Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n’ise (25 commissioners) na ndị ọrụ gọọmenti ndị ọzọ ọrụ maka na ha jụrụ ịbịa mmemme ncheta ọmụmụ nwa ya.
Ozi a nke asafe Igbo History & Facts bipụtara na X enwetala nkiri otu narị na iri na isaa (117k views), nkwenye otu puku na ụma narị atọ (1.3k likes), nkesa narị asaa na iri n’asaa (777 reposts), na ntụnye ọnụ narị ise n’ise (505 comments).
Ejikwara ihe ngosị ebe Nwifuru na nwunye ya na nwa ya nwanyị nọkọtara ọnụ were bipụta nya bụ ozị. Anyị hụtara ozi ahụ ka e bipụtara ya ebe a, ebe a, n’ebe a.
N’ụbọchị Tuesday, Nwifuru kwụsịrị ndị kọmịshọna ya dị iri abụọ n’ise, ndị ọrụ ógó dị elu iri n’anọ, ndị special assistant iri abụọ n’anọ, na ndị permanent secretary iri abụọ n’abụọ n’ọrụ maka na ha abịaghị mmeme dị mkpa.
Nwifuru kwuru na ndị ọrụ a ga-akwụsị ọrụ otu ọnwa, n’enweghị ụgwọ ọnwa ọbụla a ga-akwụ ha, nakwa na ha agaghị abịanye aka ná akwụkwọ ọbụla n’oge ahụ.
ŃNYÒCHÁ
CableCheck nyochara asafe Facebook gọvanọ ma chọpụta na ihe ngosị ahụ ejiri bipụta ozi ahụ sitere na ụka ncheta ọmụmụ nwa ya nwanyị nke e mere n’ụbọchị Sunday, July 27— ụbọchị abụọ tupu ekwupụta nkwụsị ọrụ ndị comịshọna ahụ.
Anyị kpọturụ Monday Uzor, onye nkwuchita ọnụ Nwifuru, onye kọwara na mbipụta ahụ bụ aka ọrụ “ndị ochonganoko”.
Uzor kwuru na nkwụsị ọrụ ahụ bụ maka na ndị ọrụ ahụ abịaghị mmeme egwuregwu basic school sports competition, nké ngalaba Universal Basic Education Board (UBEC) hibere na steeti ahụ.
O Kwukwara na gọvanọ gwara Patricia Obila, osote ya, ka ọ nọchita anya ya na ọgbakọ ahụ, ma gwakwa ndị ọrụ ndị ahụ ka ha ga nonyere Obila, mana ha agaghị.
“Gọvanọ anọghị, ọ gwara osote ya ka ọ nochita anya ya na mmeme egwuregwu Basic School Sports competition nké ngala Universal Basic Education Board (UBEC) hibere. Mana ọtụtụ ndị ọrụ ahụ abịaghị,” Uzor gwara CableCheck.
“Mgbe gọvanọ nụrụ nke, ọ bịara kwụsị ha ọrụ, maka nke a abụghị mbụ ha na eme ihe dị otú a.
“Ndị na-ekesa ozi a bụ ndị ochonganoko. Ha ma nke bụ eziokwu.
“Ihe ngosi nke ha ji ekesa ozi ahụ enweghị ka o siri gbasata ozi ahụ, e sere ya na ọgbakọ naanị ezinụlọ gọvanọ gara na onwa July.”
Anyị mekwara ọchịchọ n’asafe Facebook Obila ma hụ na nya bụ mmeme UBEC bụ nke e mere n’ụbọchị iri abụọ n’ise — ụbọchị abụọ tupu e mee mmeme ncheta ọmụmụ nwa Nwifuru.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ozi na Nwifuru kwụsịrị ndị kọmịshọna na ndị ọrụ ngó ndị ọzọ ọrụ n’ihi na ha abịaghị ncheta ọmụmụ nwa ya nwanyị bụ asị.