TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Akpabio tụ̀rụ̀ àsị́, ọ̀ bụ́ghị ńdị́ ọ́rụ níile gà-ànátá N70,000 dị́kà ụ́gwọ́ ọ́rụ dị́kárị́chárá ńta
Share
Latest News
Seven ways to detect an AI-generated video
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Akpabio tụ̀rụ̀ àsị́, ọ̀ bụ́ghị ńdị́ ọ́rụ níile gà-ànátá N70,000 dị́kà ụ́gwọ́ ọ́rụ dị́kárị́chárá ńta

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 6, 2024 6 Min Read
Share

N’ụbọchị Tuesday, ụlọ omeiwu senate na house of representatives kpebiri maka ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta á gà-àkwụ́ ndị ọrụ na Nigeria.

Atụmatụ ịwụ a gafere ngụpụta mbụ, abụo, na atọ n’otu awa — n’ụlọ omeiwu abụọ a.

Ndị omeiwu a, gbanwere ihe abụọ na nya bụ iwu National Minimum Wage Act nke afọ 2009, nke bụ iweli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ dịkarịrịchara nta site na naira puku iri atọ ruo naira puku iri asaa (₦30,000 to ₦70,000), nya na ibeleta oge nwogharị nya bụ ịwụ site n’afọ ise ruo afọ atọ.

Godswill Akpabio, onye isi oche ụlọ omeịwu senate, kwuru sị na o nweghị onye Nigeria ọbụla ga-akwụzị ndị ọrụ ha ihe n’erughị puku naira iri asaa (₦70,000) dịka ụgwọ ọnwa ha.

“Iwu a kwuru na ọ bụrụ na ị bụ onye n’ákwá-ákwà, ị kwesịghị ịkwụ onye ọrụ gị ihe na-erughị puku naira iri asaa (₦70,000). Ị bụrụ onye nne mụrụ nwa ọhụrụ, ma chọọ ịkpọta onye ga-ekuru gị nwa, ị gaghị akwụ onye ahụ ihe n’erughị puku naira iri asaa (₦70,000),” Akpabio kwuru.

“Ọ bụghị ụgwọ ọrụ ndị ógó elu. Ọ́ bụ̀ nke metụtara onye ọbụla. Ị kpọta onye na-anyara gị ụgbọala maọbụ onye nche, ị gaghị akwụ ha ihe na-erughị puku naira iri asaa (₦70,000). Nya mere, obi dị m ụtọ nke ukwu na nke a bụzi iwu. A ná m atụ anya maka ndị na-ewe ndị ọrụ ịtinye iwu a n’ọrụ.

“A na m ekele òtù Nigeria Labour Congress (NLC), ndị Nigeria, ụlọ omeiwu senate, na kwa national assembly maka ime ka iwu a pụta ihe n’oge n’adịghị anya, nke weturu oge iwogharị ego ole á gà-àkwụ́ ndị oru site n’afọ asaa ruo afọ atọ.”

Okwu Akpabio anatala ọtụtụ ntụnye ọnụ, ọ kachasị na X, ebe ọtụtụ na-àjụ́ ajụjụ gbasara okwu ya.

“Nke a bụ egwuregwu kachasị ibe ya. Ị nwere ike chọọ ka i lebanye anya n’ụfọdụ iwu ụgwọ,” Tohluh Briggs kwuru n’okpuru ozi a.

“Ọ bụ eziokwu? Kedụ ihe gbanwere?” Philemon Kuza jụ̀rụ̀.

VIDEO: Nigerians can no longer pay domestic workers below N70k monthly, says Akpabio pic.twitter.com/hyZPutu0EY

— TheCable (@thecableng) July 24, 2024

GỊ́NỊ BỤ̀ Ụ́GWỌ́ Ọ́RỤ́ DỊ́KÁRỊ́CHÁRÁ ŃTA?

Nke a bụ ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta nke ụlọrụ nwere ike ịkwụ ndị ọrụ ha, site na iwu. Ọ bụ nke iwu kwadoro iji hụ na ndị ọrụ nwetara ụgwọ dị nma. Iwu a bụ iji gbochi maka mmegbu ọbụla.

