TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Tinubu ọ̀ jụ̀rụ̀ ị́bànyè nà ńkwékọ́rị́tá ùdó 2023 dị́kà Kukah kwùrù?
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Tinubu ọ̀ jụ̀rụ̀ ị́bànyè nà ńkwékọ́rị́tá ùdó 2023 dị́kà Kukah kwùrù?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 24, 2024 4 Min Read
Share

Matthew Kukah, Bishop ụlọ ụka Katọlik nke diocezi Sokoto, ekwuola na onye isi ala Bola Tinubu abanyeghị na nkwekọrịta udo n’oge ntuliaka onye isi ala nke afọ 2023.

Kukah kwuru nke a na Sọnde, n’oge nzukọ nchekwa nke ntuliaka Edo steeti na Benin.

“Ihe ọzọ gbara m gharị bụ na onye bụ onye isi ala ugbu a, mgbe ọ na-azọ ọkwa onye isi ala, abanyeghị na nkwekọrịta udo. Osighị anyị n’aka na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ ejighị ya megide ya oge ahụ,” Bishop a kwuru.

Nkwupụta Bishop Katọlik a enwetala ọtụtụ ntụnye ọnụ, ébé ụfọdụ ndị Naijiria na-ajụ ajụjụ banyere ntụkwasị obi nkwupụta a.

ḾBÌÀNYÉ ÁKÁ ÙDÓ NÀ NAIJIRIA

N’ihi ọtụtụ ihe mere tupu eme ntuliaka nke afọ 2015, a hụrụ mkpa ọ dị ihibe ngalaba National Peace Committee (NPC) n’afọ 2014, iji hụ na e nwere ntuliaka nwere udo na ntụkwasị obi na Naijiria.

Ngalaba a, nke Abdulsalami Abubakar, onye bụburu onye isi ala Naijiria, nọ n’isi ya, emeela ọtụtụ mbịanye aka udo maka ndị na-azọ ọkwa n’ógó steeti na nke ọchịchị etiti.

N’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Septemba, ndị bi na Edo steeti ga-atụ vootu ha iji họrọ onye ndu ha.

K’osiladị, e nwere nchegbu gbasara udo na nchekwa nke ndị na-atụ votuu, n’ihi ọ̀jụ́jụ́ òtù Peoples Democratic Party (PDP) jụrụ ịbanye na nkwekọrịta udo na steeti ahụ.

PDP kwuru na mkpebi ha sitere na enweghị ntụkwasị obi n’ebe ndị uwe ojii nọ.

Godwin Obaseki, onye gọvanọ nke Edo, kwuputara na ndị uwe ojii na-akwado parti All Progressives Congress (APC), nke ọ sịrị na ọ pụtara ihe mgbe a kpochiri mmadu iri nke PDP, ndị o kwuru na-akpọchiri na-enweghị ihe ọbụla ha mere.

Na nzaghachi n’ọjụjụ PDP ịbanye na nkwekọrịta udo na ntuliaka nke Edo, Kukah kwuru na ọ bụghị oge mbụ onye na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria ga-ajụ ịbanye na nkwekọrịta udo.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

TheCable nyochara ozi nkwekọrịta udo NPC nke afọ 2023, ma chọpụta na e nwere nkwekọrịta udo abụọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị etiti, n’ihi nsonaazụ mwakpo n’ike pụtara ihe na ntuliaka gara-aga na Naijiria.

Nkwekọrịta nke mbụ bụ maka ịkwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-azo ọkwa ọchịchị n’okpuru partị ha dị iche iche, ịkwado ebumnuche ha n’atụmatụ mgbasa ozi nke partị ha, kama ịgbasa ozi na okwu ịkpa ókè. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile nke afọ ahụ banyere na nkwekọrịta ahụ n’ụbọchị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa Septemba nke afọ 2022.

Ndị na-azọ okwa onye isi ala n’afọ 2023 gbakọrọ na International Conference Centre dị na Abuja iji banye na nkwekọrịta udo maka ịnwe ntuliaka aka n’enweghị nrụrụ áká ọbụla.

Peter Obi, onye ji Labour Party (LP) azọ ọkwa onyeisi ala; Atiku Abubakar, nke PDP; Rabiu Kwankwaso, nke New Nigeria Peoples Party (NNPP); na Omoyele Sowore, nke African Action Congress (AAC) nọ na mmemme ahụ, ma Tinubu, onye e kwuru na ọ nọ n’obodo United Kingdom, abịaghị nya bụ mbianye aka.

Mana Kashim Shettima, osote ya, nọchiritere anya ya n’ụbọchị ahụ.

Ụfọdụ mgbasa ozi ndị ọzọ kwuputakwara mbianye aka udo mbụ a n’afo 2022, dịka a hụrụ ebe a, ebe a na ebe a.

Nkwekọrịta nke abụọ, nke a banyere n’ubochi iri abụọ n’atọ nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2023, bụ maka ndị na-azọ ọkwa onye isi ala ịkweta ịnabata nsonaazu nke ntuliaka ahụ.

Tinubu nọ na ịdebanye aha nke nkwekọrịta nke abụọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Site n’ihe aka ebe anyị nwetagasịrị, okwu Kukah na Tinubu abịanyeghị aka na nkwekọrịta udo nke ntuliaka afọ 2023 abụghị eziokwu.

TAGGED: Matthew Kukah, peace accord

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 24, 2024 September 24, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?