TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Mbà, á gághị̀ ágbáchị́bị́dó ákántụ̀ ńdị́ Naijiria n’énwéghị́ TIN sị́té Jánúwarị́ 2026
Share
Latest News
Amupitan, ẹni tí Ààrẹ Nàìjíríà ṣẹ̀ṣẹ̀ yàn gẹ́gẹ́bí alága tuntun fún INEC kò sí lára àwọn agbẹjọ́rò fún Tinubu ní ilé ẹjọ́ ìbò
Amupitan, wanda INEC ta zaba, ba ya cikin tawagar lauyoyin Tinubu a kotun zabe
Amupitan, INEC chair nominee, bin no dey inside Tinubu legal team for election tribunal
FACT CHECK: Viral video showing ‘Boko Haram taking over army barracks’ NOT from Nigeria
FACT CHECK: Amupitan, INEC chair nominee, wasn’t part of Tinubu’s legal team at election tribunal
Anambra guber: Offences that can get you arrested during elections in Nigeria
Charly Boy yayi da’awar karya kan cewa Dan Nnamdi Kanu yaci gasar ‘kwakwalwa ta Duniya’
Charly Boy no tok true sey Nnamdi Kanu son win ‘international brain competition’
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Mbà, á gághị̀ ágbáchị́bị́dó ákántụ̀ ńdị́ Naijiria n’énwéghị́ TIN sị́té Jánúwarị́ 2026

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 18, 2025 7 Min Read
Share

Íhé mbipụta na soshal midia kwụrụ na ndị Naịjirịa kwesịrị ịnwe ákàrà akwụmụgwọ Tax ha bido n’ọnwa Januwarị nke afọ 2026 tupu ha enwe ịkịke ịme ihe ọbụla na akaụntụ oba ego ha.

É kesara ozi ahụ na Instagram, Facebook, na ọtụtụ ọ́bá ozị asịrị.

“N’izụ ụka gara-aga, a nọ m n’otú ụlọ ọba ego mgbe mama Ngozi, otu nwanyị nke na-ere tomato na Ajah, bịara ị dọrọ ego,” Ozi ahụ kwuru.

“Ọ chọrọ ịzụ àkpà tomato ọ ga e regharị. Mana onye ọrụ ọba ego ahụ gwara ya: ‘Nwanyị, site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị 2026, ị gaghị enwe ịke ịdọrọ ego gị maọbụrụ n’inweghi akara ụgwọ ụtụ gị’.

“Ozi a gbagwojuru ya anya. ‘Ụgwọ ụtụ gịnị? E nweghị m ụlọru ọbụla, ọbụ naanị tomato ka m na-ere’. Otu a ka ọtụtụ ndị Naijiria ga eji nọrọ na ọnọdụ enweghị onye enyemaka n’afọ 2026 ma ọbụrụ na ha e tetaghị n’ụra.

“Site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị, n’afọ 2026: enweghị akaụntụ oba ego ọbụla  na-agaghị enwe TIN, maọbụ ụlọru ọbụla n’enweghị akara ụgwọ Tax. Ọbụladị ndi stock broker, ha ga ebido ịna akara TIN gị.

“Ọ bụrụgodi na ịbụ onye ahia dịka mama Ngozi, nwata akwụkwọ, onye ọrụ bekee, onye wayo, onye nwere obere azụmahịa, maọbụ onye obodo ọzọ bi na Naijiria, ọ bụrụ na ị nweghị TIN aku n’ụba gị bụ nke a ga gbachi-agbachi.”

Ozi ahụ akpalitela ọtụtụ mgbagwoju anya  na soshal midia, nke na ọtụtụ ndị mmadụ na ajụ ma ụlọ oba ego oga a gbachị akantụ ndị mmadụ maka ha enweghị TIN site n’onwa Januwarị nke afọ 2026.

ŃNYÒCHÁ

GỊ̀NỊ́ BỤ̀ TIN?

