TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Alex Otti ò bìrì égo n’ótù áfọ̀ kárị́á gọ́vanọ̀ ńdị́ ọzọ chị́bụ́rụ́ Abia?
Share
Latest News
Did Tinubu attend same school with Alexander Zingman? Here is what we know
FACT CHECK: Did Nigeria deploy peace support mission to Israel?
FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?
FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?
FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015
Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé
Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Alex Otti ò bìrì égo n’ótù áfọ̀ kárị́á gọ́vanọ̀ ńdị́ ọzọ chị́bụ́rụ́ Abia?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 5, 2024 8 Min Read
Share

Uche Rochas, onye azụmahịa na Nigeria, kwuru na Alex Otti, gọvanọ Abia steeti, biri ego n’otu áfọ̀ karịa ihe gọvanọ ndị chịburu steeti ahụ biri.

N’asafe X ya n’ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa May, Rochas kwuru na Otti mefuru “nde naira itoolu (₦9 million) maka ego ńni ótù ụbọchị, nke ó jì ego ụ̀tụ́ ndị Abia kwụ”.

“O bikariala Orji Uzor Kalu, Theo Orji, Okezie Ikpeazu n’ihe n’erubeghị otu afọ yá n’ọchịchị.

“Ọ na-arụ ụzọ n’erughi ógó ụzọ kwesịrị ịrụ, mana ndị nkwado ya bụ Obidient movement, ahụghị ihe ọ bụla dị njọ na ya.”

Ozi a e nwetala nkiri karịrị puku narị atọ (300,000 views), nkwado narị asaa na iri isii n’otu (761 likes), na nkesa otu narị na iri asaato n’otu (181 reposts) na X.

KÈDỤ́ ŃDỊ́ Á KPỌ̀RỌ̀ ÁHÀ N’ÓKWỤ́ À?

Kalu bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụ kwa onye azụmahịa, onye mechara bụrụ gọvanọ Abia site n’ubochi iri abụọ na itoolu nke ọnwa May n’afo 1999 ruo ụbọchị iri abụọ n’itolu nke ọnwa May afọ 2007.

Ọ bụ senatọ na anọchite anya ndị Abia north senatorial district, ebe Orji bụ gọvanọ site n’afọ 2007 ruo 2015 ma bụrụkwa senatọ na-anọchịta anya ndị Abia central senatorial district bido n’afọ 2015 ruo 2023.

Ikpeazụ bụ gọvanọ bido n’ọnwa May 2015 rụọ May 2023.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ GBÀSÁRÁ ÉGÓ ŃNÍ NÀ STÉÉTỊ̀ À

Rochas kwụrụ na Otti mefurụ nde nari itolu (₦9 million) kwa ụbọchị na nnị́, mana ihe a kwadoro maka nnị́ na ụlọ gọọmenti house bu nde narị naira ise na iri itolu n’ise na ụma otu narị n’ịrị abụọ (N595.12 million), nke wetara ọnụ ego nnị́ nke afọ ahụ iji bụrụ otu nde naira na ụma narị isii n’iri atọ (₦1.63 million).

Ị́NYÒCHÀ ÓKWÚ GBÁSÁRÁ Ị́ BỊ́RỊ́ ÉGÓ

Ịnyocha okwu Rochas, TheCable nwara ịgbakọ mgbanwe n’ụgwọ steeti ahụ ji n’afọ mbụ Orji na Ikpeazụ nye nke Otti, mana o nweghị ozi gbasara ya pụtara ìhè iji mee nya bụ ntụnye.

Ụgwọ steeti a ji, nke ụlọrụ n’edeko ụgwọ Niajira bụ Debt Management Office (DMO) bipụtara bidoro n’afọ 2011, nke n’agbakwunyeghi oge ọchịchị ndị gọvanọ bidoro n’afọ 1999 na 2010.

Enweghị ozi gbasara ụgwọ ọchịchị ugboro abụọ nke Kalu dịka gọvanọ pụtara ihe.

Mana ọnụogugu pụtara ìhè kwuru na ụgwọ steeti ahụ nọ na ijeri otu narị naira na iri anọ n’abuo, nde narị anọ na iri asaa na puku narị asaa na iri n’asaa na narị asaa n’abuo n’uma iri anọ n’isii (N142,470,717,702.46) n’ọnwa June nke afọ 2023, otu afọ tupu Otti abanye n’ọchịchị.

Ozi a gosiri na ụgwọ steeti ahụ jiri ijeri naira atọ n’uma nde iri asaato n’ato (N3.83 billion) maọbụ pacenti abụọ n’uma narị isii n’itolu (2.69 percent) gbadaa, nke wetara ọnụ ọgụgụ ụgwọ steeti ahụ ka ọ buru otu ijeri narị naira na ịrị atọ n’asaato na nde narị isii n’iri atọ n’asaato na puku asaa na narị anọ n’iri atọ n’abuo n’uma iri atọ n’abuo (₦138,638,007,432.32) n’ọnwa December nke afọ 2023, ọnwa isii mbụ nke ọchịchị Otti.

