Na nso nso a, ihe ngosị ebe nnụkwụ akpụrụ-akpụ nke Hyacinth Alia, gọvanọ Benue, na ụzọ gbara gburugburu dị na steeti ahụ, aputala ihe na soshal midia.
E bipụtara ihe ngosi ahụ okachasi na Facebook, Instagram, and X.
Ndị bipụtara ozi ahụ na soshal midia kwuru na e hibegasiri ihe akpụrụ akpụ ndị ahụ na ụzọ gbara gburugburu na Benue.
Ihe mbipụta ndị ahụ gosiri nnukwu ihe akpụrụ akpụ nke Alia ka a na-arụharịya na okporoụzọ ebe ọtụtụ ụgbọala na-agbafesị. Na otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, Alia yi uwe ọjị ọdịnala na ákwà uhie ọcha nke e jiri mara ndị Tiv nke obodo Benue, ebe na ihe ngosi nke abụọ oyi akwa na acha akwụkwọ-ndụ nke olu akwa ya dị ka nke ndị ụkọ chukwu.
Onye a ji X ebipụta ozi a kpọrọ @SadiqMaunde, jiri ịsiokwu na-ekwu “gọvanọ steeti Benue. Gọvanọ ndị APC na-azọ onye ga-emekari n’ihe ụkaọchị” were bipụta ihe ngosi ahụ.
Ihe ngosi ahụ nke e bipụtara na Sunday e enwetala nkiri narị puku atọ (300,000 views), ntụnye ọnụ narị abụọ n’iri anọ n’otu (241 quotes) na nkesa narị anọ n’iri abụọ n’isii)426 reposts).
Ótù onye na Facebook a kpọrọ Areki U Ukum, bipụtara ihe ngosi ahụ ma dee ” okporo ụzọ gbara gburugburu ana-atu anya ịrụ. Anyị nọ ya ị kwado Alia na Areki n’afọ 2027. N’ike chineke anyị ga-atụyere ha na ntụliaka elu na-abịa.”
E bipụtara ozị ahụ ebe a na ebe a.
NNYÓCHÁ
Nyocha anyị mere gosiri na e jiri AI were mepụta ihe ngosi ndị ahụ. N’otu n’ime ihe ngosi ahụ, ndị ọrụ na-akpụ ihe ngosi ndị ahụ enweghị isi pụtara ìhè ofuma.
CableCheck chọpụtara na e jiri ìgwè AI a kpọrọ Leonardo.ai were mepụta ihe ngosi ahụ.
Ígwè AI ahụ na nyere ndị mmadụ aka ị mepụta ihe ngosi site na-ịgwa ya ihe ngosi ịchọrọ ịbipụtara maobu site n’itinye ịhe ngosi ọbụla ị chọrọ ịnwoghari.
Ihe ngosi ebe onye isi ala mba US bụ Donald Trump n’ihe akpụrụ-akpụ dịka nke Alia nke e jiri nya bụ ígwè AI mepụta bụ nke e bipụtara n’ihe ngosi YouTube a.
CableCheck chọpụtara na ọ nweghị oba ozi ma nke ha riri bipụtara ozi na Alia na-aru ụzọ gbara gburugburu.
Mgbe anyị kpọturụ Tersoo Kula, onye nkwuchita ọnụ gọvanọ Benue , o kwụrụ na Alia a naghị-arụ okporo ụzọ gbara gburugburu ọbụla.
Kula si na nya bụ ihe ngosi bụ nke e jiri AI mepụta ma si n’ọbụ aka-oru ndị iro Alia iji “tinye ọgba aghara ma mebisie aha ya”.
Ọ gara n’ihu kwuo na nya bụ ihe ngosi pụtara ìhè n’etiti ọrụ okporo ụzọ Alia na-arụ na steeti Benue.
NCHỊ́KỌ́TÁ
Ị́hé ngosi ebe a na-akpụ Alia na ụzọ gbara gburugburu bụ AI.