TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Atiku gwàrà Arise TV ọ̀tụ́tụ́ íhe — mànà òlé bụ̀ ézíókwu?
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Atiku gwàrà Arise TV ọ̀tụ́tụ́ íhe — mànà òlé bụ̀ ézíókwu?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published August 7, 2022 8 Min Read
Share

Na ajụjụ ọnụ nso nso Arise TV mèrè, Atiku Abubakar, onye na-eso onye isi na mbụ ma bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP), kwuru ọtụtụ ihe gbasara atụmatụ ọ nwere màkà Naijiria.

TheCable nyochara ọtụtụ okwu a. Née ihe anyị chọpụtara.

OKWU NKE MBỤ: Abraham Lincoln, ótù ndị isi America nke ama ama, zoro ọchịchị ugboro ise ma ọ bụ isii tupu ò nwe mmeri.

IKPE: Okwu adịgboroja

Abraham Lincoln á zoro ọchịchị ugboro ise ma ọ bụ isii dị ka Atiku kwuru. Lincoln nwere mmeri oge izizi ọ zoro ịbụ onye ịsị na afo 1860. A hoputara ya ọzọ ịbụ onye ịsị na afọ 1864.

Ọ bụ onye isi iri na isii na United States. John Wilkes Booth gbùrù ya na Ford’s Theatre, Washington DC. Ọ nwuru ụbọchị iri na ise n’onwaEprel na afọ 1865.


OKWU NKE ABỤỌ: Onweghị ìwú ji ndị ọlụ oyibo ịzụ ahịa na Naijiria.

IKPE: Iwu Naijiria enyeghị ndị na-arụ ọrụ oyibo ikike ịzụ ahịa.

Ngalaba isii nke Code of Conduct Bureau (CCB) na Tribunal Act nyèrè naanị ohere ka ndị ọrụ oyibo kọ̀ọ́ úgbo, nke oriri ma ọ bụ nke orire.

Ótù ndokwa ahụ dịkwa na ngalaba abụọ nke usoro nhazi nke ise dị na iwu 1999.

Timi Olagunju, onye na-ahụ maka iwu na onye nyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị, gwara TheCable na ngalaba isii nke ụlọ ọrụ ụkpụrụ omume na usoro ikpe (CCB & Tribunal Act) dòrò ányá.

O kwùrù sị: “CCB bụ omume nke nzuko omeiwu nke iwu kwadoro. Ọ bụ iwu. Ọ bụghị ihe enyemaka ma ọ bụ ụkpụrụ iwu. Ngalaba isii kwùrù na ndị ọrụ oyibo agaghị etinye aka na ịzụ ahịa bụ nke ya ma ọbụ ọrụ nke ya, ewezuga ọrụ ugbo, ikwado ugbo.

“Ọ dị ḿkpà ịma na iwu nwere nnwere onwe. Onye ọrụ oyibo nwere ike ịzụ ahịa nke ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ọ na-arụ bụ ọrụ ọ̀kàrà ógè.”

Olagunju sị na, kamgbe ọ na-ọru ọrụ ọka iwu, ọ hụbeghị onye ọrụ oyibo a mara ikpe maka na ọ na-azụ ahịa makwa na arụ ọrụ oyibo.


OKWU NKE ATỌ: Egypt nwèrè mmadụ nde iri asatọ. Ndị uwe ojii ha karịrị nde abụọ.

IKPE: Okwu adịgboroja

Onweghị ihe akaebe ịkwado okwu a na Egypt nwere uwe ojii nde abụọ.

Dị ka nnyocha Home Office nke afọ 2015 uwe ojii Egypt si kwuo, ndị uwe ojii obodo Egypt nwere ihe dị ka mmadụ puku atọ na ịrị ise na-ahụ na ndị mmadụ debere iwu na-eme ihe n’usoro ọha na obodo niile.

Ngụkọta ike ndị agha Egypt n’ọnwa Septemba na afọ 2014 bụ narị anọ na ịrị ise na asatọ na narị ise. Ndị army ruru narị puku anọ na iri anọ. Ndị air force ruru otu narị puku. Ndị navy rụrụ pụkụ ịrị na asatọ na ise. Ngụkọta ndị ha debere ruru narị anọ na iri asaa na itoolu.

Ngụkọta ndị agha niile Egypt nwere erughị nde abụọ dị ka Atiku si kwuo.

