TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ò nwéghị íhé ákáébe gósị́rị́ nà US tụ̀rụ̀ Burkina Faso bọ́mbụ̀
Share
Latest News
FACT CHECK: Finnish court didn’t free Simon Ekpa, award him $50,000 compensation
Ńgághárị́wé méré ńké Napel kà é bị́pụ́tárá dị́kà ọ́gbákọ́ ndị̀ ná-áchọ́ ńtọ́pụ̀ Nnamdi Kanu na-ngà
Fídíò ẹ̀hónú ní Nepal ni àwọn ènìyàn ń pín, tí wọ́n ní Nàìjíríà ló ti ṣẹlẹ̀ kí ìjọba lè tú Nnamdi Kanu sílẹ̀
Old Nepal protest video comot for internet as Abuja protest for Nnamdi Kanu release
An sake yin amfani da faifan bidiyo na zanga-zangar tayanar gizo yayin da Abuja ke gangamin neman a saki Nnamdi Kanu
DISINFO ALERT: Nepal protest video recycled online as Abuja rally for Nnamdi Kanu’s release
FACT CHECK: Video from Congo falsely used to depict ‘Christians fleeing their homes’ in Nigeria
DISINFO ALERT: Claim that JAMB is no longer prerequisite for tertiary institutions admission is false
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ò nwéghị íhé ákáébe gósị́rị́ nà US tụ̀rụ̀ Burkina Faso bọ́mbụ̀

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 28, 2025 4 Min Read
Share

Ótù onye na soshal midia ekwuola na a tụrụ ngwa agha US n’obodo Burkina Faso nke mere ka onye ndu ha bụ́ Ibrahim Traoré megwara.

Edwuadotv, otu asafe na Facebook, bipụtara nya bụ ozị na ụbọchị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa August.

“Mgbe ngwa agha US tụrụ ụlọ nche na mpaghara ụ́gwụ́ Burkina Faso, ọtụtụ chere n’obodo ahụ ga agba nkịtị. Mana Ibrahim Traoré atụghị ụjọ ọbụla. Kama onye ndú ntorobịa ahụ gbanwere ọnọdụ ahụ ka ọ buru ákwá Afrịka ịjụ mmegide ọbụla,” ozi ahụ dere.

Ihe ngosi nkeji iri n’ise ahụ enwetala nkiri puku iri atọ n’abụọ (32k views), nkwenye otu puku n’ụma narị atọ (1.3k likes), na ntụnye ọnụ narị anọ n’itoolu ( 409 comments).

Dịka olu ahụ kwuru, US kwadoro ịtụ bọmbụ ahụ n’ọdụ ndị agha ha dị na Niger Republic dịka ụzọ “imegide atụmatụ ndị oji egbe egbu”.

“Ngwa agha abụọ a kpachara anya were lụọ tụrụ ọdụ mkpakọrịta ụka na Burkina Faso, mebie ụlọ ozi ahụ ma gbuo mmadụ atọ — ndị agha abụọ na otu onye ọzọ. Mmadụ asaa bụ ndị merụrụ ahụ,” olu ahụ kwuru n’ihe ngosị ahụ.

“Olu ahụ kwuru na ozi ahụ kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ si akụkụ mba Afrịka.”

A hụtara ozi ahụ na YouTube na asafe a kpọrọ Bright Africa nke nwere ndị na-eso ya rụrụ pụkụ atọ n’uma narị ise (3.5k subscribers), nke nwetara nkiri puku iri n’asatọ na narị atọ n’iri ise n’itoolu (18,359 views).

Ị nwere ike ịgụta ozi gbasara okwu ahụ ebe a, ebe a, na ebe a.

Mana ozi ndị a ọ bụ eziokwu?

ŃNYÒCHÁ

CableCheck mere ọchịchọ miri-emi gbasara US ịtụ ngwa agha na Burkina Faso, mana anyị ahụghị ozi dị otu ahụ.

