TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Akpabio tụ̀rụ̀ àsị́, ọ̀ bụ́ghị ńdị́ ọ́rụ níile gà-ànátá N70,000 dị́kà ụ́gwọ́ ọ́rụ dị́kárị́chárá ńta
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Akpabio tụ̀rụ̀ àsị́, ọ̀ bụ́ghị ńdị́ ọ́rụ níile gà-ànátá N70,000 dị́kà ụ́gwọ́ ọ́rụ dị́kárị́chárá ńta

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 6, 2024 6 Min Read
Share

N’ụbọchị Tuesday, ụlọ omeiwu senate na house of representatives kpebiri maka ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta á gà-àkwụ́ ndị ọrụ na Nigeria.

Atụmatụ ịwụ a gafere ngụpụta mbụ, abụo, na atọ n’otu awa — n’ụlọ omeiwu abụọ a.

Ndị omeiwu a, gbanwere ihe abụọ na nya bụ iwu National Minimum Wage Act nke afọ 2009, nke bụ iweli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ dịkarịrịchara nta site na naira puku iri atọ ruo naira puku iri asaa (₦30,000 to ₦70,000), nya na ibeleta oge nwogharị nya bụ ịwụ site n’afọ ise ruo afọ atọ.

Godswill Akpabio, onye isi oche ụlọ omeịwu senate, kwuru sị na o nweghị onye Nigeria ọbụla ga-akwụzị ndị ọrụ ha ihe n’erughị puku naira iri asaa (₦70,000) dịka ụgwọ ọnwa ha.

“Iwu a kwuru na ọ bụrụ na ị bụ onye n’ákwá-ákwà, ị kwesịghị ịkwụ onye ọrụ gị ihe na-erughị puku naira iri asaa (₦70,000). Ị bụrụ onye nne mụrụ nwa ọhụrụ, ma chọọ ịkpọta onye ga-ekuru gị nwa, ị gaghị akwụ onye ahụ ihe n’erughị puku naira iri asaa (₦70,000),” Akpabio kwuru.

“Ọ bụghị ụgwọ ọrụ ndị ógó elu. Ọ́ bụ̀ nke metụtara onye ọbụla. Ị kpọta onye na-anyara gị ụgbọala maọbụ onye nche, ị gaghị akwụ ha ihe na-erughị puku naira iri asaa (₦70,000). Nya mere, obi dị m ụtọ nke ukwu na nke a bụzi iwu. A ná m atụ anya maka ndị na-ewe ndị ọrụ ịtinye iwu a n’ọrụ.

“A na m ekele òtù Nigeria Labour Congress (NLC), ndị Nigeria, ụlọ omeiwu senate, na kwa national assembly maka ime ka iwu a pụta ihe n’oge n’adịghị anya, nke weturu oge iwogharị ego ole á gà-àkwụ́ ndị oru site n’afọ asaa ruo afọ atọ.”

Okwu Akpabio anatala ọtụtụ ntụnye ọnụ, ọ kachasị na X, ebe ọtụtụ na-àjụ́ ajụjụ gbasara okwu ya.

“Nke a bụ egwuregwu kachasị ibe ya. Ị nwere ike chọọ ka i lebanye anya n’ụfọdụ iwu ụgwọ,” Tohluh Briggs kwuru n’okpuru ozi a.

“Ọ bụ eziokwu? Kedụ ihe gbanwere?” Philemon Kuza jụ̀rụ̀.

VIDEO: Nigerians can no longer pay domestic workers below N70k monthly, says Akpabio pic.twitter.com/hyZPutu0EY

— TheCable (@thecableng) July 24, 2024

GỊ́NỊ BỤ̀ Ụ́GWỌ́ Ọ́RỤ́ DỊ́KÁRỊ́CHÁRÁ ŃTA?

Nke a bụ ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta nke ụlọrụ nwere ike ịkwụ ndị ọrụ ha, site na iwu. Ọ bụ nke iwu kwadoro iji hụ na ndị ọrụ nwetara ụgwọ dị nma. Iwu a bụ iji gbochi maka mmegbu ọbụla.

