TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ò nwéghị íhé ákáébe gósị́rị́ nà US tụ̀rụ̀ Burkina Faso bọ́mbụ̀
Share
Latest News
Kò sí ọ̀rọ̀ tó seé gbàgbọ́ nípa ọ̀rọ̀ tó sọ pé Amẹ́ríkà kọlu Burkina Faso pẹ̀lú ohun ìjà olóró
No evidence sey US strike Burkina Faso with missiles
Babu wata hujjar Amurka ta jefa makamai masu linzami Burkina Faso
FACT CHECK: No evidence US struck Burkina Faso with missiles
FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020
FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀
Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok
Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ò nwéghị íhé ákáébe gósị́rị́ nà US tụ̀rụ̀ Burkina Faso bọ́mbụ̀

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 28, 2025 4 Min Read
Share

Ótù onye na soshal midia ekwuola na a tụrụ ngwa agha US n’obodo Burkina Faso nke mere ka onye ndu ha bụ́ Ibrahim Traoré megwara.

Edwuadotv, otu asafe na Facebook, bipụtara nya bụ ozị na ụbọchị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa August.

“Mgbe ngwa agha US tụrụ ụlọ nche na mpaghara ụ́gwụ́ Burkina Faso, ọtụtụ chere n’obodo ahụ ga agba nkịtị. Mana Ibrahim Traoré atụghị ụjọ ọbụla. Kama onye ndú ntorobịa ahụ gbanwere ọnọdụ ahụ ka ọ buru ákwá Afrịka ịjụ mmegide ọbụla,” ozi ahụ dere.

Ihe ngosi nkeji iri n’ise ahụ enwetala nkiri puku iri atọ n’abụọ (32k views), nkwenye otu puku n’ụma narị atọ (1.3k likes), na ntụnye ọnụ narị anọ n’itoolu ( 409 comments).

Dịka olu ahụ kwuru, US kwadoro ịtụ bọmbụ ahụ n’ọdụ ndị agha ha dị na Niger Republic dịka ụzọ “imegide atụmatụ ndị oji egbe egbu”.

“Ngwa agha abụọ a kpachara anya were lụọ tụrụ ọdụ mkpakọrịta ụka na Burkina Faso, mebie ụlọ ozi ahụ ma gbuo mmadụ atọ — ndị agha abụọ na otu onye ọzọ. Mmadụ asaa bụ ndị merụrụ ahụ,” olu ahụ kwuru n’ihe ngosị ahụ.

“Olu ahụ kwuru na ozi ahụ kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ si akụkụ mba Afrịka.”

A hụtara ozi ahụ na YouTube na asafe a kpọrọ Bright Africa nke nwere ndị na-eso ya rụrụ pụkụ atọ n’uma narị ise (3.5k subscribers), nke nwetara nkiri puku iri n’asatọ na narị atọ n’iri ise n’itoolu (18,359 views).

Ị nwere ike ịgụta ozi gbasara okwu ahụ ebe a, ebe a, na ebe a.

Mana ozi ndị a ọ bụ eziokwu?

ŃNYÒCHÁ

CableCheck mere ọchịchọ miri-emi gbasara US ịtụ ngwa agha na Burkina Faso, mana anyị ahụghị ozi dị otu ahụ.

N’agbanyeghị na olu ahụ n’ihe ngosi ahụ ekwughị ụbọchị a tụrụ nya bụ ngwa agha, CableCheck mere ọchịchọ site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa August ruo ụbọchị iri abụọ n’isii nke otu ọnwa ahụ, iji mata ma anyị ọ ga ahụta ozi dị otu ahụ ziri ezi.

Mana o nweghị ụlọ ozi ma nke ha riri bipụtara na US tụrụ bọmbụ na Burkina Faso.

Ozi dị otu a bụ nke ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi ga-ebipụta n’ọba ozi ha, maka na ngwa agha nke a tụrụ na Iran bụ nke nwetara ọtụtụ ntụye ọnụ n’ụwa niile.

Na mgbakwunye, olu onye ahụ nke nà-ádà ka ihe ejiri AI nwogharịa ya kwuru na e sitere na ọdụ ndị agha US nọ na Niger tụọ nya bụ ngwa agha.

Mana k’odiri ugbu a, US enwezighị ọdụ ndị agha na Niger.

N’ọnwa Septemba nke afọ gara aga, US kpọlatara ndị agha ya nile nọ n’obodo ndị di na ọzara Sahel, nke kwụsịrị mmekọrịta US na ọchịchị ndị agha nke obodo Niger.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Onweghị ihe aka ebe na-egosị na US tụrụ ngwa aha na obodo Burkina Faso.

TAGGED: Burkina Faso, fact check in Igbo, news in Igbo, US missile

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 28, 2025 August 28, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Kò sí ọ̀rọ̀ tó seé gbàgbọ́ nípa ọ̀rọ̀ tó sọ pé Amẹ́ríkà kọlu Burkina Faso pẹ̀lú ohun ìjà olóró

Ẹnì kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ orí ayélujára tí sọ pé…

August 28, 2025

No evidence sey US strike Burkina Faso with missiles

One social media user don claim sey United States missiles hit Burkina Faso, causing Ibrahim…

August 28, 2025

Babu wata hujjar Amurka ta jefa makamai masu linzami Burkina Faso

Wani mai amfani da shafukan sada zumunta ya yi ikirarin cewa makamai masu linzami da…

August 28, 2025

FACT CHECK: No evidence US struck Burkina Faso with missiles

A social media user has claimed that United States missiles hit Burkina Faso, prompting Ibrahim…

August 27, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Kò sí ọ̀rọ̀ tó seé gbàgbọ́ nípa ọ̀rọ̀ tó sọ pé Amẹ́ríkà kọlu Burkina Faso pẹ̀lú ohun ìjà olóró

Ẹnì kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ orí ayélujára tí sọ pé orílẹ̀ èdè Amẹ́ríkà ti kọlu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 28, 2025

No evidence sey US strike Burkina Faso with missiles

One social media user don claim sey United States missiles hit Burkina Faso, causing Ibrahim Traoré, army presido, to revenge.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 28, 2025

Babu wata hujjar Amurka ta jefa makamai masu linzami Burkina Faso

Wani mai amfani da shafukan sada zumunta ya yi ikirarin cewa makamai masu linzami da Amurka ta harba a Burkina…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 28, 2025

FACT CHECK: No evidence US struck Burkina Faso with missiles

A social media user has claimed that United States missiles hit Burkina Faso, prompting Ibrahim Traoré, junta leader, to retaliate.…

Fact Check
August 27, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?