N’agbanyeghị na olu ahụ n’ihe ngosi ahụ ekwughị ụbọchị a tụrụ nya bụ ngwa agha, CableCheck mere ọchịchọ site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa August ruo ụbọchị iri abụọ n’isii nke otu ọnwa ahụ, iji mata ma anyị ọ ga ahụta ozi dị otu ahụ ziri ezi.

Mana o nweghị ụlọ ozi ma nke ha riri bipụtara na US tụrụ bọmbụ na Burkina Faso.

Ozi dị otu a bụ nke ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi ga-ebipụta n’ọba ozi ha, maka na ngwa agha nke a tụrụ na Iran bụ nke nwetara ọtụtụ ntụye ọnụ n’ụwa niile.

Na mgbakwunye, olu onye ahụ nke nà-ádà ka ihe ejiri AI nwogharịa ya kwuru na e sitere na ọdụ ndị agha US nọ na Niger tụọ nya bụ ngwa agha.

Mana k’odiri ugbu a, US enwezighị ọdụ ndị agha na Niger.

N’ọnwa Septemba nke afọ gara aga, US kpọlatara ndị agha ya nile nọ n’obodo ndị di na ọzara Sahel, nke kwụsịrị mmekọrịta US na ọchịchị ndị agha nke obodo Niger.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Onweghị ihe aka ebe na-egosị na US tụrụ ngwa aha na obodo Burkina Faso.

TAGGED: Burkina Faso, fact check in Igbo, news in Igbo, US missile

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 28, 2025 August 28, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Finnish court didn’t free Simon Ekpa, award him $50,000 compensation

Some social media users claim that a Finnish court has ruled that Simon Ekpa, a…

October 22, 2025

Ńgághárị́wé méré ńké Napel kà é bị́pụ́tárá dị́kà ọ́gbákọ́ ndị̀ ná-áchọ́ ńtọ́pụ̀ Nnamdi Kanu na-ngà

Ótụ́ ihe ngosi na TikTok ekwuola na ìgwè mmadụ gbakọrọ maka ngagharị iwe na Abuja,…

October 22, 2025

Fídíò ẹ̀hónú ní Nepal ni àwọn ènìyàn ń pín, tí wọ́n ní Nàìjíríà ló ti ṣẹlẹ̀ kí ìjọba lè tú Nnamdi Kanu sílẹ̀

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ń pín kiri lórí TikTok, ibì kan lórí ayélujára tí…

October 22, 2025

Old Nepal protest video comot for internet as Abuja protest for Nnamdi Kanu release

One viral video for TikTok show one large crowd of protesters as Nigerians wey dey…

October 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ńgághárị́wé méré ńké Napel kà é bị́pụ́tárá dị́kà ọ́gbákọ́ ndị̀ ná-áchọ́ ńtọ́pụ̀ Nnamdi Kanu na-ngà

Ótụ́ ihe ngosi na TikTok ekwuola na ìgwè mmadụ gbakọrọ maka ngagharị iwe na Abuja, bụ ndị na-achọ ka-atọpụ Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 22, 2025

Fídíò ẹ̀hónú ní Nepal ni àwọn ènìyàn ń pín, tí wọ́n ní Nàìjíríà ló ti ṣẹlẹ̀ kí ìjọba lè tú Nnamdi Kanu sílẹ̀

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ń pín kiri lórí TikTok, ibì kan lórí ayélujára tí áwọn ènìyàn ti máa ń…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 22, 2025

Old Nepal protest video comot for internet as Abuja protest for Nnamdi Kanu release

One viral video for TikTok show one large crowd of protesters as Nigerians wey dey demand di release of Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 22, 2025

An sake yin amfani da faifan bidiyo na zanga-zangar tayanar gizo yayin da Abuja ke gangamin neman a saki Nnamdi Kanu

Wani faifan bidiyo da aka yada a TikTok ya danganta dimbin masu zanga-zangar da ‘yan Najeriya ke neman a saki…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?