TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: CBN èbípụ̀tálá ákwụ́kwọ́ égo ₦5000 na ₦2000, dị́kà ákụ́kọ́ wuru èwù sìrì kọ́wáá?
Share
Latest News
Kò sí ẹ̀rí tó sàfihàn pé Trump halẹ̀ pé òhun yóò ‘mu’ Tinubu láàárín wákàtí mẹrinlelogun
Evidence no dey sey Trump threaten to ‘capture’ Tinubu in 24 hours
Babu wata shaida da Trump ya yi barazanar ‘kama’ Tinubu a cikin sa’o’i 24
FACT CHECK: No evidence Trump threatened to ‘capture’ Tinubu in 24 hours
Anambra guber: Six misconceptions about BVAS, IREV voters should know
FACT CHECK: How true is ADC’s claim that FG is misleading Nigerians on reduced food prices?
Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?
Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

CBN èbípụ̀tálá ákwụ́kwọ́ égo ₦5000 na ₦2000, dị́kà ákụ́kọ́ wuru èwù sìrì kọ́wáá?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published November 19, 2022 4 Min Read
Share

Onyonyo na-egosi akwụkwọ ego nde naira ise na nde naira abụọ na-agbasa na intanetị.

Na onyonyo ahụ, nke e kere na Twitter ụbọchị iri abụo na asaa n’ọnwa Ọktoba, ótù nwa agbọghọbịa zikọrọ ngwugwu nde naira ise na nde naira abụọ.

I hope this is a joke . pic.twitter.com/p8GM6YS1pA

— Dr Penking™🇳🇬🇦🇺 (@drpenking) October 27, 2022

Nwanyị ahụ kwuru na otu nwoke na-ayị ala bịara ịkwụnye ego ahụ na ụlọ akụ ebe ọ na-arụ ọrụ.

“A tụrụ m anya na ihe a bụ ihe egwuregwu”, nke a bụ ihe ótù onye kere onyonyo a dere.

Ndị hụrụ onyonyo a ruru puku iri atọ na atọ.

Ndị ọ masịrị ruru ótù puku na iri abụọ na asatọ. Ndị kere ya ruru narị atọ na iri isii na asaa.

E keela onyonyo a na usoro mgbasa ozi ndị ọzọ dịka Instagram na Facebook, na akaụntụ dị iche iche, ebe ndị Naijiria na-atụghị anya ya gosipụtara ụjọ màkà yá.

Ụbọchị iri abụo na isii n’ọnwa Ọktoba, Godwin Emefiele, onyeisi ụlọ àkụ̀ etiti Naijiria (Central Bank of Nigeria, CBN), sị na nya bụ ụlọ akụ nke kachasị kwuru okwu maka imegharị ụfọdụ akwụkwọ ego.

Emefiele sị na ego ọhụrụ a, nke gụnyere narị naira abụọ, narị naira ise, na otu puku naira ga-adị n’ọha site na Desemba nke afọ 2022.

Nya bụ onyeisi ụlọ akụ sị na mbipụta ego ọhụrụ a bụ maka ihe isi ike dị iche iche nke na-emetụta njikwa ego n’obodo.

NCHỌPỤTA

TheCable jì ngwa ọrụ a na-akpọ Invid were nyochaa onyonyo a, iji chọpụta ma ọ bụ nke ziri ezi. Mfokasị a zikọrọ na onyonyo a adịla na Facebook na YouTube kemgbe afọ 2020.

Site na nlebanya, otu akụkụ nde naira ise ahụ bù foto nwoke yi okpu. Na akụkụ ọzọ bụ foto umunwanyị atọ e tinyere na akụkụ onwe ha.

Ọchịchọ isiokwu màkà ego a na Google zikọrọ na, n’ọnwa Ọgọọst na afọ 2012, ụlọ akụ etiti kwuru na ha chọrọ iwebata nde naira ise.

Sanusi Lamido, onye bụbu onyeisi ụlọ akụ etiti, sị na a ga-etinye ihu ụmụ nwaanyị atọ ọha ma na-agba mgbọ n’ego ọhụrụ ahụ.

Lamido kọwara na iwebata nde naira ise ga-eme ka ogo akwụkwọ ego dị mma, maghị tinye njirimara na ya maka ndị kpụrụ ìsì. Ọ sị na nke a ga-ebelata ọnụ ahịa mbipụta, nkesa, na mkpofu akwụkwọ ego.

