Ụfọdụ ndị na soshal midia ekwuola na ụlọikpe dị na Finland nyere ịwụ ka-tọghapul Simon, Ekpa, onye ndú otu nwere onwe Biafra, na ngà.
Ọtụtụ ndị bipụtara ozi ahụ na soshal midia dịka Facebook na Instagram.
Ozi ahụ kwukwara na ụlọikpe ahụ nyere ịwụ ka akwughachi Ekpa dollar puku iri ise ( $50,000) maka mmekpahụ dịka ọchịchị Naịjirịa jụrụ ịbịa uloikpe maka nya bụ okwu.
Akpoghi aha onye omeiwu nyere nya bụ iwu.
“Ụlọikpe Finland atọghapula onye ndú òtù Biafra na ngà, dịka ọchịchị Naijiria jụrụ ịbịa n’ụlọikpe ịgọrọ ịsị ha maka nya bụ okwu,” ozi ahụ kwụrụ.
“Dịka iwu ụlọikpe ahụ nyere, nkpọchi Ekpa bụ nke e kwuru “na ozighi-ezi, ma bụrụkwa nke e mere n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị”, nke mere e jiri kwughachi ya ụgwọ dollar puku iri ise ($50,000) maka mkpọchi na ezighi-ezi a kpọchiri ya na ngà.
“Onye omeiwu ahụ kwuru dịka o nyechara iwu ahụ ma si:
“Ha chọrọ ị mechi m ọnụ, mana a naghị akpọchi eziokwu na ngà. Mmeri a abụghị nke naanị m, ọ bụ nke ndị Biafra na ndị niile na-achọ ikpe ziri-ezi.”
Otú asafe a kpọrọ “I News” nke nwere ndị na-eso ya karịrị puku narị iri isi n’asaa (167,000) bipụtara ozi ahụ.
CableCheck chọpụtara na ụfọdụ asafe bipụtara izi ahụ na soshal midia na-akwado Biafra.
E bipụtara ozị ahụ ebe a, ebe a, n’ebe a.
ÓKPỤ́RỤ́ ÁKỤ́KỌ́
N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, ụlọikpe Päijät-Häme distritị nke Finland kpọchiri Ekpa na ngà afọ isii maka mpụ mmekpa obodo.
Òtù panel ndị ọka ikpe ato kwụrụ na Ekpa mere mpụ dịka isonye nakwa ịmekpa Naijiria ahụ nke akpọrọ terrorism.
Ụlọikpe ahụ kwụrụ na Ekpa ji asafe ya nwere ọtụtụ ndị na-eso ya were tinye ọgbaghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naijiria site n’ọnwa August 2021 ruo ọnwa Novemba 2024.
Ụlọikpe ahụ kpochikwara ya na nga maka na-okwuyi ụtụ tax ya.
Dịka iwu Finland, Ekpa nwere ubochi iri atọ ịgbagha iwu ahụ. Mana CableCheck agaghị ekwuli ma Ekpa ọgbaghara iwu ahụ, maka na Kaarle Gummerus, onye ọka ikpe ya, asaghachibeghi ajụjụ anyị gbasara okwu ahụ.
ŃNYÓCHÁ
CableCheck nyochara ọtụtụ oba ozi dị na Finland ịji mata ma onwere uloikpe tọghapụrụ Ekpa na ngà dịka ozi ahụ kwụrụ.
Onweghi oba ozi ọbụla bipụtara ozi dị ótú ahụ.
Kamgbe a kpọchiri ya na nga n’ọnwa Septemba, onwebeghị ozị a nụrụ gbasara okwu ahụ rute taa bụ ụbọchị iri abụọ n’abuo nke ọnwa Ọktoba.
MKPÉBỊ̀
Okwu na ụlọikpe dị na Finland atọpula Ekpa na ngà bụ asị.