TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Bello el-Rufai tụ̀rụ̀ àsị́, Hadiza Balarabe ábụghị nwányị̀ ìzìzì á họpụ̀tàrà dị́kà òsòté gọ́vanọ̀
Share
Latest News
RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Bello el-Rufai tụ̀rụ̀ àsị́, Hadiza Balarabe ábụghị nwányị̀ ìzìzì á họpụ̀tàrà dị́kà òsòté gọ́vanọ̀

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published March 23, 2024 5 Min Read
Share

Bello el-Rufai, onye omeịwụ na-anọchịte ndị Kaduna north, ekwuola na Hadiza Balarabe bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Naijiria.

Onye omeiwu à kwuru nke a na pọdkastị onye nta akụkọ Seun Okinbaloye hibere.

Pọdkastị a nwere ndị nsonye puku iri na isii na narị atọ (16.3k), nkiri puku iri itoolu n’anọ na narị asaa n’iri isii (94,760), ntụnye ọnụ narị isii n’abụọ (602), na nkwenye puku abụọ na narị itoolu (2.9k).

Bello bụ nwa Nasir el-Rufai, onye bụbu gọvanọ Kaduna steeti.

N’afọ 2018, Nasir el-Rufai họpụtara Balarabe dịka osote ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ Kaduna nke afọ 2019.

O kwuru na mkpebi ịhọrọ Balarabe bụ maka na Barnabas Bantex, osote ya, gwara ya maka mkpebi ya ịzọ ọkwa sịnatọ.

Tupu à họrọ ya dịka onye osote el-Rufai, Balarabe bụ onye isi odeakwụkwọ nà Kaduna State Primary Health Care Development Agency.

ŃNYÒCHÁ

N’okwu ọrụ nna ya, onye omeiwu Bello El-Rufai kwuru na nna ya, site n’aka Balarabe, gwọgharịrị ụlọ ahụike narị abụọ na iri ise n’ise (255) niile dị na Kaduna.

“N’ihu ọma, ótù n’ime ọrụ nna m na osote ya bụ Hadiza Balarabe, onye nke bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Naijiria, bụ ịrụgharị ụlọ ahụike narị abụọ na iri ise n’ise (255) niile dị na Kaduna,” onye omeiwu a kwuru.

K’osiladị nnyocha TheCable mere gosịrị na, kamgbe afọ 1999 ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachitara, Naijiria enwela ọtụtụ osote gọvanọ bụ nwanyị n’ọtụtụ steeti.

Ụ́MỤ̀ NWÁNYỊ̀ ŃDỊ́ Á HỌPỤ̀TÀGÒRÒ DỊ́KÀ ÒSÒTÉ GỌ́VANỌ̀ NÀ NAIJIRIA

Lagos bụ steeti izizi ịhọpụta nwanyị dịka osote gọvanọ. N’afọ 1992, oge enwere obere ọchịchị onye kwuo uche ya, a họpụtara Micheal Otedola dịka gọvanọ Lagos, n’okpuru òtù National Republic Convention (NRC), ebe Sinatu Ojikutu bịara bụrụ osote ya.

Ojikutu chịrị dịka osote gọvanọ ruo ọnwa Novemba nke afọ 1993 mgbe ndị agha naghara ọchịchị.

N’afo 1999, Naijiria laghachiri na ọchịchị onye kwuo uche ya. Bola Tinubu meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’okpụrụ òtù Alliance for Democracy (AD), ebe ọ họpụtara Kofoworola Akerele-Bucknor dịka osote ya.

Site n’oge ahụ, ụmụ nwanyị ndị dịka Adebisi Sosan, Adejoke Orelope-Adefulire, na Oluranti Adebule gara n’ihu ịchị dịka osote gọvanọ a họpụtara site n’afọ 2007 ruo afọ 2019.

Ayo Fayose họpụtara Abiodun Olujimi dịka nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Ekiti steeti site n’ọnwa Septemba nke afọ 2005 ruo 2006. Kayode Fayemi mere Funmilayo Olayinka osote ya site n’afọ 2010 ruo afọ 2013 tupu ọ nwụọ, ebe Modupe Adelabu bịara bụrụ osote gọvanọ na ọnwa May nke afọ 2013.

Na Ogun steeti, Salimat Badru bụ osote gọvanọ site n’afọ 2003 ruo 2011, ebe Yetunde Onanuga bụ osote gọvanọ site n’afọ 2015 ruo afọ 2019.

Na Osun, Olusola Obada bụ osote gọvanọ site n’afọ 2003 ruo afọ 2010, n’okpuru ọchịchị Olagunsoye Oyinlola, ebe Titilayo Laoye-Tomori bịara bụrụ osote gọvanọ n’afọ 2010 ruo 2018.

Pauline Tallen bụ osote gọvanọ Plateau steeti n’afọ 2017, ma bụrụkwa nwayị izizi ịbụ osote gọvanọ na mpaghara ugwu nke Naijiria, ebe Nyesom Wike mere Ipalibo Banigo osote ya na Rivers steeti, site n’afọ 2015 ruo 2023.

Cecilia Ezeilo bụ osote Ifeanyi Ugwuanyi mgbe Ugwuanyi merichara dịka gọvanọ steeti Enugu n’afọ 2015.

A họpụtara Noimot Salako-Oyedele dịka osote Dapo Abiodun nke Ogun steeti n’afọ 2019, n’otu afọ ahụ Balarabe batara ọchịchị dịka osote gọvanọ na Kaduna.

N’afọ 2022, Uba Sani họpụtara Balarabe dika osote ya na ntuliaka e mere na steeti ahụ. N’ọnwa March nke afọ 2023, Balarabe mechara bụrụkwa osote gọvanọ steeti ahụ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu Bello el-Rufai na Balarabe bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Niajira bụ asị.

Sinatu Ojikutu bụ nwanyị izizi a họpụtara dịka osote gọvanọ na Naijiria.

TAGGED: Bello el-Rufai, Igbo Factcheck

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 3, 2024 March 23, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12

RoundCheck, a fact-checking organisation, is set to host a youth-focused poetry festival on media and…

December 8, 2025

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?