TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Atiku gwàrà Arise TV ọ̀tụ́tụ́ íhe — mànà òlé bụ̀ ézíókwu?
Share
Latest News
Customs: Íhé ńgósị́ kọ́wárá nà á gbàgbùrù nwókè màkà égó áká azụ N5k mèrè n’áfọ̀ 2019
Customs say video wey officer shoot man sake of ‘N5k bribe’ na since 2019
Ọdún 2019 ni ìṣẹ̀lẹ̀ tí òṣìṣẹ́ Customs tí sèsì yín ìbọn pa ènìyàn ṣẹlẹ̀
Bidiyon mutumin da jami’in ya harbe fiye da ‘cin hancin N5k’ daga 2019 ne, inji kwastam 
MISINFO ALERT: Video of man shot by operative over ‘N5k bribe’ is from 2019, says customs
How to protect yourself from misinformation, disinformation in the AI age
FACT CHECK: Did Ibrahim Traore cancel Burna Boy’s proposed Burkina Faso concert?
CableCheck wins IFCN global fact check fund
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Atiku gwàrà Arise TV ọ̀tụ́tụ́ íhe — mànà òlé bụ̀ ézíókwu?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published August 7, 2022 8 Min Read
Share

Na ajụjụ ọnụ nso nso Arise TV mèrè, Atiku Abubakar, onye na-eso onye isi na mbụ ma bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP), kwuru ọtụtụ ihe gbasara atụmatụ ọ nwere màkà Naijiria.

TheCable nyochara ọtụtụ okwu a. Née ihe anyị chọpụtara.

OKWU NKE MBỤ: Abraham Lincoln, ótù ndị isi America nke ama ama, zoro ọchịchị ugboro ise ma ọ bụ isii tupu ò nwe mmeri.

IKPE: Okwu adịgboroja

Abraham Lincoln á zoro ọchịchị ugboro ise ma ọ bụ isii dị ka Atiku kwuru. Lincoln nwere mmeri oge izizi ọ zoro ịbụ onye ịsị na afo 1860. A hoputara ya ọzọ ịbụ onye ịsị na afọ 1864.

Ọ bụ onye isi iri na isii na United States. John Wilkes Booth gbùrù ya na Ford’s Theatre, Washington DC. Ọ nwuru ụbọchị iri na ise n’onwaEprel na afọ 1865.


OKWU NKE ABỤỌ: Onweghị ìwú ji ndị ọlụ oyibo ịzụ ahịa na Naijiria.

IKPE: Iwu Naijiria enyeghị ndị na-arụ ọrụ oyibo ikike ịzụ ahịa.

Ngalaba isii nke Code of Conduct Bureau (CCB) na Tribunal Act nyèrè naanị ohere ka ndị ọrụ oyibo kọ̀ọ́ úgbo, nke oriri ma ọ bụ nke orire.

Ótù ndokwa ahụ dịkwa na ngalaba abụọ nke usoro nhazi nke ise dị na iwu 1999.

Timi Olagunju, onye na-ahụ maka iwu na onye nyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị, gwara TheCable na ngalaba isii nke ụlọ ọrụ ụkpụrụ omume na usoro ikpe (CCB & Tribunal Act) dòrò ányá.

O kwùrù sị: “CCB bụ omume nke nzuko omeiwu nke iwu kwadoro. Ọ bụ iwu. Ọ bụghị ihe enyemaka ma ọ bụ ụkpụrụ iwu. Ngalaba isii kwùrù na ndị ọrụ oyibo agaghị etinye aka na ịzụ ahịa bụ nke ya ma ọbụ ọrụ nke ya, ewezuga ọrụ ugbo, ikwado ugbo.

“Ọ dị ḿkpà ịma na iwu nwere nnwere onwe. Onye ọrụ oyibo nwere ike ịzụ ahịa nke ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ọ na-arụ bụ ọrụ ọ̀kàrà ógè.”

Olagunju sị na, kamgbe ọ na-ọru ọrụ ọka iwu, ọ hụbeghị onye ọrụ oyibo a mara ikpe maka na ọ na-azụ ahịa makwa na arụ ọrụ oyibo.