Dị ka akụkọ Worldatlas toro na afọ 2017, nke edeputara obodo iri atọ dị n’elu ka nwé ndị uwe ojii, China bu ụzọ. Ndị uwe ojii ha nwere ruru otu ihe nde isii. Ndị n’eso ya bụ India na United States. Ndị uwe ojii India ruru otu nde na narị ise na iri asatọ na ise, narị atọ na ịrị ise na atọ. Ndị uwe ojii United States ruru narị itoolu na iri na atọ na otu narị na iri isii na otu.

Onweghị obodo so na ndị isi iri atọ nwere ndi uwe ojii ruru nde abụọ. Egypt esoghị na ihe ndepụta nke worldatlas rubere isi.

Ka ọ dị ugbu a, dị ka United Nations Population Funds (UNFPA) si dee, ọnụ ọgụgụ mmadụ na Egypt ugbu a bu otu narị na isii nde abụọ ọ bụghị nde iri asatọ.


OKWU NKE ANỌ: Ngalaba mmanụ nọchiri anya pasenti ịrị abụọ na GDP Naijiria.

IKPE: Nke a bụ okwu adịgboroja

Data statista zikoro na, n’etiti nkeji ịrị na anọ nke afọ 2018 na nkeji iri na ise nke dị na afọ 2021, onyinye ngalaba mmanụ na-eweta na GDP obodo elughị pasenti ịrị.

TheCable chọrọ data nke National Bureau of Statistics (NBS) weputara, were chọpụta na ngalaba mmanụ kacha elu n’etiti 2019 and 2021 bụ pasenti itoolu na iri asaa na asaa na nkeji nke atọ na afọ 2021.

N’afọ 2021, ngalaba mmanụ mere ka GDP gbadaa ruo ákàrà asaa pasenti ịrị abụọ na anọ. Ọ nọbu na pasenti asatọ iri na isii na afọ 2020.

Site na data dị, TheCable chọrọ na afọ atọ gara aga. Ngalaba mmanụ ewetala onyinye pere mpe ugboro ugboro karịa pasenti ịrị na GDP Naijiria.


Reuben Abati and Tundun Abiola.

OKWU NKE ISE: Enwere uwe nchekwa iri na asaa na obodo a. Agbụrụ dị iche iche na-achị ha niile.

IKPE: Okwu a abụchaghị eziokwu

Nlele nke TheCable mere zikoro na ọtụtụ ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa bụ ndi ugwu Hausa.

Otú ọ dị, mkpụrụ ụlọ ọrụ nchekwa nwere ole na ole south na-edu ya. Ha gụnyere defence intelligence agency, onye isi ya bụ Samuel Adebayo, onye sị Ekiti steeti (south west); nakwa Lucy Irabor, onye ịsị defence staff, nke sị Delta steeti (south-south).

Oladayo Amao, onye isi ndị ọrụ ikuku ugbu a, si na Osun steeti (south-west).

S/N Security agency Head of agency State of origin Geo-political zone
1. State Security Services (SSS) Mr. Yusuf Magaji Bichi Kano state North-west
2. National Intelligence Agency (NIA) Abubakar Ahmed Rufai Katsina state North-west
3. Defense Intelligence Agency (DIA) Samuel Adebayo Ekiti state South-west
4. Chief of Defence Staff General Lucky Irabor Delta state South-south
5. Nigerian Army Faruk Yahaya
(Chief of Army Staff)
Sokoto state North-west
6. Nigerian Navy Awwal Zubairu Gambo (Chief of Naval Staff) Kano state North-west
7. Nigerian Air Force Oladayo Isiaka Amao (Chief of Air Staff) Osun state South-west
8. Nigeria Police Force (NPF) Usman Alkali Baba (Inspector General of Police) Yobe State North-East
9. Nigeria Customs Service Col. Hameed Ibrahim Ali (Rtd.) Bauchi state North-east
10. Nigerian Correctional Service Haliru Nababa (Controller-General) Sokoto state North-west
11. Nigerian Security and Civil Defense Corps (NSCDC) Ahmed Abubakar Audi (Commandant General) Nasarawa state North-central
12. Nigeria Immigration Service CGI Isah Jere Idris (Comptroller General of Nigerian Immigration.) Kaduna state North-west
13. National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa (Rtd.) Adamawa state North-east
14. Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) Abdulrasheed Bawa Kebbi state North-west
15. Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) Professor Bolaji Owasanoye SAN Ondo state South-west
16. National Security Adviser Babagana Monguno Borno state North-east

 

TAGGED: 2023 elections, ARISE TV, atiku abubakar, PDP

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora August 7, 2022 August 7, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?