TIN bụ ákàrà iri n’ato (13 digit) na-egosi akwumụgwọ ụ́tụ̀ nke ụlọru Federal Inland Revenue Service (FIRS) na Joint Tax Board (JTB) na enye onye ọbụla kwụrụ ụgwọ ụtụ ha na Naijiria.

Nya bụ TIN bụ nke na-esonye ákàrà njịrịmara bụ NIN. Ebe nke ndị azụmahịa na-esonye akara ndenye ụlọrụ a kpọrọ CAC.

Ịwụ na onye rụrụ ogo ikwụ ụgwọ ụtụ inweta ákàrà TIN abụghị ihe ọhụrụ — ọ pụtara ìhè n’afọ 2019, nke dozigharịrị ịwụ ụgwọ ụtụ isi n’ịsị bụ personal Tax act.

Mgbe madu nyere ụlọ oba ego ákàrà njịrị  mara ya bụ NIN, ígwè mashine ha ga enyocha ya ofuma.

Site n’ime nke, ụlọ oba ego ahụ ga enweta akara TIN onye ahụ site na ọchịchọ ahụ.

GỊ́NỊ́ KÀ Ị́WỤ́ KWỤ́RỤ́?

Dịka otu Kọmitii n’ahụ maka iwu gbasara ego a kpọrọ presidential fiscal policy and tax reforms ịwu gbásara ịkwụ ụtụ manyere iwu na onye ọbụla kwesịrị ịnweta ákàrà TIN ya tupu ọ ruo afọ 2026.

Kọmitii a kwuru na nya bụ TIN metụtara ụfọdụ ntịnye na mwepụ ego na ụlọ akụ, ma gbakwunye na ọ bụghị iwu ọhụrụ.

Ha kọwara na nke a metụtara naanị ndị mobu ụlọrụ na-enweta ego ruru ịna ụtụ n’elu ya.

“Ụlọ akụ niile kwesịrị ịnata onye ọbụla tozụrụ ikwu ụgwọ Tax ákàrà ụgwọ ụtụ ya. Onye ọbụla n’anaghị erita ụgwọ ọnwa maọbụ etozughị  òkè ịkwụ́ ụtụ bụ ndị n’agaghị egosi TIN ha,” Kọmitii a kọwara.

Kọmitii a kwụrụ na ndị nwere TIN agaghị enweta TIN ọhụrụ.

“Onye ọbụla nke ruru ógó ịkwụ́ ụtụ n’enweghị TIN agaghị enwe ikikere itinye mobu wepụ ego na akantu oba ego ya. Onye dị otú nwekwara ịke ịnweta ntaramahụhụ dịka iwu NTAA kwuru. Mana ndị na ekwesịghị ịkwụ ụtụ bụ ndị iwu na-amanyeghi na ha ga enweta TIN.

Ị́HÉ ŃDỊ́ Ọ́KÁCHÁMÀRÁ KWỤ́RỤ́

John Nwokolo, onye ọkachamara na ihe gbasara ụtụ, kwụrụ n’ịnwe akantu oba ego apụtaghị na onye ahụ ga akwụ ụgwọ ụtụ.

“Ọ bụghị na onye ọbụla nwere akantụ oba ego ga akwụ ụgwọ ụtụ. Ọ bụrụ na ịtozughi ịkwụ ụgwọ ụtụ a gaghị asị gị kwụọ ụtụ obula. Iwu ịsonye TIN na akantụ oba ego bụ i ji nwe oba ozị zuru òkè,” Nwokolo kwụrụ.

“Ọ bụrụ na ịtozughi ịkwụ ụtụ ugbu a, ọ pụtaghi na ị gaghị akwụ ụtụ n’adi n’ihu.”

Akpe Adoh, onye isi nzipu ozi n’ụlọru Joint Tax Board, kwụrụ n’ozi mbipụta na ndị Naijiria ga enwe ikike itinye na-iwepu ego na akantụ ọ́bá ego ha ma ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị nke afọ 2026 gafe.