OKWU NKE ATỌ: Egypt nwèrè mmadụ nde iri asatọ. Ndị uwe ojii ha karịrị nde abụọ.

IKPE: Okwu adịgboroja

Onweghị ihe akaebe ịkwado okwu a na Egypt nwere uwe ojii nde abụọ.

Dị ka nnyocha Home Office nke afọ 2015 uwe ojii Egypt si kwuo, ndị uwe ojii obodo Egypt nwere ihe dị ka mmadụ puku atọ na ịrị ise na-ahụ na ndị mmadụ debere iwu na-eme ihe n’usoro ọha na obodo niile.

Ngụkọta ike ndị agha Egypt n’ọnwa Septemba na afọ 2014 bụ narị anọ na ịrị ise na asatọ na narị ise. Ndị army ruru narị puku anọ na iri anọ. Ndị air force ruru otu narị puku. Ndị navy rụrụ pụkụ ịrị na asatọ na ise. Ngụkọta ndị ha debere ruru narị anọ na iri asaa na itoolu.

Ngụkọta ndị agha niile Egypt nwere erughị nde abụọ dị ka Atiku si kwuo.

Dị ka akụkọ Worldatlas toro na afọ 2017, nke edeputara obodo iri atọ dị n’elu ka nwé ndị uwe ojii, China bu ụzọ. Ndị uwe ojii ha nwere ruru otu ihe nde isii. Ndị n’eso ya bụ India na United States. Ndị uwe ojii India ruru otu nde na narị ise na iri asatọ na ise, narị atọ na ịrị ise na atọ. Ndị uwe ojii United States ruru narị itoolu na iri na atọ na otu narị na iri isii na otu.

Onweghị obodo so na ndị isi iri atọ nwere ndi uwe ojii ruru nde abụọ. Egypt esoghị na ihe ndepụta nke worldatlas rubere isi.

Ka ọ dị ugbu a, dị ka United Nations Population Funds (UNFPA) si dee, ọnụ ọgụgụ mmadụ na Egypt ugbu a bu otu narị na isii nde abụọ ọ bụghị nde iri asatọ.


OKWU NKE ANỌ: Ngalaba mmanụ nọchiri anya pasenti ịrị abụọ na GDP Naijiria.

IKPE: Nke a bụ okwu adịgboroja

Data statista zikoro na, n’etiti nkeji ịrị na anọ nke afọ 2018 na nkeji iri na ise nke dị na afọ 2021, onyinye ngalaba mmanụ na-eweta na GDP obodo elughị pasenti ịrị.

TheCable chọrọ data nke National Bureau of Statistics (NBS) weputara, were chọpụta na ngalaba mmanụ kacha elu n’etiti 2019 and 2021 bụ pasenti itoolu na iri asaa na asaa na nkeji nke atọ na afọ 2021.

N’afọ 2021, ngalaba mmanụ mere ka GDP gbadaa ruo ákàrà asaa pasenti ịrị abụọ na anọ. Ọ nọbu na pasenti asatọ iri na isii na afọ 2020.

Site na data dị, TheCable chọrọ na afọ atọ gara aga. Ngalaba mmanụ ewetala onyinye pere mpe ugboro ugboro karịa pasenti ịrị na GDP Naijiria.


Reuben Abati and Tundun Abiola.

OKWU NKE ISE: Enwere uwe nchekwa iri na asaa na obodo a. Agbụrụ dị iche iche na-achị ha niile.

IKPE: Okwu a abụchaghị eziokwu

Nlele nke TheCable mere zikoro na ọtụtụ ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa bụ ndi ugwu Hausa.

Otú ọ dị, mkpụrụ ụlọ ọrụ nchekwa nwere ole na ole south na-edu ya. Ha gụnyere defence intelligence agency, onye isi ya bụ Samuel Adebayo, onye sị Ekiti steeti (south west); nakwa Lucy Irabor, onye ịsị defence staff, nke sị Delta steeti (south-south).

Oladayo Amao, onye isi ndị ọrụ ikuku ugbu a, si na Osun steeti (south-west).