Ụgwọ ọnwa dịkarịrịchara nta na Nigeria bụbu puku naira iri atọ (N30,000). A na-agbanwe nya bụ ụgwọ n’afọ ise ọbụla iji gbakọnye ọrịrị ọnụ ahịa na Naijiria. Mgbanwe ikpeazụ e nwere bụ n’ọchịchị Muhammadu Buhari n’afọ 2019.

N’ụbọchị atọ nke ọnwa June, akụ n’ụba Naijiria bịara kwụrụ ótù ebe n’ihi ndị mmadụ kwụsịrị ọrụ, ma jụ nya bụ ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta.

Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC), òtù abụọ na-anọchịte anya ndị ọrụ, kwubiri ọnụ ego puku narị naira anọ n’iri itoolu n’anọ (N494,000) dịka ụgwọ ọrụ dịkarịrịchara nta chara ha anya. Ha sị na ọnụ ego a ga-gbanye ọnọdụ ihe isi ike na ihe ịda óké ọnụ na Naijiria.

Ha mechara wetuo ọnụ ego ahụ ruo puku narị naira abụọ na iri ise (N250,00).

N’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa Julaị, onyeisiala Bola Tinubu zutere ndị ndu otu NLC maka nya bụ okwu.

Ka ọtụtụ mkpakọrịta ụ́kà gbàsárá nya bụ okwu gachara, n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julaị, otu a kwekọrọ n’ọnụ ego puku naira iri asaa (N70,000), nke onye isiala tụtara n’alọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ AKPABIO

Inyocha okwu Akpabio, TheCable lebara anya na iwu ụgwọ ọrụ dịkarịrịchara nta, bụ National Minimum Wage Act nke afọ 2019, iji mata onye iwu mabidoro ịkwụ nya bụ ọnụ ego na onye n’ekwesịghị.

Ngalaba atọ na nguputa nke mbụ iwu ahụ kwuru na ndị na-ewe ndị ọrụ ga-akwụ ndị ọrụ ha ọnụ ego ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta.

Dịka iwu ahụ kwuru, ịbanye na nkwekọrịta ọbụla ịkwụ ọnụ ego dị nta karịa nke a bụ ihe iwu anabataghị.

Mana e nwere ụfọdụ mgbe ebe ụlọ ọrụ nwere ike ịkwụ ọnụ ego dị nta karịa nke iwu kwenyere na ya.

Akụkụ anọ nke iwu a kwuru na ịkwụ ọnụ ego dịkarịrịchara nta emetutaghị ụlọrụ nwere ndị ọrụ n’erughị iri abụọ n’ise (25).

Dịka iwu a kwụrụ, ụlọrụ nwere ndị ọrụ a gụpụtara n’okpuru okwu a bụ ndị iwu amadoghị ịkwụ ọnụ ego ahụ.

a) Ndị ọrụ na-arụ ọkara oge (part time)
b) Ndị na-anara ụgwọ dịka ọrụ ha rụrụ (commission-based).
c) Ụlọrụ nwere ndị ọrụ n’erughị iri abụọ n’ise.
d) Ndị ọrụ na-arụ n’ụfọdụ oge dịka oge ọrụ úgbo.

d) Nya na ndị ọrụ na-arụ n’ụgbọ mmiri maọbụ ụgbọ elu, ga-akwụ ndị ọrụ ha ụgwọ dika iwu ụlọrụ ha kwuru.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Dịka iwu Minimum Wage Act nke afọ 2019 kwuru, okwu Akpabio na onye ọrụ ọbụla ga-erita ihe na-adịghị nta karịa puku naira iri asaa bụ asị.

Iwu a madoro naanị ụlọrụ nwere ndị ọrụ karịrị iri abụọ n’ise ịkwụ nya bụ ọnụ ego.

TAGGED: akpabio, fact check in Igbo, minimum wage, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 6, 2024 August 6, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?