Ótù ozi na soshal midia ekwuola na enwéla ọnwụ ndị ụka na Naijiria karịa ọnụ ogụgụ ndị Palestine e gburu na Gaza n’afọ 2025.
E bipụtara ozi ahụ na X(nke a maburu dịka Twitter) n’ụbọchị Satọdee.
‘N’afọ a, e gbuola ọtụtụ ndị okpụkperechi ụka na Naijiria karịa ọnụ ọgụgụ ndị Palestine nwụrụ na Gaza” onye a amara dịka Eyal Yakoby nwere ndị na-eso ya na X rụrụ otu pụkụ narị na iri asatọ n’otu na ụma narị ise (181,500 followers).
Ozi ahụ enwetala nkiri puku narị asatọ na iri abụọ n’asatọ (828,000 views), nkwenye puku iri atọ n’abuo (32,000 likes), nkesa puku itoolu na narị abụọ (9,200 reposts), nchekwa ịgụ mgbe ọzọ otu puku na narị abụọ (1,200 bookmarks), na ntụnye ọnụ karịrị narị asatọ (800 comments).
Mana ozi a ọ bụ eziokwu?
ŃDỊ́ PALESTINE ÓLÉ KÀ É GBÙRÙ NÀ GAZA?
Dịka n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa August, ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ e gburu n’agha a na-alụ na Gaza dị puku iri isii n’otu na narị itoolu n’iri anọ n’anọ (61,944), dịka WAFA, ọba ozi Palestine, kwuru.
Ozi ahụ kwụrụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ nwụrụ ka mgbe agha ahụ bidoro bụ ụmụaka na ụmụ nwanyị.
N’ụbọchị iri n’isii nke ọnwa August, ụbọchị Yakoby bipụtara ozi a, WAFA kwụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị Palestine e gburu na obodo ahụ bụ pụkụ iri isii n’otu na narị asatọ n’iri itoolu n’asaa (61,897).
Naanị n’afọ a (site Januwarị ruo August), e gbuola ndị Palestine dị puku iri n’isii na narị abụọ n’iri abụọ n’atọ (16,223), dịka ozi si na ụlọrụ WHO Health Cluster kwuru.
Íhé karịrị pesentị iri asa (70%) bụ ụmụ nwaanyị na ụmụ aka.
ŃDỊ́ Ụ́KÀ ÒLÉ KÀ É GBÙRÙ NÀ NAIJIRIA N’ÁFỌ́ À?
Dịka ozi si na International Society for Civil Liberties and Rule of Law (Intersociety) — òtù ụka na-echekwa ikike mmadụ kwụrụ, e gbuola ndị ụka rụrụ puku asaa na iri asatọ n’asaa (7,087) k’amgbe afọ a.
Ozi a bụ site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị ruo ụbọchị iri nke ọnwa August.
A mara Intersociety maka ịkwupụta ọtụtụ ogbugbu ndị mmadụ na Naijiria dịka nke okpukperechi. Ozi ha na ebokarị ọnwụ ndị a n’ịsị ndị Fulani na-achị nama, òtù jihad, nakwa òtù ndị ọzọ.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Nchọpụta anyị na-egosị na ị nyochaa ọnwụ ndị ahụ ọfụma ọdabaghị na ihe Yakoby na-ekwu.
Kamgbe agha bidoro na Gaza, e gbuola ndị Palestine ruru puku iri isii (60,000).
Na ndabere kwa afọ, e gbuola ndị Palestine karịrị puku iri n’isii (16,000) na Gaza n’afọ 2025 — ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ọkpụkpọ abụọ ndị ụka e gburu na Naijiria n’afọ a.
ḾKPÉBÌ
Ozi na e gbuola ndị ụka karịrị ọnụ ọgụgụ ndị Palestine e gburu na Gaza k’amgbe afọ adabaghị na ihe ozi pụtara ìhè na-ekwu.
N’agbanyeghị na ozi Intersociety dabere na ọnụ ọgụgụ ndị ụka, nakwa oge ụfọdụ na ọnụ ọgụgụ ndị okpuperechi ọzọ e gburu na Naijiria. Ozi ha nye ọnụ ọgụgụ ndị ụka nwụrụ na Naijiria dị ala tunyere ozi WHO gbasara ọnụ ọgụgụ ndị Palestine nwụrụ na Gaza n’afọ a.