TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Naijiria ọ̀ nwè ọ́kwá ìsíì màkà ọ́dàchí ígbu ònwé?
Share
Latest News
FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?
FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?
FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015
Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé
Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu
A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba
FACT CHECK: No, Pope Leo didn’t ask Tinubu to release Nnamdi Kanu
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Naijiria ọ̀ nwè ọ́kwá ìsíì màkà ọ́dàchí ígbu ònwé?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 23, 2024 6 Min Read
Share

Adesanmi Akinsulore, onye ọ̀kà nkuzi na-ahụ maka ọrịa uche n’ụlọ ọgwụ nkụzi dị na mahadum Obafemi Awolowo University na Ile-Ife, kwuru na Naijiria nwe ọkwa isii n’ọnụ ọgụgụ obodo ebe ndị mmadụ na-ewere ndụ nke ha.

Site na mbipụta PUNCH, Akinsulore kwuru nke a na nkụzi nke ụlọrụ akpọrọ The Still Waters Mental Health Foundation. É hibere nkụzi a na mahadum Ladoke Akintola University of Technology, Ogbomoso, dị na Oyo steeti.

O kwuru na ọ dị mkpa ka ọha jikọta aka ọnụ were leba ányá n’ọdachi igbu onwe, ọkachasị ka o si emetụta ụmụ akwụkwọ.

“A na enwe ótù ọnọdụ mmadụ iwere ndụ ya n’ime mmadụ iri abụọ n’ise (25) chere uche igbu onwe ha. Na afọ 2021, mmadụ iwe ndụ nke ya bụ ihe kpatara ọnwụ ndị agbara afọ iri na ise na afo iri abụọ n’itolu (15 to 29 years) n’ụwa niile,” Akinsulore kwuru.

“Ịmemila nya bụ ọnọdụ kwesịrị ịbụ ihe aga-abiakota ọnụ mee, iji kepụta ọnodu n’akwado ọdịmma nke ụmụ akwụkwọ.”

ḾGBÁRÌ ÁKỤ́KỌ́

Dịka ụlọrụ n’ahụ maka ahụike nke ụwa niile bụ World Health Organisation (WHO) kwuru, ihe karịrị mmadụ puku narị asaa (700,000) nwụrụ site n’iwe ndụ nke ha kwa afọ, nke pụtara ìhè site na ncheputa ịgbụ onwe ha ruru iri abụọ (20) kwa ọnwụ ọbụla.

Ụlọrụ a kwụrụ na mmadụ iwe ndụ ya bụ ihe n’ebute ọnwụ ụmụ nwoke na nwaanyị ndị dị n’etiti afọ iri na ise ruo afọ iri abụọ n’itolu (15 — 29 years) n’ụwa niile, ma gbakwunye na percentị iri asaa na atọ (73%) nke ọnwụ mmadụ jiri aka ya nwụọ na-emekarị n’obodo ndị n’emepe-emepe.

Ihe n’emekarị ka mmadụ were ndụ nke ya n’abukari maka oke nchegbu bekee
Kpọrọ depression, ịṅụ óké mmanya na-aba n’anya, ọnwụ mmadụ, mmadụ ibi naanị ya, ịkpa mmadụ ókè, nghọtaghe di etiti nwoke na nwaanyị, ụkọ ego, ọrịa, mmekpa ahụ, ya na ihe mberede ndị ọzọ.

Enwela akụkọ mmadụ iwere ndụ ya na Naịjiria na nso-nso a.

N’ọnwa Ọktoba, Omolayo Bamidele, otu nwoke gbara afọ iri ise n’asaa, ka e kwuru n’owerere ndụ nke ya n’obodo Igburowo nke dị na Odigbo LGA na Ondo steeti.

Ndị obodo ahụ kwuru na ha hụrụ ózú Bamidele na n’okporo ụzọ ebe otu botulu dịka kemical bekee kporo Snipper nọ n’akụkụ ya.

