Ótù asafe na TikTok bụ @panafrica069 ebipụtala ihe onyonyo na-ekwu na Ibrahim Traore, onye isi ndị agha mịlịtrị na-achị obodo Burkina Faso, kagburu ndị mmadụ bi n’obodo ahụ ịkwụ ụtụ.
N’ime ihe onyonyo ahụ ebiputara na TikTok n’ụbọchị mbụ nke ọnwa April, a nụrụ ka otu olu na-ekwu na Traore agbanwela Burkina Faso ka ọ bụrụ òbòdò mbụ na Afrịka nke anaghị ana ụtụ.
Ihe ngosị a nke isiokwu ya bụ “Traore ekwupụtala Burkina Faso Dịka òbòdò anaghị ana ụtụ” bụ nke e kesagoro ihe karịrị ugbọrọ puku asaa (7,000 shares), ma nwetakwa nkwenye iri abụọ n’itoolu (29,000 likes) na ntụnye ọnụ puku abụọ (2,000 comments).
N’ime ihe ngosị ahụ, otu onye nta akụkọ ejiri ngwa ọrụ AI mepụta ka a hụtara ka ọ na-agụpụta nya bụ ozi, ebe ótù olu n’okpuru gara n’ihu na-ekwu, dịka ọtụtụ ihe ngosị ndị ọzọ na-egosi na ihe onyonyo ahụ.
Ozi ahụ kwukwara na Elon Musk, onye nwe ọba ozịi X, na-akwado iwebata uloọrụ ya na obodo ahụ n’ihi iwu ụtụ nke Burkina Faso.
Ozị ahụ kwukwara na obodo ndị ọcha na-akwado ntaramahụhụ nye Burkina Faso iji kwụsị nya bụ atụmatụ.
Otu asafe a na TikTok biputakwara atụmatụ ọchịchị aka ike nke Traore ekwupụtabeghị.
Kamgbe Traore were oche dịka onye isi obodo Burkina Faso n’ọnwa Septemba nke afọ 2022, ọtụtụ ihe ngosị e jiri AI mepụta apụtala ihe na soshal media, iji gosị ọchịchị ya n’ụdị dị mma.
Iwu nke onye isi obodo ahụ ekwuputaghị bụ nke ndị mmadụ kwuru na o kwuputara. Ndị nnyocha okwu kwụru na ọ bụ aka ọrụ ndị si mba Russia nọ na ogige ahụ.
ŃNYÒCHÁ
Ótù akụkụ na nya bụ ihe ngosị si TikTok gosịrị Traore ebe o na-ekwu okwu na ọgbakọ. CableCheck jiri ígwè Google Lens were nyocha nya bụ ihe ngosị ma chọpụta n’otu ozi ahụ bụ nke si na webusite Africa24TV.
Ihe ngosị ebe Traore na-ekwu okwu na ọgbakọ Academic Excellence Day bụ́ ńké é jiri wee sochie okwu ahụ nke na-ekwu na onye isi obodo ahụ ekwupụtala iwu na-akagbu ina ụtụ n’obodo ahụ.
Na ọgbakọ Academic Excellence Day ahụ, Traore ekwughị ihe ọbụla gbasara ụtụ, kama ọ kelere ndị nkuzi maka ọrụ ha na ịhụnanya ha nye Burkina Faso.

CableCheck nyochakwara ụlọ ozi nke obodo ahụ nakwa asafe soshal mịdia ndị isi ọchịchị na Burkina Faso, ma onweghị nke gosịrị ebe Traore kwupụtara nkagbụ ịna ụtụ n’obodo ahụ.

N’ọnwa Decemba nke afọ 2024, ụlọ omeiwu nke obodo ahụ kwadoro iwu ego nke Burkina Faso. Obodo ahụ nwere ọtụtụ iwu gbasara ụtụ nke a na-atụgharị uche ma ga-akwado n’ụlọ omeiwu ha. Otu n’ime iwu ndịa bụ na site n’ọnwa Januwari nke afọ 2025, ndị niile n’ere ihe na webusite ọbụla ga-akwụ ụtụ tax.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ihe onyonyo na-ekwu na Traore kagburu ịkwụ ụtụ tax na Burkina Faso bụ nke aka ọrụ AI.