S/N Security agency Head of agency State of origin Geo-political zone
1. State Security Services (SSS) Mr. Yusuf Magaji Bichi Kano state North-west
2. National Intelligence Agency (NIA) Abubakar Ahmed Rufai Katsina state North-west
3. Defense Intelligence Agency (DIA) Samuel Adebayo Ekiti state South-west
4. Chief of Defence Staff General Lucky Irabor Delta state South-south
5. Nigerian Army Faruk Yahaya
(Chief of Army Staff)
Sokoto state North-west
6. Nigerian Navy Awwal Zubairu Gambo (Chief of Naval Staff) Kano state North-west
7. Nigerian Air Force Oladayo Isiaka Amao (Chief of Air Staff) Osun state South-west
8. Nigeria Police Force (NPF) Usman Alkali Baba (Inspector General of Police) Yobe State North-East
9. Nigeria Customs Service Col. Hameed Ibrahim Ali (Rtd.) Bauchi state North-east
10. Nigerian Correctional Service Haliru Nababa (Controller-General) Sokoto state North-west
11. Nigerian Security and Civil Defense Corps (NSCDC) Ahmed Abubakar Audi (Commandant General) Nasarawa state North-central
12. Nigeria Immigration Service CGI Isah Jere Idris (Comptroller General of Nigerian Immigration.) Kaduna state North-west
13. National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa (Rtd.) Adamawa state North-east
14. Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) Abdulrasheed Bawa Kebbi state North-west
15. Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) Professor Bolaji Owasanoye SAN Ondo state South-west
16. National Security Adviser Babagana Monguno Borno state North-east

 

TAGGED: 2023 elections, ARISE TV, atiku abubakar, PDP

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora August 7, 2022 August 7, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Customs: Íhé ńgósị́ kọ́wárá nà á gbàgbùrù nwókè màkà égó áká azụ N5k mèrè n’áfọ̀ 2019

Ngalaba Nigeria Customs Service (NCS) ebiputala ozi gbasara ihe ngosị ebe onye ọrụ ha bara…

June 7, 2025

Customs say video wey officer shoot man sake of ‘N5k bribe’ na since 2019

Di Nigeria Customs Service (NCS) don react to one viral video wey show as dia…

June 7, 2025

Ọdún 2019 ni ìṣẹ̀lẹ̀ tí òṣìṣẹ́ Customs tí sèsì yín ìbọn pa ènìyàn ṣẹlẹ̀

Àwọn òṣìṣẹ́ aṣọbode (the Nigerian Customs Service-NCS) ti sọ̀rọ̀ nípa fídíò kan tí àwọn ènìyàn…

June 7, 2025

Bidiyon mutumin da jami’in ya harbe fiye da ‘cin hancin N5k’ daga 2019 ne, inji kwastam 

Hukumar Kwastam ta Najeriya ta mayar da martani kan wani faifan bidiyo da ke nuna…

June 7, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Customs: Íhé ńgósị́ kọ́wárá nà á gbàgbùrù nwókè màkà égó áká azụ N5k mèrè n’áfọ̀ 2019

Ngalaba Nigeria Customs Service (NCS) ebiputala ozi gbasara ihe ngosị ebe onye ọrụ ha bara na nsogbu maka ịgbagbu ótù…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 7, 2025

Customs say video wey officer shoot man sake of ‘N5k bribe’ na since 2019

Di Nigeria Customs Service (NCS) don react to one viral video wey show as dia officers enta kasala ontop shooting…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 7, 2025

Ọdún 2019 ni ìṣẹ̀lẹ̀ tí òṣìṣẹ́ Customs tí sèsì yín ìbọn pa ènìyàn ṣẹlẹ̀

Àwọn òṣìṣẹ́ aṣọbode (the Nigerian Customs Service-NCS) ti sọ̀rọ̀ nípa fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti pín kiri tí ó…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 7, 2025

Bidiyon mutumin da jami’in ya harbe fiye da ‘cin hancin N5k’ daga 2019 ne, inji kwastam 

Hukumar Kwastam ta Najeriya ta mayar da martani kan wani faifan bidiyo da ke nuna jami’anta na da hannu a…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?