N’ọnwa Septemba, Gabriel Magaji, onye dị afọ iri atọ n’asaa nke obodo Masaka na Karu LGA nke Nasarawa steeti, gburuonwe ya n’ihi akụkụ na nwunye na-agba n’ezi.

NAIJIRIA Ọ̀ BỤ̀ Ị́SỊ́Ị́ N’Ọ́NỤ́Ọ́GỤ́GỤ́ ÒBÒDÒ N’ÉWÉRÉ NDỤ̀ ÓNWÉ HÁ?

CableCheck kpoturu Akinsulore ịmata ebe o si nweta ọnụogugu ọ kporo, mana o kweghị agwa anyị ebe ọ sịrị nweta nya bụ ozi.

K’osiladi, nyocha CableCheck mere site na ngalaba nyocha ha bụ CableCheck gosiri na dịka ozi WHO pibutara, n’ubochi asaato nke onwa January nke afọ 2024, kwuru na Naijiria bụ obodo otu narị na iri ise n’asaa (157) n’obodo ndị mmadụ n’éwere ndụ̀ onwe ha, nke nwere ndị gbugoro onwe ha di atọ n’uma ise kwa otu puku narị mmadụ (3.5 suicides per 100,000 people).

Obodo no isi nya bụ ọnụogugu bụ Lesotho, ńké nwere ọnụogugu mmadụ were ndụ̀ ha dị iri asaa n’uma anọ kwa otu puku narị mmadu (72.4 suicides per 100,000 people), obodo Guyana nke nwere ọnụgugu mmadu iri anọ n’uma ato kwa otu puku narị mmadu (40.3 suicides per 100,000 people), obodo Eswatini ńké nwere ọnwụ dị iri abụọ n’uma anọ kwa otu puku narị mmadu (29.4 suicides per 100,000 people), Republic of Korea nwere iri ábụ́ọ́ n’asaato n’uma isii kwa otu puku narị mmadu (28.6 suicides per 100,000 people), Kiribati nwere iri ábụ́ọ́ n’uma ato kwa otu puku narị mmadu (28.3 suicides per 100,000 people), ebe Micronesia nwere iri abụọ n’asaato n’uma abụọ kwa otu puku narị mmadu (28.2 suicides per 100,000 people).

Ndị ọzọ bu Lithuania nke nwere iri abụọ n’isii n’uma otu kwa otu puku narị mmadu(26.1 suicides per 100,000 people), Suriname ńké nwere iri ábụ́ọ́ n’ise n’uma ano kwa otu puku narị mmadu (25.4 suicides per 100,000 people), Russian Federation nwere iri abụọ m’ise n’uma otu kwa otu puku narị mmadu (25.1 suicides per 100,000 people), ebe South Africa nwere iri abụọ n’atọ n’uma ise kwa otu puku narị mmadu (23.5 suicides per 100,000 people).

Ozi ahụ kwuru na Micronesia bu ya bụ òbòdò isii nwere onwu mmadụ nke onye ahụ jiri aka ya were ndụ ya.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Niajiria abụghị isii n’obodo ebe ndị mmadụ na-ewere ndụ nke ha.

TAGGED: Igbo factcheck in igbo, news in Igbo, Suicide in Nigeria

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 23, 2024 December 23, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?

A viral X post claims that Nigeria’s new national anthem was not recited during the…

June 13, 2025

FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?

Reports of a military coup in Cameroon ousting President Paul Biya have gone viral on…

June 13, 2025

FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015

On June 8, Ali Ndume, senator representing Borno south, claimed that 22 governors elected on…

June 10, 2025

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert…

June 10, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert Francis Prevost, Pope Leo XIV…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu

One Facebook user claim sey Pope Leo XVI and oda bishops join mouth beg President Bola Tinubu to release Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba

Wani mai amfani da Facebook ya yi ikirarin cewa Paparoma Leo na 16 da wasu limaman coci sun roki shugaban…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?