TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: È kèwàrà Oyo steeti ụ́zọ̀ àbụ̀ọ́?
Share
Latest News
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?
FACT CHECK: Did Nigeria halt ‘mineral deal’ with US after visa restrictions?
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

È kèwàrà Oyo steeti ụ́zọ̀ àbụ̀ọ́?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published November 2, 2024 3 Min Read
Share

Ótù onye na TikTok ekwuola na atụmatụ ikewa Oyo steeti ụzọ abụọ abụrụla iwu.

Na ihe nkiri otu nkeji na tinkom tinkom iri atọ n’ise, asafe ahụ na TikTok bụ –@Eddieblisshotline– kwuru na e keputala steeti ọhụrụ n’ime Oyo.

Ihe nkiri ahụ enwetala nkwenye karịrị puku iri anọ n’itoolu na narị itoolu (46.9K likes), ntụnye ọnụ puku atọ na narị asaa n’iri atọ n’ise (3,735 comments), ya na nkesa puku isii na otu narị n’ịrị atọ n’itoolu (6,139 shares) na TikTok.

Onye a gara n’ihu kwuo na Ibadan nke bụ isi steetị Oyo ga-abụzi steeti nọrọ ọnwe ya ma nwee Ibadan Town dịka isi obodo.

Ọ gwara ndị steeti ahụ ka ha gbaa mbọ mata steeti ebe ha ga eso n’ihi nkewa ahụ.

“Ozi mberede; e kewaa Oyo steetị ụzọ abụọ. Ị ma na Ibadan bụ isi obodo steeti Oyo. Ugbu a, ha n’ekwu na Oyo ga-abu steeti, ebe Oyo town ga-abụzi isi obodo Oyo steetị,” onye a kwụrụ.

“Ótù ụzọ a ka a ga-esi nwe Ibadan nke bụ isi obodo Oyo, ọ ga-abiazị bụrụ steeti nọrọ ọnwe ya, ebe Ibadan town ga-abụzi isi obodo nya bụ steetị.”

@edyblisshotline Reps splits Oyo State into 2. #nigerian #endbadgovernanceinnigeria ♬ original sound – Eddie Bliss🎧💎

E kesala ozi dị ka nke a na Instagram nakwa Facebook.

È KÉPÙTÁLÁ STEETI ỌZỌ N’ÍMÉ OYO?

N’ụbọchị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa October, atụmatụ iwu ikepụta steeti ọzọ n’ime steeti Oyo gafere ngụpụta nke abụọ n’ụlọ omeiwu Naijiria bụ house of representatives.

Atụmatụ iwu a nke Akeem Adeyemi, onye nnọchiteanya Oyo federal constituency n’ụlọ omeiwu house of representatives, chọrọ ka enwogharịa iwu ala Naijiria nke afọ 1999, site na nkewapụta steeti ọhụrụ a.

Adeyemi kwuru na nkewapụta steeti ahụ bịara dị mkpa n’ihi nnukwu obosara ala nke steeti ahụ nwere, nke ọ si n’ọbụ ya kachasị na south-west, nke nwere LGA iri atọ n’ato, ya na ọnụọgụgụ mmadụ dị nde ise, puku narị ise na iri asatọ, narị asatọ na iri itoolu n’anọ (5,580,894 people) na ọnụọgụgụ census afọ 2006.

Tupu atụmatụ ịwụ ọbụla abụrụ iwu, ọ ga-agafe ngụpụta atọ na ụlọ omeiwu senate na house of representatives, ya na ntụnye ndị mmadụ nwere mmasị na ya bụ iwu.

Ọ bụrụ na e mezuo ihe ndị a, a ga-abịazie wegara ya onye isi ala ka ọ bịanye aka na nkweta maọbụ ọ̀jụ́jụ́.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na e keputala steeti ọhụrụ na Oyo bụ àsị́.

TAGGED: Bill to split Oyo state into two, fact check in Igbo, news in Igbo, Oyo state

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu November 2, 2024 November 2, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị…

July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé…

July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by…

July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani…

July 18, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé orílẹ̀ èdè Nàìjíríà hùwà sí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by stopping one alleged mineral deal…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani ne kan takunkumin da Amurka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?