“Ụlọrụ JTB (nke gụnyere ụlọ ọrụ na-anata ụtụ na steeti iri atọ n’isii nke Naịjiria) na-ejiko aka ọnụ ihu na enwere otu akara TIN,” Adoh kwụrụ.

“Ótù ákàrà a bụ nke a ga eji NIN maọbụ ákàrà ndenye aha were chọpụta azụmahịa maọbụ onye bụ onye.

“Atụmatụ ahụ ga-enye aka iji nye onye ọbụla TIN ya site n’iji NIN maọbụ ákàrà ịkịke azụmahịa, nke ga-eme ka ọ dị mfe ka ndị Naịjirịa nwe ịke ịkwụ ụtụ n’enweghị ịma aka n’ihu ọbụla nye akantu ịba ego ha.

“Anyị na-anyọ onye ọbụla ka ọ hara ịchegbu onwe ha ma wezụga ozị nke na abụghị eziokwu.

“Ọzọ, maka mgbagwoju anya, ndị Naịjirịa ga-enwe ịkịke ị doro na ị tinye ego na akantụ ọ́bá ego ha ma ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị 2026 gafe. Ónwéghị́ onye a ga agbachipu na akantu ya ma ọbụrụ na ọ nweghị Tax ID.”

NCHỊ́KỌ́TÁ

A gaghị agbachipu ndị Naịjirịa na akantụ ọ́bá ego ha bido Januwarị 2026, maọburu na ha enweghị TIN. Ọ  bụrụ na ị nwere NIN, ị nweghị nsogbu ọbụla.

TAGGED: bank accounts, Factcheck in igbo, FIRS, news in Igbo, Tax, Tax reforms

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 18, 2025 September 18, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Amupitan, ẹni tí Ààrẹ Nàìjíríà ṣẹ̀ṣẹ̀ yàn gẹ́gẹ́bí alága tuntun fún INEC kò sí lára àwọn agbẹjọ́rò fún Tinubu ní ilé ẹjọ́ ìbò

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé…

October 15, 2025

Amupitan, wanda INEC ta zaba, ba ya cikin tawagar lauyoyin Tinubu a kotun zabe

Wasu masu amfani da shafukan sada zumunta sun yi ikirarin cewa Joash Amupitan, sabon shugaban…

October 15, 2025

Amupitan, INEC chair nominee, bin no dey inside Tinubu legal team for election tribunal

Some social media users claim sey Joash Amupitan, di newly nominated chairman of di Independent…

October 15, 2025

FACT CHECK: Viral video showing ‘Boko Haram taking over army barracks’ NOT from Nigeria

A social media post has attributed certain individuals dressed in camouflage to Boko Haram militants…

October 15, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Amupitan, ẹni tí Ààrẹ Nàìjíríà ṣẹ̀ṣẹ̀ yàn gẹ́gẹ́bí alága tuntun fún INEC kò sí lára àwọn agbẹjọ́rò fún Tinubu ní ilé ẹjọ́ ìbò

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Joash Amupitan, alága tuntun fún…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 15, 2025

Amupitan, wanda INEC ta zaba, ba ya cikin tawagar lauyoyin Tinubu a kotun zabe

Wasu masu amfani da shafukan sada zumunta sun yi ikirarin cewa Joash Amupitan, sabon shugaban hukumar zabe mai zaman kanta…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 15, 2025

Amupitan, INEC chair nominee, bin no dey inside Tinubu legal team for election tribunal

Some social media users claim sey Joash Amupitan, di newly nominated chairman of di Independent National Electoral Commission (INEC), bin…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 15, 2025

Charly Boy yayi da’awar karya kan cewa Dan Nnamdi Kanu yaci gasar ‘kwakwalwa ta Duniya’

Charly Boy, mawakin Najeriya, ya yi ikirarin cewa dan Nnamdi Kanu, shugaban kungiyar masu fafutukar kafa kasar Biafra (IPOB), yaci…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?