N’otu aka ahụ, ụgwọ ha ji obodo ọzọ bụ external debt jiri nde dollar atọ n’uma pụku abụọ na narị asaa ($3.27) gbadaa rụọ nde dollar iri asaato n’itolu na pụku iri ise n’ato na narị itolu n’iri atọ n’itolu n’uma iri atọ ($89,053,939.30) n’okpuru ọchịchị Otti n’ọnwa December 2023, site na nde dollar iri itolu n’abuo na puku narị atọ n’iri abụọ n’asaato na narị isii n’iri asaato n’ato n’uma iri asaato n’ato ($92,328,683.83) ọ dibu n’ọnwa June 2023.

N’ọchịchị Ikpeazụ, ụgwọ steeti ahụ jiri ijeri naira asaato n’uma nde iri anọ n’itolu N8.49 billion (8.92 percent) ria elu, site na ijeri naira iri itoolu n’ise na nde narị abụọ n’iri n’abuo na puku narị isii n’iri asaato n’asaa na narị asaa na iri abụọ n’isii n’uma iri asaato n’asaa (N95,212,687,526.87) ọ dịbu n’ọnwa December 2021, ruo otu ijeri narị naira n’atọ, nde narị asaa n’iri na narị iri n’otu na iri itolu n’uma iri isii n’atọ (N103,710,011,090.63) n’ọnwa December 2022.

K’osiladị ụgwọ mba ọzọ steeti ahụ jị̀, jiri nde dollar isii na narị asaa n’iri ise n’ato na otu narị n’ịrị ise n’uma iri atọ n’otu ($6,853,150.31) gbadaa site na otu nde dollar n’otu, otu puku narị na iri atọ n’abuo na narị itoolu n’iri ise n’anọ n’uma iri atọ n’asaa ($101,132,954.37) ruo puku dollar iri itolu n’anọ na narị puku abụọ n’iri asaa n’itụ na narị asaato n’anọ n’uma isii ($94,279,804.06) n’otu oge ahụ.

DMO kwuru na ụgwọ steeti ahụ ji onwe ya nọ ijeri naira atọ n’otu, nde narị asaa n’iri abụọ n’atọ na puku narị asaa n’iri abụọ n’atọ na narị asaa n’itolu na iri itolu n’itolu (N31,736,723,709.99) n’ọchịchị Orji n’ọnwa December 2013, gbakwunyere ijeri naira iri abụọ n’ise, nde narị abụọ na iri abụọ n’isii na puku iri asaa na narị isii n’iri asaato n’ise n’uma iri (N25,126,070,685.10) ọ dị n’ọnwa December 2014 — nke na-egosi mgbada ijeri naira isii n’uma nde narị isii n’otu narị (N6.61 billion) maọbụ percentị iri abụọ n’isii n’uma ato (26.3percent),n’ọchịchị ya.

K’osiladi n’ọchịchị Orji, ụgwọ steeti a ji mba ọzọ jiri puku narị dollar ato n’iri asaato n’asaato na narị isii n’iri itoolu n’otu n’uma iri anọ n’otu ($388,691.41) rie elu, site na nde dollar iri atọ n’anọ n’otu narị na iri asaato n’otu narị na iri na abụọ n’uma iri atọ n’atọ ($34,180,112.33) ọ dị n’ọnwa December 2013 rụọ nde dollar iri atọ n’atọ na puku narị asaa n’iri itoolu n’otu na narị anọ n’iri abụọ n’uma iri itoolu n’abuo ($33,791,420.92) n’ọnwa December 2014.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Dịka ozi a hụtara na DMO, ọ pụtara ihe n’ụgwọ steeti ahụ a gbatuola kámgbè Otti bara n’ọchịchị. Nya mere, okwu na Otti biriri ego karịrị ihe gọvanọ ndị chiburu steeti ahụ biriri n’ihe n’erughi otu afọ, bụ asị.

Ọzọkwa, okwu na Otti mefuru nde naira itoolu (₦9 million) na nnị́ bụ asị, dịka ihe bụjetị afọ 2024 nke steeti ahụ kwuru.

TAGGED: Abia state, Alex Otti, DMO, Igbo Factcheck, Okezie Ikpeazu, Orji Kalu, Theodore Orji, Uche Rochas

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 21, 2024 July 5, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Did Tinubu attend same school with Alexander Zingman? Here is what we know

During the launch of the renewed hope mechanisation programme in Abuja on Monday, President Bola…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did Nigeria deploy peace support mission to Israel?

A Facebook video purports that Nigeria deployed troops for a joint peace support mission in…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?

A viral X post claims that Nigeria’s new national anthem was not recited during the…

June 13, 2025

FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?

Reports of a military coup in Cameroon ousting President Paul Biya have gone viral on…

June 13, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert Francis Prevost, Pope Leo XIV…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu

One Facebook user claim sey Pope Leo XVI and oda bishops join mouth beg President Bola Tinubu to release Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba

Wani mai amfani da Facebook ya yi ikirarin cewa Paparoma Leo na 16 da wasu limaman coci sun roki shugaban…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?