịchị. Gịnị ka obodo na-achọzi ịbụ?”

N’ime nya bụ ihe ngosị, a nụrụ ka otu nwanyị na-eti mkpụ ma na-ebo onye ọrụ Customs áhụ̀ ebubo na ọ gbagbụrụ mmadụ n’ihi ego akazụ N5,000.

Nwanyị ahụ kwuru ihe ndị a na asụsụ Pidgin English.

A hụkwara ka onye njem ahụ na-àkụ́ onye ọrụ Customs ihe, ebe ózú nwoke e gburu tọgbọ n’ala.

CUSTOMS KWÙRÙ NÀ ÍHÉ ŃGÓSỊ́ ÁHỤ̀ DỊ̀ ÓCHÍÈ

Na mbiputa nke Abdullahi Maiwada, onye nkwuchita ọnụ Customs, o kwuru na nya bụ ihe mere n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2019.

Ozi a bụ nke ebiputara n’aha Bashir Adeniyi, onye comptroller-general nke Customs.

Maiwada kwuru na ihe ahụ mere na okporo ụzọ Shagamu Interchange na Ogun steeti, ma gbakwunye n’ụlọọrụ Customs lebara anya na nya bụ mgberede mgbe o mere.

“Anyị biputara ozi mgbe ihe ahụ mere, anyị hiberekwara òtù ga-enyocha ihe mere n’ụbọchị ahụ ọfụma,”Maiwada kwuru.

“Ka nke a gachara, ntaramahụhụ ruru onye ọrụ ahụ bụ nke e nyere ya, nke gụnyere ịchụ ya n’ọrụ.

“Ọdị mkpa ikwu ọzọ na Customs bụ ụlọrụ gọọmentị nke nwere iwu ndị ọrụ ya kwesịrị iso, dịka nke a, ọ naghị akwado àgwà n’ezighi ezi nke ndị ọrụ ya.

“N’agbanyeghị na ihe ngosị ahụ pụtakwara ihe ọzọ, e kpebiela nya bụ okwu, ma nyekwa onye uwe ojii ahụ ntaram’ahụhụ ruru ya.

Maiwada gwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ikesa ozị n’ezighi-ezi, kama ka ha chọpụta nke bụ eziokwu site n’ụlọọrụ Customs.

TheCable chọpụtakwara ụfọdụ ozi gbasara mgberede ahụ nke ebiputagasịrị n’afo 2019.

Dịka ozi ahụ kwuru, Customs gonaghiri na onye ọrụ ya ahụ yọrọ akazụ.

Customs kwuru na onye ahụ e gburu bụ nwa afọ Nigeria onye na-agara ndị ọrụ NCS ozi, ma si na ọ bụghị onye si njem dịka ihe ngosị ahụ kwụrụ.

Mgbe ahụ, NCS kwuru na ọ bụ amaghị-ama ka onye ọrụ Customs ahu jiri gbagbuo nwoke ahu.

TAGGED: customs operative, fact check in Igbo, news in Igbo, Shooting

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu June 7, 2025 June 7, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?