TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Share
Latest News
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
FACT CHECK: Viral photos of Chioma with baby bump is from 2023
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 4, 2025 6 Min Read
Share

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n’obodo Eruku nke Kwara steeti n’ụbọchị iri n’asaato nke ọnwa Novemba, ihe ngosị ebe ọtụtụ ndị okpuperechi ụka bụ egbe n’ụzọ iji chekwaa onwe ha pụtara ìhè na soshal midia.

Nwakpo ndị a gara ụka bụ nke a hutara ka ọna-eme dị ka ha na-ekpere chị ya.

Mmadụ atọ bụ ndị e gburu, ebe madu iri atọ n’asaato ka ha tọrọla.

Nwakpo ahụ bụ nke mere dịka a na-akọ maka ogbugbu ndị ụka na Naijiria ya na mmaja onyeisi ala mba US ịchịbata ndị agha militri obodo ya na Naijiria.

E nweela nwakpo ọtụtụ ụlọ ụka na Naijiria, nke kpalitara okwu gbasara mkpa ọdị  onye ọbụla ịchekwa onwe ha.

Dịka nwakpo ndị ahu na-eme, ọtụtụ ndị na soshal midia bidoro bipụtawa ihe ngosi ebe ndị okpuperechi ụka bụgasi egbe.

Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ ÉWÉPỤ́TÁRÁ Ń’Ị́HÉ ŃKỊ́RỊ́ Ị́TỌ́CHỊ̀ BỤ̀ NKÉ ÉBỊ́PỤ́TÁRÁ KÀ Ó MÉRÉ-ÉMÉ

N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Dezemba, Oriental Times, asafe éjị́ ebipụta ozi, bipụtara ihe ngosi ebe nwoke bụ egbe AK-47 n’akụkụ otu nwanyị.

E jiri isi okwu kwuru : onye ụkọ Chukwu Naijiria bụ egbe akụzir okwu Chukwu n’okporo ụzọ.

Ozi ahụ enwetala nkwenye karịrị narị ise (500 likes), ntunye ọnụ narị asatọ n’iri asatọ (880 comments), na nkesa narị abụọ n’iri ato (230 shares).

CableCheck  jiri ị́gwè nyocha Google Lens were nyocha ya bụ ihe ngosi ma chọpụta na ọbụ ihe e sechara n’ime ihe nkiri ụkọchi nke onye na-eme ihe ọchị bụ Pastor Destiny bipụtara.

Ihe ngosị ahụ bụ nke Pastor Destiny Bipụtara n’asafe Facebook ya a na-akpọ REAL DON DADDY n’ụbọchị iri abụọ n’anọ nke ọnwa Novemba nke gosiri ebe ya na otu nwanyị bụ egbe na akwụkwọ nso were na-akuzi okwu Chukwu n’okporo ụzọ.

Pastor Destiny bụ̀ ónyé na ebipụta ihe ọchị gbasara ekpere na-ịzịsa ozị Chukwu.

Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ É JỊ́RỊ́ AI NWÓGHÁRIÁ GÓSỊ́RỊ́ ŃDỊ́ Ụ́KÁ BỤ́ EGBÉ

Ihe ngosi ọzọ wuru-ewu bụ nke gosiri ndị ụka bụ egbe n’ime ụlọ ụka. E bipụtara nya bụ ihe ngosi ọtụtụ mgbe na soshal midia. Ndị bipụtara ihe ngosi ahụ kwuru na ụlọ ụka ahụ dị na Kwara steetị.

N’ụbọchị iri abụọ n’ato nke ọnwa Novemba, otu onye na X bipụtara ihe ngosi nke ịsị okwu ya kwụrụ : Ụbọchị ụka ọma na otu ụlọ ụka dị na Kwara. Chekwa onwe gị. E chekwala ka ndị nche chekwa gi.

Ozi ahụ nwetara nkiri karịrị otu nde (1 million views), nkesa karịrị puku abụọ (2,000 reposts), nkesa nwere isi okwu narị atọ n’itolu (309 quotes), na nkwenye puku iri itolu (19,000 likes).

Nyocha miri-emi nke anyị mere n’ihe ngosi ahụ gosiri na e jiri AI nwogharia ya.

Nke mbụ, otu nwaanyị nke guzo n’etiti ihe ngosi ahụ bụ egbe AK-4, nwere mkpịsị aka anọ n’aka nri ya.

Nke abụọ anyị jiri SynthID, ị́gwè eji achọpụta na ihe ngosi bụ AI, were nyocha ya bu ihe ngosi ma chọpụta na e jiri ìgwè Google AI were mepụta ya.

Ihe ngosi ọzọ ebe otu nwaanyị bụ egbe na akwụkwọ nso ma yiri ákwà ndị nche bụ nke e jiri isiokwu bipụtara na Facebook: “akwụkwọ nso n’otu aka, egbe n’aka nke ọzọ. Akwụkwọ nso NEHEMIAH 4:3-17 emezuo, nna chekwa a ndị ụka niile n’aha Jizọs Biko, Kpere ndị kwere na Chineke ekpere.”

Mgbe CableCheck jiri SynthID nyocha ihe ngosi ahụ, anyị chọpụtara na-ejiri AI mepụta ya.

Ị́HÉ ŃGÓSỊ́ É BỊ́PỤ́TÁGHÁRỊ́RỊ́ ÉBÉ ÓNYÉ Ụ́KỌ́CHỤ́KWU BỤ́ ÉGBÉ

Ihe ngosi ọzọ e jiri kwado okwu ndị ụka bụ egbe bụ ihe ngosi otu nwoke yi ákwà ndị ụkọ Chukwu Catọlik akpọrọ cassock ebe ọbụ egbe.

Ótù asafe akpọrọ Chinedu Anichi TV nwere ndị na-eso ya karịrị puku iri asatọ n’asaato (88,000 followers), jiri isi okwu a “ihe a bụ naanị ụzọ ndị ụka foduru na Naijiria ga-eji chekwa onwe ha”, were bipụta ihe ngosi ahụ.

CableCheck chọpụtara na ihe ngosi onye ụkọ Chukwu ahụ aputala ihe na intanetị k’amgbe afọ 2017. E jiri la ya bụ ihe ngosi were kwuo ọtụtụ mgbe mkpa odi ndị ụka ịchekwa onwe ha.

N’ọnwa May nke afọ 2022, TheCable bipụtara ihe nyocha Factcheck nke nyochara okwu na onye ụkọ Chukwu ahụ bụ egbe ahụ iji chere onwe ya n’aka ndị na-eme ngagharị iwe ndị na-akpọ maka ntọpu na nga ndị a kpọchiri maka ogbugbu Deborah Emmanuel, nwata nwaanyị akwụkwọ nke mahadum Shehu Shagari College of Education di na Sokoto steetị.

Deborah bụ onye a kporo ọkụ maka okwu ya nke a sịrị n’omegidere okpukperechi Allah.

TAGGED: AI images, Christain genocide, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 4, 2025 December 4, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025

FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading

Following the attack on worshippers by bandits at a branch of Christ Apostolic Church (CAC)…

December 3, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne

Wani rubutu ya yi ikirarin cewa tauraron Afrobeats Davido da matarsa, Chioma Adeleke, na kara samun haihuwa. Wani mai amfani…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?