TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 21, 2025 4 Min Read
Share

Ótù ozi na soshal midia ekwuola na enwéla ọnwụ ndị ụka na Naijiria karịa ọnụ ogụgụ ndị Palestine e gburu na Gaza n’afọ 2025.

E bipụtara ozi ahụ na X(nke a maburu dịka Twitter) n’ụbọchị Satọdee.

‘N’afọ a, e gbuola ọtụtụ ndị okpụkperechi ụka na Naijiria karịa ọnụ ọgụgụ ndị Palestine nwụrụ na Gaza” onye a amara dịka Eyal Yakoby nwere ndị na-eso ya na X rụrụ otu pụkụ narị na iri asatọ n’otu na ụma narị ise (181,500 followers).

Ozi ahụ enwetala nkiri puku narị asatọ na iri abụọ n’asatọ (828,000 views), nkwenye puku iri atọ n’abuo (32,000 likes), nkesa puku itoolu na narị abụọ (9,200 reposts), nchekwa ịgụ mgbe ọzọ otu puku na narị abụọ (1,200 bookmarks), na ntụnye ọnụ karịrị narị asatọ (800 comments).

Mana ozi a ọ bụ eziokwu?

ŃDỊ́ PALESTINE ÓLÉ KÀ É GBÙRÙ NÀ GAZA?

Dịka n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa August, ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ e gburu n’agha a na-alụ na Gaza dị puku iri isii n’otu na narị itoolu n’iri anọ n’anọ (61,944), dịka WAFA, ọba ozi Palestine, kwuru.

Ozi ahụ kwụrụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ nwụrụ ka mgbe agha ahụ bidoro bụ ụmụaka na ụmụ nwanyị.

N’ụbọchị iri n’isii nke ọnwa August, ụbọchị Yakoby bipụtara ozi a, WAFA kwụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị Palestine e gburu na obodo ahụ bụ pụkụ iri isii n’otu na narị asatọ n’iri itoolu n’asaa (61,897).

Naanị n’afọ a (site Januwarị ruo August), e gbuola ndị Palestine dị puku iri n’isii na narị abụọ n’iri abụọ n’atọ (16,223), dịka ozi si na ụlọrụ WHO Health Cluster kwuru.

Íhé karịrị pesentị iri asa (70%) bụ ụmụ nwaanyị na ụmụ aka.

ŃDỊ́ Ụ́KÀ ÒLÉ KÀ É GBÙRÙ NÀ NAIJIRIA N’ÁFỌ́ À?

Dịka ozi si na International Society for Civil Liberties and Rule of Law (Intersociety) — òtù ụka na-echekwa ikike mmadụ kwụrụ, e gbuola ndị ụka rụrụ puku asaa na iri asatọ n’asaa (7,087) k’amgbe afọ a.

Ozi a bụ site n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Januwarị ruo ụbọchị iri nke ọnwa August.

A mara Intersociety maka ịkwupụta ọtụtụ ogbugbu ndị mmadụ na Naijiria dịka nke okpukperechi. Ozi ha na ebokarị ọnwụ ndị a n’ịsị ndị Fulani na-achị nama, òtù jihad, nakwa òtù ndị ọzọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Nchọpụta anyị na-egosị na ị nyochaa ọnwụ ndị ahụ ọfụma ọdabaghị na ihe Yakoby na-ekwu.

Kamgbe agha bidoro na Gaza, e gbuola ndị Palestine ruru puku iri isii (60,000).

Na ndabere kwa afọ, e gbuola ndị Palestine karịrị puku iri n’isii (16,000) na Gaza n’afọ 2025 — ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ọkpụkpọ abụọ ndị ụka e gburu na Naijiria n’afọ a.

ḾKPÉBÌ

Ozi na e gbuola ndị ụka karịrị ọnụ ọgụgụ ndị Palestine e gburu na Gaza k’amgbe afọ adabaghị na ihe ozi pụtara ìhè na-ekwu.

N’agbanyeghị na ozi Intersociety dabere na ọnụ ọgụgụ ndị ụka, nakwa oge ụfọdụ na ọnụ ọgụgụ ndị okpuperechi ọzọ e gburu na Naijiria. Ozi ha nye ọnụ ọgụgụ ndị ụka nwụrụ na Naijiria dị ala tunyere ozi WHO gbasara ọnụ ọgụgụ ndị Palestine nwụrụ na Gaza n’afọ a.

TAGGED: death toll, Factcheck in igbo, Gaza, Isreal, news in Igbo, Nigerian Christians, palestine

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 21, 2025 August 21, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Ókwụ́ nà FIFA jị́rị́ $1.2m rụ́ọ́ stadium Talanta nké Kenya bụ̀ ásị́

N'ụbọchị iri abụọ n'isii nke ọnwa Ọktoba, Dino Melaye kwụrụ na FIFA nyere Naijiria na Kenya otu nde Dollar na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

Kebbi sị̀ n’ónwéghị́ ọ́dụ̀ ụ́gbọ́élụ́ ńzụ́zọ́ ánà-éré cocaine dị́ ná stéétị̀ áhụ́

Gọọmenti steeti Kebbi si na ihe ngosi AI na-ekwu na a na-arụ ụgbọelu n'óké ọhịa dị na Argungu ebe a…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?