Ngalaba Nigeria Customs Service (NCS) ebiputala ozi gbasara ihe ngosị ebe onye ọrụ ha bara na nsogbu maka ịgbagbu ótù nwoke.
Ihe ngosị a pụtara ìhè na soshal mịdia n’ụbọchị Tuesdea, dịka ótù onye na Facebook bipụtara ya, ma kwuo na o mere n’ụbọchị ahụ.
“Onye ọrụ ngalaba Customs n’okporo ụzọ siri Lagos gawa Benin Expressway gbagburu onye si njem n’ihi na o kweghị enye ya ego aka azụ puku naira ise (N5,000),” isi okwu sochiri ihe ngosị ahụ kwuru.
“Ndị njem ahụ si mba US and UK na-aga Benin.
“Ihe a mere taa, ụbọchị atọ nke ọnwa June nke afọ 2025. Biko kesaa ya ka o rute ndị nọ n’ọchịchị. Gịnị ka obodo na-achọzi ịbụ?”
N’ime nya bụ ihe ngosị, a nụrụ ka otu nwanyị na-eti mkpụ ma na-ebo onye ọrụ Customs áhụ̀ ebubo na ọ gbagbụrụ mmadụ n’ihi ego akazụ N5,000.
Nwanyị ahụ kwuru ihe ndị a na asụsụ Pidgin English.
A hụkwara ka onye njem ahụ na-àkụ́ onye ọrụ Customs ihe, ebe ózú nwoke e gburu tọgbọ n’ala.
CUSTOMS KWÙRÙ NÀ ÍHÉ ŃGÓSỊ́ ÁHỤ̀ DỊ̀ ÓCHÍÈ
Na mbiputa nke Abdullahi Maiwada, onye nkwuchita ọnụ Customs, o kwuru na nya bụ ihe mere n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2019.
Ozi a bụ nke ebiputara n’aha Bashir Adeniyi, onye comptroller-general nke Customs.
Maiwada kwuru na ihe ahụ mere na okporo ụzọ Shagamu Interchange na Ogun steeti, ma gbakwunye n’ụlọọrụ Customs lebara anya na nya bụ mgberede mgbe o mere.
“Anyị biputara ozi mgbe ihe ahụ mere, anyị hiberekwara òtù ga-enyocha ihe mere n’ụbọchị ahụ ọfụma,”Maiwada kwuru.
“Ka nke a gachara, ntaramahụhụ ruru onye ọrụ ahụ bụ nke e nyere ya, nke gụnyere ịchụ ya n’ọrụ.
“Ọdị mkpa ikwu ọzọ na Customs bụ ụlọrụ gọọmentị nke nwere iwu ndị ọrụ ya kwesịrị iso, dịka nke a, ọ naghị akwado àgwà n’ezighi ezi nke ndị ọrụ ya.
“N’agbanyeghị na ihe ngosị ahụ pụtakwara ihe ọzọ, e kpebiela nya bụ okwu, ma nyekwa onye uwe ojii ahụ ntaram’ahụhụ ruru ya.
Maiwada gwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ikesa ozị n’ezighi-ezi, kama ka ha chọpụta nke bụ eziokwu site n’ụlọọrụ Customs.
TheCable chọpụtakwara ụfọdụ ozi gbasara mgberede ahụ nke ebiputagasịrị n’afo 2019.
Dịka ozi ahụ kwuru, Customs gonaghiri na onye ọrụ ya ahụ yọrọ akazụ.
Customs kwuru na onye ahụ e gburu bụ nwa afọ Nigeria onye na-agara ndị ọrụ NCS ozi, ma si na ọ bụghị onye si njem dịka ihe ngosị ahụ kwụrụ.
Mgbe ahụ, NCS kwuru na ọ bụ amaghị-ama ka onye ọrụ Customs ahu jiri gbagbuo nwoke ahu.