TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: È képùtálá stéétì ọ́hụ́rụ nà south-east?
Share
Latest News
DISINFO ALERT: This YouTube channel regularly publishes false claims about Nigerian celebrities
Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari
Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó
Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform
AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan
DISINFO ALERT: Obi dismisses photoshopped pictures with Donald Trump, MC Oluomo
FACT CHECK: AI-edited video of Peter Obi used to advertise investment platform
Mbà, á gághị̀ ágbáchị́bị́dó ákántụ̀ ńdị́ Naijiria n’énwéghị́ TIN sị́té Jánúwarị́ 2026
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

È képùtálá stéétì ọ́hụ́rụ nà south-east?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 5, 2024 3 Min Read
Share

Ótù ihe nkiri na TikTok ekwuola na e keputala steeti ọhụrụ na south-east nke Niajiria.

Ihe ngosị nkeji anọ a, n’asụsụ Igbo, e nwetala nkiri karịrị puku abụọ na iri ise n’asaa (2,057), nkesa puku atọ narị asaatọ n’iri asatọ n’itoolu (3,889).

Dịka ihe nkiri ahụ nke @marachi biputara kwuru, Naijiria nwere steeti iri atọ n’asaa.

Ọ gara n’ihu gụpụta steeti ndị nya bụ nkepụta metụtara.

“Ụnu ọ mụkwa anya? Ozi a maka ịkepụta steeti ọhụrụ nke na-ekwu n’anyi nwe ziri steeti iri atọ n’asaa n’abụghị iri atọ n’isii tinyere isi ala bụ Abuja.

“Nya bụ na e keputala steeti ọhụrụ, Maka ndị n’aghọtaghị oyibo ka m sụọ ya na Igbo, e kepụta steeti ọhụrụ,” o kwuru.

“E keputala ya site n’ufọdụ akụkụ Abia, Imo na Anambra steeti.

“Ọ bụrụ n’ịbu onye Anambra, lee anya n’akụkụ gị ka ị mata ma obodo gị o so ná steeti ọhụrụ a.

“Obodo ndị dịka Ihiala, Uli, Ọzụbụlụ, Akokwa, Ụmụchụ, Ụmụnze, Ụmụakụ, Nwangele, Nkwere, New Ideato North, Nwabosi West, Alaọma, Owerrebiri, Oguta, Isu, Arọndịzuogụ, Ideatọ north, Ideatọ south, Njaba, Oru east, Orsu.”

E kesakwala nya bu ihe nkiri na X nakwa Facebook.

MÀNÀ È KÉPỤ̀TÁLÁ STÉÈTÌ ORLU NÀ SOUTH-EAST?

N’ụbọchị ise nke ọnwa June, atụmatụ ịwụ na-achọ nkwado nke nkepụta steeti ọhụrụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Niajiria, gafere ngụpụta nke mbụ n’ụlọ omeiwu bụ house of representatives.

Iwu a, nke Ikenga Ugochinyere, onye na-anọchite anya ndị Ideato north na south n’ụlọ ome ịwụ Niajiria, chọrọ ka e kepụta steeti ọhụrụ na mpaghara ahụ.

A ga-ekeputa nya bụ steeti site na steeti Imo, Anambra, na Abia dịka iwu a depụtara.

N’ime mpaghara isii e nwere na Niajiria, south-east nwere naanị steeti ise, mpaghara ndị ọzọ nwere steeti isii, ebe mpaghara north-west nwere steeti asaa.

Dịka obodo nwere ụlọ omeiwu abụọ nke ndị oyibo kpọrọ bi-cameral legislature, atụmatụ ọbụla chọrọ ime ka ọ buru iwu ga-agafe ụlọ omeiwu abụọ ndị a.

Nya bụ atụmatụ iwu ga-agafe ngụpụta atọ n’ụlọ omeiwu abụọ a, nya na ntụnye ọnụ ndị Niajiria chere na iwu ahụ metụtara ha.

Ka ụlọ omeiwu abụọ ndị a nabatachara iwu ahụ, a ga-ewegazi ya ka onye isi ala bịanye aka ná nkwado nya bụ iwu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na e keputala steeti ọhụrụ na south-east bụ asị.

Atụmatụ iwu a bụ naanị ngụpụta nke mbụ ka ọ gafebere n’ụlọ omeiwu — nke bụ usoro mbụ atụmatụ ọbụla na-agafe tupu a nabata ya dịka iwu.

TAGGED: igbo cable factcheck, igbo news, new state creation, Orlu state, southeast

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 5, 2024 July 5, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

DISINFO ALERT: This YouTube channel regularly publishes false claims about Nigerian celebrities

A YouTube page identified as Nigerian News is home to several videos containing false claims…

September 28, 2025

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a…

September 24, 2025

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na…

September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for…

September 24, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a zaben 2023, yana tallata wani…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na 2023, na-ágwá ndị mmadụ ka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for di 2023 elections, dey allegedly…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan

Fídíò kan tí ó ní Peter Obi, olùdíje fún ipò Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà nínú ẹgbẹ́ òsèlú Labour Party (LP)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?