Íhé ngosị na-ekwupụta nkesa ọgwụ na-agwọ ọrịa diabetes pụtara ìhè na soshal midia Naịjiria.
Íhé ńgósị́ ahụ kwuru na Ali Pate, onye minista na-ahụ maka ahụike nke Naijiria, ekpughela ọgwụ ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa diabetes, bụ nke a sịrị na a ga-ezitara ndị mmadụ n’ụlọ ha gasị.
E dozichara ozi ahụ nke na, ọ bụrụ na ịkpachaghị anya, ị ga-ekweta na ọ bụ eziokwu. Mana e mechara chọpụta na ọ bụ ozi ejiri AI nwogharịa. Nke a bụ ótù n’ime ihe ngosị ndị e jiri AI nwogharịa juru na soshal midia.
Deepfakes bụ ihe ngosị ndị e jiri AI gbanwe, ka ọ dịka mmadụ o mere maọbụ kwuo ihe n’emeghị. Na nsonso a, e jirila nya bụ deepfakes were zisa ozi n’ezighi ezi gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mee mpụ, ma mebie aha ụfọdụ ndị mmadụ.
Olee ótú ị ga-esi mata ozi e jiri AI nwogharịa? Na mbipụta a, Cable Check kọwara ụzọ asaa ị ga-eji mata na ihe ngosị bụ nke jiri AI nwogharịa.
Ụ́ZỌ̀ ÀSÁÀ É JÌ ÀMÁTÁ NÀ ÓZÍ BỤ̀ ǸKÈ É JÌRÌ AI NWÒGHÁRỊ́Á
1. Mmegharị ihu na-ekwekọghị n’okike: Ọtụtụ ihe ngosị e jiri AI nwogharịa na-emegharị ihu ma na-ajụ anya ha nwayọ-nwayọ, ọchị ndị mmadụ nọ na ihe ngosị dị otú a anaghị eru n’anya, tinyere na ntụgharị isi ha na-enwe ka ọ dị.
2. Ntụgharị anya na-ekwekọghị ekwekọ: Ihe ngosị AI na-enwekarị anya na-ele mmadụ ogologo oge, ma na-ajụkwa anya ọtụtụ mgbe ebe ụfọdụ oge ọ naghị ajụ anya ogologo oge. Ha na-elepukwa anya n’oge na-ekwesịghị ekwesị, dịka ha na-ekwu okwu.
3. Mmekọrịta egbugbere ọnụ na-adabaghị: I zute ihe ngosị na-edoghị gị anya ma ọ bụ aka ọrụ AI, lee anya na egbugbere ọnụ ndị nọ na nya bụ ihe ngosị. Na ọtụtụtu ihe ngosị dị otu a, mmegharị ọnụ onye na-ekwu okwu na olu ya anaghị adaba.
4. Mkpịsị aka n’ezichaghị ezi: AI amatabeghị ótú e si emeputa ihe ngosị nke mkpisi aka onye ahụ pụtara ihe ọfụma. Ọtụtụ oge, ị ga-ahụta na mkpisi aka onye nọ na ihe ngosị ahụ karịrị ise.
5. Olu nwere ka ọ dị: Ụfọdụ ihe ngosị AI na-eji olu onye ha chọrọ ịjịje emeputa ihe ngosị ha. Mana ị gee ntị ọfụma, ị ga-ahụta ihe na-atụ aka ná nya bụ ihe ngosi bụ nke ejiri AI nwogharia. Olu onye na-ekwu okwu ga-adị ka ọ bụ olu mashin. Ikuku ume onye ahụ agaghị adị ka nke mmadụ. Oge ụfọdụ, olu ahụ agaghị egosị ebe onye ahụ nọ. Ịma atụ, ọ na-ada ka onye ahụ ọ nọ n’ụlọ, mana onye ahụ nọ n’ézí.
6. Ndabere na-agbanwe kwa mgbe: Ọ na-ara AI ahụ inwe ótù ndabere. Dịka ndị mmadụ na agagharị, ị ga-ahụta ka ihe dịka oche, ahụ aja, maọbụ ihe nọ n’ihe ngosị ahụ na-agbanwe.
7. Mgbanwe ákwà: Íhé ngosị AI na-enwekarị nsogbu inwe otu akwa, na ọ́là ntị maọbụ ihe olu. Dịka onye ahụ na-agagharị, akwa ya nwere ike ịgbanwe. I nwere ike ịhụta ka ọla ntị onye ahụ gbanwere, tinyere ugogbe anya onye ahụ anaghị enwe inyinyoro ọbụla.
Dịka ihe ngosị ejiri AI nwogharịa na arazi ahụ ịmata, ọtụtụ webusitị dịka InVID na Deepware Scanner na-enye aka ịmata ihe ngosị ndị dị otu a.