Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.
Otu nwoke onye nta akụkọ nke na-agbasa ozi n’ụlọọrụ a kpọrọ NTV kwuru ótú a n’ime ihe ngosị nkeji iri atọ ahụ.
“Obi ha Naijiria ka ụwa niile ị zipụ ndị agha kachasị nwe ọzụzụ nchekwa nye ọbodo bụ ezi enyi ya,” ihe ngosị ahụ gosịrị ndị agha kọwara.
“Ihe a bụ njem udo, ọ bụghị ọgụ na mgba.
“Ndị agha ga esonye na ihe omume nkwado nke ehibere ịji kwalịte mmekọrịta obodo dị ịche ịche.”
Nwoke onye nta akụkọ ahụ kwụrụ na ọtụtụ ndị sị mba ofesi kwadoro nya bụ atụmatụ, ma sị n’ọbụ ezi ngosịpụta nye mba Afrịka.
Onye nta akụkọ ahụ kwuru na nya bụ ozi bụ n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa June ka ọ pụtara ihe (June 17).
Mgbe anyị dere akụkọ a, ozi ahụ enwetala nkwenye pụku atọ na ụma narị abụọ (3.2k likes), nkesa narị ise na ịsị (506 shares), ntụnye ọnụ narị anọ na iri isi n’ise (465 comments).
Ozi a na-abia n’oge nghọtaghe dị n’etiti Isreal na Iran na-arị elu, ebe ọgbaghara dị na obodo ndị ahụ na-aba ị́zù ụka nke abụọ.
Ụfọdụ obodo dịka Niajiria na ndị ndụ ha egosila mmetụta ha nye nya bụ nghọtaghe.
Mana Naijiria o tinyere ọnụ na nya bụ nghọtaghe site n’iziga ndị agha na Isreal?
ŃNYÒCHÁ
CableCheck jiri mkpụrụ okwu gbasara nya bụ ihe ngosị were mee mfokasị n’ojikọmba dịka Google na Bing, ma anyị ahụghị ozi ọbụla gbasara ya.
Onye isi obodo Naijiria, ụlọrụ nchekwa ya, na ministri na-ahụ maka nchekwa obodo ebipụtaghị ozi ọbụla gbasara nya bụ okwu.
CableCheck bịara kpọtụrụ Edward Buba, onye nkwuchita ọnụ ụlọrụ nchekwa Naijiria, ma ọ zaghị anyị.
Onweghịkwa ulo ozi ọbụla bipụtara nya bụ ozị.
Anyị hụkwara ọtụtụ ihe na-atụ aka ná nya bụ ihe ngosị bụ nke e jiri AI nwogharịa.
Na timkom timkom ise nke ihe ngosị ahụ, a hụrụ ka onye nta akụkọ ahụ onye nwere isi nkwọcha yi akwa na-acha anunu-anunu (blue).
Na timkom ikom ikpeazụ nke ihe ngosị ahụ, àgwà akwa anunu-anunu ya bịara gbajie nke ụkwụ, anyị hutakwara na oyizi akwa olu ụmụ nwoke, ebe ntutu biaziri dị ya n’ị́sị́.
Olu ya na-ada osiso, dịka olu mashin nke bụ ihe ndị ejiri mara ngwogharị AI.
N’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa June, Niajiria zipụrụ ndị agha ya ruru otu narị na iri itoolu n’asaa (197) gawa na ngalaba ECOWAS nke dị na Gambia.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Onweghị ihe aka ebe na-ekwu na Naijiria zipụrụ ndị agha maka nkwado udo n’obodo Isreal.