Ótú ọ dị, ọtụtụ mmadụ anabataghị okwu a mgbe ahụ. Ụlọ akwụkwọ nke Institute Chartered Accountants of Nigeria (ICAN) sị na iwebata nde naira ise nwere ike ibelata ike ahịa akwụkwọ ego Naira.

Gọọmenti Naijiria, n’agbanyeghị na ha kwenyeburu n’okwu imepụta nya bụ ego, kwụsịtụrụ iwebata nde naira ise “iji mee ka ụlọ akụ etiti kọwara ọha mkpa dị na ya.”

Ụlọ akụ etiti gwara ndị Naijiria na Twitter ụbọchị iri atọ na otu n’ọnwa May n’afọ 2020, ka ha leghara ihe onyonyo adịgboroja anya.

Videos and pictures of purported circulation of N2,000:00 and N5,000:00 banknotes are false and fake. Members of the public are advised to disregard such falsehood and to report anyone found in possession of such banknotes to the law enforcement agencies

— Central Bank of Nigeria (@cenbank) May 31, 2020

Onyonyo ndị mmadụ na-eke na mgbasa ozi ọha bụ nke ochie na atụmanya etiti Desemba nke afọ 2022, ụbọchị CBN kwesịrị iwepụta ego ha megharịrị.

Ka ọ dị ugbu a, ụlọ akụ etiti kwuru maka imegharị narị naira abụọ, narị naira ise, na otu puku naira. CBN ekwughị na ọ chọrọ iwebata nde naira abụọ na nde naira ise.

ÍKPÉ

Onyonyo ndị mmadụ na-ekesa na gọọmenti etiti chọrọ iwebata nde naira abụọ na nde naira ise bụ okwu adịgboroja. Onyonyo ahụ, nke na-eduhie ọha, adịla kemgbe afọ 2020.

TAGGED: Central Bank of Nigeria (CBN), N2000, N5000, Naira redesign

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora November 19, 2022 November 19, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Kò sí ẹ̀rí tó sàfihàn pé Trump halẹ̀ pé òhun yóò ‘mu’ Tinubu láàárín wákàtí mẹrinlelogun

Ọ̀rọ̀ kan sọ pé Donald Trump, ààrẹ orílẹ̀ èdè Amẹ́ríkà ti dúnkokò pé òhun yóò…

November 14, 2025

Evidence no dey sey Trump threaten to ‘capture’ Tinubu in 24 hours

One report don claim sey US President Donald Trump threaten to capture President Bola Tinubu…

November 14, 2025

Babu wata shaida da Trump ya yi barazanar ‘kama’ Tinubu a cikin sa’o’i 24

Wani rahoto ya bayyana cewa shugaban kasar Amurka Donald Trump ya yi barazanar kama shugaban…

November 14, 2025

FACT CHECK: No evidence Trump threatened to ‘capture’ Tinubu in 24 hours

A report claims that US President Donald Trump threatened to capture President Bola Tinubu within…

November 13, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Kò sí ẹ̀rí tó sàfihàn pé Trump halẹ̀ pé òhun yóò ‘mu’ Tinubu láàárín wákàtí mẹrinlelogun

Ọ̀rọ̀ kan sọ pé Donald Trump, ààrẹ orílẹ̀ èdè Amẹ́ríkà ti dúnkokò pé òhun yóò mú Bọ́lá Tinubu, ààrẹ orílẹ̀…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 14, 2025

Evidence no dey sey Trump threaten to ‘capture’ Tinubu in 24 hours

One report don claim sey US President Donald Trump threaten to capture President Bola Tinubu inside 24 hours and im…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 14, 2025

Babu wata shaida da Trump ya yi barazanar ‘kama’ Tinubu a cikin sa’o’i 24

Wani rahoto ya bayyana cewa shugaban kasar Amurka Donald Trump ya yi barazanar kama shugaban Bola Tinubu cikin sa’o’i 24…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 14, 2025

Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?

Ní ọjọ́ ajé, àwọn òṣìṣẹ́ ológun orílẹ̀ èdè Nàìjíríà fi ọ̀rọ̀ kan síta pẹ̀lú àwọn àwòrán lórí àwọn ohun ìgbàlódé…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?