Ụgwọ ọnwa dịkarịrịchara nta na Nigeria bụbu puku naira iri atọ (N30,000). A na-agbanwe nya bụ ụgwọ n’afọ ise ọbụla iji gbakọnye ọrịrị ọnụ ahịa na Naijiria. Mgbanwe ikpeazụ e nwere bụ n’ọchịchị Muhammadu Buhari n’afọ 2019.

N’ụbọchị atọ nke ọnwa June, akụ n’ụba Naijiria bịara kwụrụ ótù ebe n’ihi ndị mmadụ kwụsịrị ọrụ, ma jụ nya bụ ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta.

Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC), òtù abụọ na-anọchịte anya ndị ọrụ, kwubiri ọnụ ego puku narị naira anọ n’iri itoolu n’anọ (N494,000) dịka ụgwọ ọrụ dịkarịrịchara nta chara ha anya. Ha sị na ọnụ ego a ga-gbanye ọnọdụ ihe isi ike na ihe ịda óké ọnụ na Naijiria.

Ha mechara wetuo ọnụ ego ahụ ruo puku narị naira abụọ na iri ise (N250,00).

N’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa Julaị, onyeisiala Bola Tinubu zutere ndị ndu otu NLC maka nya bụ okwu.

Ka ọtụtụ mkpakọrịta ụ́kà gbàsárá nya bụ okwu gachara, n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julaị, otu a kwekọrọ n’ọnụ ego puku naira iri asaa (N70,000), nke onye isiala tụtara n’alọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ AKPABIO

Inyocha okwu Akpabio, TheCable lebara anya na iwu ụgwọ ọrụ dịkarịrịchara nta, bụ National Minimum Wage Act nke afọ 2019, iji mata onye iwu mabidoro ịkwụ nya bụ ọnụ ego na onye n’ekwesịghị.

Ngalaba atọ na nguputa nke mbụ iwu ahụ kwuru na ndị na-ewe ndị ọrụ ga-akwụ ndị ọrụ ha ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta.

Dịka iwu ahụ kwuru, ịbanye na nkwekọrịta ọbụla ịkwụ ọnụ ego dị nta karịa nke a bụ ihe iwu anabataghị.

Mana e nwere ụfọdụ mgbe ebe ụlọ ọrụ nwere ike ịkwụ ọnụ ego dị nta karịa nke iwu kwenyere na ya.

Akụkụ anọ nke iwu a kwuru na ịkwụ ọnụ ego dịkarịrịchara nta emetutaghị ụlọrụ nwere ndị ọrụ n’erughị iri abụọ n’ise (25).

Dịka iwu a kwụrụ, ụlọrụ nwere ndị ọrụ a gụpụtara n’okpuru okwu a bụ ndị iwu amadoghị ịkwụ ọnụ ego ahụ.

a) Ndị ọrụ na-arụ ọkara oge (part time)
b) Ndị na-anara ụgwọ dịka ọrụ ha rụrụ (commission-based).
c) Ụlọrụ nwere ndị ọrụ n’erughị iri abụọ n’ise.
d) Ndị ọrụ na-arụ n’ụfọdụ oge dịka oge ọrụ úgbo.

d) Nya na ndị ọrụ na-arụ n’ụgbọ mmiri maọbụ ụgbọ elu, ga-akwụ ndị ọrụ ha ụgwọ dika iwu ụlọrụ ha kwuru.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Dịka iwu Minimum Wage Act nke afọ 2019 kwuru, okwu Akpabio na onye ọrụ ọbụla ga-erita ihe na-adịghị nta karịa puku naira iri asaa bụ asị.

Iwu a madoro naanị ụlọrụ nwere ndị ọrụ karịrị iri abụọ n’ise ịkwụ nya bụ ọnụ ego.

TAGGED: akpabio, fact check in Igbo, minimum wage, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 6, 2024 August 6, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Seven ways to detect an AI-generated video

A video announcing the launch of a free nationwide diabetes treatment recently went viral across Nigerian…

August 13, 2025

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025

DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment

The ministry of health and social welfare has dismissed a viral claim alleging the launch…

August 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?