TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Hushpuppi ọ̀ pụ̀tágó nà ǹgá?
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Hushpuppi ọ̀ pụ̀tágó nà ǹgá?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 8, 2023 4 Min Read
Share

Ótù ihe ńkírí á hụtara n’ọba ozi soshal midia ekwuola na Ramon Abbas, onye ụwa màrà dịka Hushpuppi, apụtala n’ụlọ ǹgá.

Ihe onyonyo à enwetala nkiri karịrị ótù nde na puku narị itoolu, nkesa puku abụọ na narị anọ, ntụnye ọnụ narị itoolu na iri ise na asaa, ya na mmasị puku asaa, n’ọ́bá ozi X, nke bụbu Twitter.

Isi okwu ihe ngosị à, nke onye ákàrà asafe yá bụ @praiseoghre dere, kwùrù: “Hushpuppi apụtana nga, k’anyị chekwube na ọ mụtala ihe síté na mmehe ya.”

N’ime ihe ngosị ahụ, ahụrụ kà ndị mmadụ dịka ha abụ ndị òtù ya na-anabata ma na-ekele Hushpuppi n’ọ́dụ̀ ụgbọelu, ebe ó bù akpa n’aka ya.

Ọtụtụ mmadụ pụtara n’ihe ngosị ahụ jì ekwentị ha ésèré Huspuppi onyonyo.

Hushpuppi’s been released from jail, let’s hope he has learnt from his mistakes 🙏🏾 pic.twitter.com/AtB6bdtMr0

— 🅱️abygirl4️⃣life🔱🔱 (@praiseoghre) November 30, 2023

Ihe ngosị à àgbágó n’asafe dị iche iche n’ọba ozi Facebook, ebe ọtụtụ mmadụ na-akọwa nà Huspuppi apụtago nga.

ÒNYÉ BỤ̀ HUSHPUPPI?

Hushpuppi bụ onye amara amara n’ọba ọzị nà ojikọmba Naijiria, nke ndị bèkéè na-akpọ internet. Á tụ̀rụ̀ ya nga afọ iri na otu na mba United States of America (USA) màkà mpụ “igwu ndị mba òfèsì wàyó”.

Ásị̀rị̀ na ó mere mpụ dịka ịkpata ego n’ụzọ n’ezighị ezi, igwu ụlọ akụ wayo, ya na izunarị njirimara mmadụ ruru ótù ijeri Dirham na ụma nde narị isii (atụmatụ ego ruru otu ijeri narị na iri isii n’asatọ).

N’ọnwa June 2020, ndị uweojii mba US bụ́ Federal Bureau of Investigations (FBI) jiri njirimara Google yá chọta mà kpọchie ya na ala Dubai nke obodo United Arab Emirates (UAE).

Otis D. Wright II, onye ọkaikpe mba US, màrà Huspuppi ikpe dịka ésì Dubia webata ikpe ya USA n’ọnwa Julaị n’afọ 2020.

Wright nyere iwu kà ọ kwụghachie dollar otu pụku nde, narị pụku asaa na iri atọ n’abuọ na narị asatọ na iri anọ n’otu ($1,732,841) nye mmadụ abụọ ó gwuru wayo. Nke a bụ dịka Hushpuppi kwetara na sọsọ otu ebubo nà ó sonyere n’ịkpata ego n’ụzọ n’ezighi ezi.

ŃNYÒCHÁ

Anyị jiri isi okwu mee nnyocha, nke gosịrị na nya bụ ihe nkiri bụ nke iLiteTV bipụtara na YouTube n’afọ 2018, mgbe Hushpuppi mere ncheta ọmụmụ ya na Cyprus.

Ihe ngosị ahụ pụtakwara ọzọ na YouTube n’afọ 2020, dịka akpọchịchara ya, na-ekwu na nya bụ Huspuppi apụtala na ǹgá.

Iji mátá ebe Hushpuppi nọ̀, TheCable lèrè anya n’akwụkwọ ndekọ áhà ndị ome mpụ niile nọ na nga US, Federal Bureau of Prisons.

Nya bụ akwụkwọ ndekọ aha ndị mere mpụ nwere ọtụtụ ozi dịka aha, afọ ọmụmụ, ébé na mgbe ndị akpọchiri na nga ga-apụta.

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na Hushpuppi nọ n’ụlọ nga Fort Dix Federal Correctional Institution. Há dèrè na ụbọchị mpụta ya ga-abụ n’ọnwa April nke afọ 2019.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ ÓKWU

Okwu na Huspuppi apụtala na nga bụ asị. Ihe ngosị ahụ na-ekwu na ọ pụtara na nga bụ ihe nkiri ochie kamgbe afọ 2018.

Dịka ihe ndị anyị hụtara n’akwụkwọ ndị nọ n’ụlọ nga US Federal Bureau of Prisons, Hushpuppi kà nọ na nga na-eme nga afọ iri na otu.

TAGGED: FDCI, HushPuppi, Igbo Factcheck

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 8, 2023 December 8, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?