Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n’obodo Eruku nke Kwara steeti n’ụbọchị iri n’asaato nke ọnwa Novemba, ihe ngosị ebe ọtụtụ ndị okpuperechi ụka bụ egbe n’ụzọ iji chekwaa onwe ha pụtara ìhè na soshal midia.
Nwakpo ndị a gara ụka bụ nke a hutara ka ọna-eme dị ka ha na-ekpere chị ya.
Mmadụ atọ bụ ndị e gburu, ebe madu iri atọ n’asaato ka ha tọrọla.
Nwakpo ahụ bụ nke mere dịka a na-akọ maka ogbugbu ndị ụka na Naijiria ya na mmaja onyeisi ala mba US ịchịbata ndị agha militri obodo ya na Naijiria.
E nweela nwakpo ọtụtụ ụlọ ụka na Naijiria, nke kpalitara okwu gbasara mkpa ọdị onye ọbụla ịchekwa onwe ha.
Dịka nwakpo ndị ahu na-eme, ọtụtụ ndị na soshal midia bidoro bipụtawa ihe ngosi ebe ndị okpuperechi ụka bụgasi egbe.
Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ ÉWÉPỤ́TÁRÁ Ń’Ị́HÉ ŃKỊ́RỊ́ Ị́TỌ́CHỊ̀ BỤ̀ NKÉ ÉBỊ́PỤ́TÁRÁ KÀ Ó MÉRÉ-ÉMÉ
N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Dezemba, Oriental Times, asafe éjị́ ebipụta ozi, bipụtara ihe ngosi ebe nwoke bụ egbe AK-47 n’akụkụ otu nwanyị.

E jiri isi okwu kwuru : onye ụkọ Chukwu Naijiria bụ egbe akụzir okwu Chukwu n’okporo ụzọ.
Ozi ahụ enwetala nkwenye karịrị narị ise (500 likes), ntunye ọnụ narị asatọ n’iri asatọ (880 comments), na nkesa narị abụọ n’iri ato (230 shares).
CableCheck jiri ị́gwè nyocha Google Lens were nyocha ya bụ ihe ngosi ma chọpụta na ọbụ ihe e sechara n’ime ihe nkiri ụkọchi nke onye na-eme ihe ọchị bụ Pastor Destiny bipụtara.
Ihe ngosị ahụ bụ nke Pastor Destiny Bipụtara n’asafe Facebook ya a na-akpọ REAL DON DADDY n’ụbọchị iri abụọ n’anọ nke ọnwa Novemba nke gosiri ebe ya na otu nwanyị bụ egbe na akwụkwọ nso were na-akuzi okwu Chukwu n’okporo ụzọ.
Pastor Destiny bụ̀ ónyé na ebipụta ihe ọchị gbasara ekpere na-ịzịsa ozị Chukwu.
Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ É JỊ́RỊ́ AI NWÓGHÁRIÁ GÓSỊ́RỊ́ ŃDỊ́ Ụ́KÁ BỤ́ EGBÉ
Ihe ngosi ọzọ wuru-ewu bụ nke gosiri ndị ụka bụ egbe n’ime ụlọ ụka. E bipụtara nya bụ ihe ngosi ọtụtụ mgbe na soshal midia. Ndị bipụtara ihe ngosi ahụ kwuru na ụlọ ụka ahụ dị na Kwara steetị.
N’ụbọchị iri abụọ n’ato nke ọnwa Novemba, otu onye na X bipụtara ihe ngosi nke ịsị okwu ya kwụrụ : Ụbọchị ụka ọma na otu ụlọ ụka dị na Kwara. Chekwa onwe gị. E chekwala ka ndị nche chekwa gi.

Ozi ahụ nwetara nkiri karịrị otu nde (1 million views), nkesa karịrị puku abụọ (2,000 reposts), nkesa nwere isi okwu narị atọ n’itolu (309 quotes), na nkwenye puku iri itolu (19,000 likes).
Nyocha miri-emi nke anyị mere n’ihe ngosi ahụ gosiri na e jiri AI nwogharia ya.
Nke mbụ, otu nwaanyị nke guzo n’etiti ihe ngosi ahụ bụ egbe AK-4, nwere mkpịsị aka anọ n’aka nri ya.
Nke abụọ anyị jiri SynthID, ị́gwè eji achọpụta na ihe ngosi bụ AI, were nyocha ya bu ihe ngosi ma chọpụta na e jiri ìgwè Google AI were mepụta ya.
Ihe ngosi ọzọ ebe otu nwaanyị bụ egbe na akwụkwọ nso ma yiri ákwà ndị nche bụ nke e jiri isiokwu bipụtara na Facebook: “akwụkwọ nso n’otu aka, egbe n’aka nke ọzọ. Akwụkwọ nso NEHEMIAH 4:3-17 emezuo, nna chekwa a ndị ụka niile n’aha Jizọs Biko, Kpere ndị kwere na Chineke ekpere.”
Mgbe CableCheck jiri SynthID nyocha ihe ngosi ahụ, anyị chọpụtara na-ejiri AI mepụta ya.

Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ É BỊ́PỤ́TÁGHÁRỊ́RỊ́ ÉBÉ ÓNYÉ Ụ́KỌ́CHỤ́KWU BỤ́ ÉGBÉ
Ihe ngosi ọzọ e jiri kwado okwu ndị ụka bụ egbe bụ ihe ngosi otu nwoke yi ákwà ndị ụkọ Chukwu Catọlik akpọrọ cassock ebe ọbụ egbe.

Ótù asafe akpọrọ Chinedu Anichi TV nwere ndị na-eso ya karịrị puku iri asatọ n’asaato (88,000 followers), jiri isi okwu a “ihe a bụ naanị ụzọ ndị ụka foduru na Naijiria ga-eji chekwa onwe ha”, were bipụta ihe ngosi ahụ.

CableCheck chọpụtara na ihe ngosi onye ụkọ Chukwu ahụ aputala ihe na intanetị k’amgbe afọ 2017. E jiri la ya bụ ihe ngosi were kwuo ọtụtụ mgbe mkpa odi ndị ụka ịchekwa onwe ha.
N’ọnwa May nke afọ 2022, TheCable bipụtara ihe nyocha Factcheck nke nyochara okwu na onye ụkọ Chukwu ahụ bụ egbe ahụ iji chere onwe ya n’aka ndị na-eme ngagharị iwe ndị na-akpọ maka ntọpu na nga ndị a kpọchiri maka ogbugbu Deborah Emmanuel, nwata nwaanyị akwụkwọ nke mahadum Shehu Shagari College of Education di na Sokoto steetị.
Deborah bụ onye a kporo ọkụ maka okwu ya nke a sịrị n’omegidere okpukperechi Allah.