TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Borno steeti ọ̀ bụ̀ ńhá ńjíkọ́tá UK nà Sweden, dị́kà Osinbajo kwùrù?
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Borno steeti ọ̀ bụ̀ ńhá ńjíkọ́tá UK nà Sweden, dị́kà Osinbajo kwùrù?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published September 12, 2022 5 Min Read
Share

Yemi Osinbajo, òsòté onye isi Naijiria, sị na Borno steeti bụ nha UK na Sweden mà é jikọta ha abụọ ọnụ, mà ọ̀ bụ̀ UK nà Denmark.

Laolu Akande, onye na-ekwuchitere Osinbajo, kpughere na ụmụ akwụkwọ ndị Harvard Business School (HBS) bịara ịhụ nya bụ òsòté onyeisi na Aso Rock Villa n’ụbosị iri abụọ na asatọ, n’ọnwa Ọgọstụ.

Ka ya na ụmụ akwụkwọ bịara njem nlegharị ánya Africa na-enwe mmekọrịta, Osinbajo sị na, obụrụ na ḿbà ụwa ga-aghọta mgbagwoju anya nke gbasara akụ na ụba na nchekwa Naijiria, ọ dị mma ítinye ńhá obodo n’échìchè.

Osinbajo kwùrù sị: “Ótú bụ na ọ dị mkpa ịghọta nha obodo. Ọ ga-enye áka ịghọta ihe bụ nsogbu. Dịka omumaatụ, Borno dị ka nha UK niine na mgbakọta Sweden ma ọ bụ Denmark.”

“M̀gbè a kọrọ nà íhé íke na-eme na Naijiria, o nwèrè ike ịbụ íhé mere n’ebe dịpụrụ adịpụ na obodo. Ọtụtụ mmadụ nọ na Abuja na Lagos ga-anụ màkà ya na mgbasa ozi ọha. Nke a bụ nha obodo Naijiria.

“Ha na-ekwu okwu màkà akụ na ụba, e jì anyi atụnyere obere obodo dị na Afrịka. Mana anyị nwere steeti iri na Naijiria nke GDP ya karịrị obodo ndi ahụ. Anyị bụ nnukwu ebumnuche ndị ahịa.”

Borno steeti ò nwere àlà karịa UK niine na mgbakọta Sweden, ma ọ bụ UK na Denmark?

E bipụtara akụkọ a n’akwụkwọ ozi dị iche iche.

NCHỌPỤTA

TheCable gbakọrọ nha Borno, steeti dị n’ugwu ọwụwa anyanwụ. E kepụtara ya n’ọnwa Febụwarị n’afọ 1976, wee kewaa ya ọzọ n’afọ 1991, oge Yobe steeti sì nà yá pụta.

Ewezụga íhé íke mégóró na ya bụ steeti, áhà ọzọ e jìrì mátá Borno bụ “àlá udo”. Na ọdịda anyanwụ ya bụ ébé Yobe steeti nọ. Yá nà Republic Niger nwèkọ̀rọ̀ ókè-ala n’ebe úgwu. Lake Chad (na Republic of Chad) dị Borno steeti n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ. Cameroon dị ya n’ebe ọwụwa anyanwụ.

Webụsaịtị Borno steeti gọọmenti kpughere na nha àlà ya bụ steeti bụ puku iri isii na otu na narị anọ na iri atọ na ise (61,435sqkm). Nke a mèrè ya steeti abụọ kasị úkwúù na Naijiria mà á gachaa Niger steeti.

Ị́dàbéré nà ḿgbàkọ́ NBS (National Bureau of Statistics) bipụtara n’ọnwa 2020, NPC (National Population Commission) zikọrọ na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ na Borno n’ọnwa 2019 tinyere ha nà nde 5.7.

Àlà UK gụnyere agwaetiti Great Britain niine nke nwere England, Wales, Scotland, na akụkụ ùgwù nke agwaetiti Ireland.

Mgbakọ ọba ego ụwa, World Bank, n’ọnwa 2021 tinyere àlà UK nà 241,930 km².

Ụlọ ọrụ nke National Statistics na UK, nke kachasị ebipụta íhé ḿgbàkọ́ màkà ọnụ ọgụgụ gọọmenti, kwùrù na obodo UK nwèrè mmadụ nde iri isii na asaa.

Obodo Sweden dị na Scandinavian Peninsula, n’ugwu Europe. Ísí obodo yá nọ̀ nà Stockholm kamgbe 1523. Sweden na Norway nwèkọ̀rọ̀ àlà na Scandinavian Peninsula, mànà òkè Sweden ká íbù.

Mgbakọ ọzọ ọba ego ụwa, World Bank, mèrè na 2021 kpughere na oke àlà nke Sweden nwere ugbu a bụ 407,310 km². Ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ na nya bụ obodo pụtara nde 10.4.

N’afọ 2021, mbipụta ọba ego ụwa kọwara na oke àlà Denmark bụ 40,000 km². Ọ nwèrè mmadụ nde 5.8.

Borno nwere nnukwu ana. Ọ kà Denmark, ma nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ka yá. Mana Borno kà nọ́tèrè áká n’ebe Sweden na UK nọ, mà á bịa n’ọkwu ọnụ ọgụgụ mmadụ ma ọ bụ íbù àlà yá.

Ńlélé nke TheCable mèrè kpughere na àlà na mmadụ nọ na sọ̀ UK karịrị nke Borno steeti nke úkwúù, ma ewezụga ịgụnye Sweden ma ọ bụ Denmark.

Borno United Kingdom  Sweden Denmark United Kingdom + Sweden United Kingdom + Denmark
Landmass (km²) 61,435 241,930  407,310  40,000  649,240  281,930
Population 5,751,590 67,081,000 10,415,811 5,856,733 77,496,811 72,937,733

ÍKPÉ

Ókwú nke osote onyeisi oche Naijiria, Yemi Osinbajo, kwùrù màkà Borno ịnwe ala dị ka ijikọta UK na Sweden ma ọ bụ UK na Denmark bụ okwu adịgboroja. O kwubigarụ ókwú ókè.

TAGGED: Harvard Business School, Laolu Akande, National Bureau of Statistics (NBS), Yemi Osinbajo.

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora September 12, 2022 September 12, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?