TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Timipre Sylva ò kèlèrè Douye Diri kà á zọ̀chàrà ọ́kwá gọ́vanọ̀ nà stéeti Bayelsa
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Timipre Sylva ò kèlèrè Douye Diri kà á zọ̀chàrà ọ́kwá gọ́vanọ̀ nà stéeti Bayelsa

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published November 26, 2023 5 Min Read
Share

Íhé ngosị ébé Timipre Sylva, onye bụbu minista na-ahụ màkà mmanụ petrol nà steeti Bayelsa, na-ekwe Douye Diri, gọvanọ Bayelsa, n’aka apụtala nà soshal mịdia.

Dịka ndị bipụtara ya bụ ihe ngosị sìrì kọwa, Sylva na-ekele Diri, kà Diri meriri nà ntuli aka há mere nà Bayelsa n’ụbọchị Saturday.

Diri, onye zọrọ ọchịchị n’okpuru òtù People’s Democratic Party (PDP), nwetara votu puku ótù narị n’iri asaa n’ise nà ụma ótù narị n’iri itoolu na isii were merie Sylva nke All Progressive Congress (APC), onye nwetara votu puku ótù narị na iri n’ụma ótù narị na asatọ.

Ihe ngosị à bịara nwee ọtụtụ ntụnye ọnụ na soshal mịdia, ọkachasị nà X, ebe ó nwetara nkiri na ntụnye ọnụ karịrị ótù puku.

“Chief Timipre Sylva, onye ji parti APC azọ ọkwa gọvanọ, ekelela Gov Douye Diri. Biko ánụ̀kwàlà n’agha dị n’etiti há. Kedu màkà ndị tufuru ndụ ha n’efu. Ọ dị ńwúté,” íhé à kà onye ji X ezisa ozi dere.

Chief Timipre Sylva, the candidate of APC pays congratulatory visit to Governor Douye Diri of PDP. Those who died in the course of the #BayelsaDecides2023 contest died for nothing.

Good thing is that Governor Diri will concentrate on development of the state. pic.twitter.com/gzRpRDAjuh

— Tonye Barcanista (@TonyeBarcanista) November 15, 2023

 

N’ihe ngosị à ekesara ofụma, á hụrụ Sylva kà ọ na-ekwe Diri n’aka ọfụma, dịka há nà-àkpá ńkàtá anaghị anụ ihe há na-ekwu.

Onye ọzọkwa ji X ezịsa ozị dere sị: “Chief Timipre Sylva, onye ji APC azọ ọkwa gọvanọ Bayelsa state, ékèlélá Gọvanọ Douye Diri nke parti PDP na mmeri o meriri na ntuli aka ọkwa gọvanọ. Ndị nwuru dịka a na-eme ntuliaka #BayelsaDecides2023 nwụrụ n’efu. Ihe mara mma ebe à bụ na Gọvanọ Diri ga-etinye obi na mmepe steeti Bayelsa.”

ÍHÉ Ó JÌRÌ DỊ́ ḾKPÀ ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

N’agbanyeghị na enweghị onye íro nke ebighebi nà ndọrọndọrọ ọchịchị, Sylva nà Diri ejighị anya ahụ onwe ha, kà ntuliaka okwa gọvanọ steeti Bayelsa gachara.

N’ụbọchị ntụli aka ahụ, Diri tara Sylva ụta, mà bóó ya ebubo nà ọ́ kwanyere ọ́kụ́ ọgbaghara mgbe á na-atụ votu.

“Timipre Sylva bụ onye tigbuo zọgbuo kamgbe ndụ ya n’ihe gbasara ntuliaka. Cheta nà onye ǹdú agbụrụ Ijaw, nke bụ́ Edwin Clark, dègàrà yá akwụkwọ kà ọ̀ chọghị ịhapụ iji áká íke azọ ọchịchị,” íhé à kà Diri kwùrù kà ọ́ tụchara votu ya.

“K’osiladi, Chineke nọ n’igwe. Anyị na-akwubido ajọ ụzọ ọ na-eji emeri na ntuliaka.”

N’aka nke ya, Sylva kwụrụ na PDP kpatara ọgbaghara mgbe á na-eme ya bụ ntuli aka. Ọ kọwara na “ndị nchekwa obodo na-akwụnyere ndị òtù PDP”.

“Enwere ọtụtụ ọgbahara ebe ndị PDP na-achọ ịmerụ ndị bịara ịtụ votu ahụ, sịte n’enyemaka ndị nchekwa obodo. K’ọdi ugbua, anyị kwenyere na ndị anyị na-àmá aka bụ ndị nchekwa obodo. Ọ bụzighị PDP. Mana anyị na-ebeleta ya bụ m̀pụ́” Sylva kwuru.

ŃNYÒCHÁ

TheCable nyochara ákùkù niile nke ihe nkiri ahụ, nke gosịrị nà ebe ahụtara ya m̀bụ́ bụ̀ n’otu asafe na TikTok á kpọrọ GbaramatuTV. Ihe ngosị ahụ bụ nke GbaramatuTV bipụtara n’ọnwa May 2023, afọ isii tupu emee ntuli aka Bayelsa.

Ihe ngosị ahụ bịara nwee isiokwu sonyere ya, nke gụrụ, “HE Timipre Sylva gara akwam’ozu nna Douye Diri na Sampou.”

Nna Diri, Pa Abraham, onye isi ụlọ akwụkwọ nà mbụ, nwụrụ n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Febụwarị nke afọ 2023. Ọ gbara afọ iri asatọ n’asatọ. É liri ya n’ụbọchị isii nke ọnwa May.

Asafe TikTok à bụ́ Gbaramatuvoice TV nwèrè ọtụtụ ihe ngosị mmemme, nke dịka agbam akwụkwọ ya nà ụbọchị ncheta agbama akwụkwọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ahụ dị ochie. Ọ bụghị ihe ngosị ebe Sylva na-ekele Diri màkà mmeri ya na ntuli aka gọvanọ emere nà Bayelsa.

E sere ya bụ ihe ngosi mà bipụta ya n’ọnwa May 2023, mgbe Sylva gara ị́kwàdó Diri n’ọnwu nna ya.

N’agbanyeghị na Diri kelere Sylva, maka udo á hụtara nà ntuli aka ahụ, parti APC ajụla ịnabata mmeri Diri meriri, ma gwa INEC kà ó jiri ótù izu ụka, lebanye anya na mpụta ya bụ ntuli aka.

TAGGED: Bayelsa guber, Douye Diri, Igbo, igbofactcheck, timipre sylva

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu November 26, 2023 November 26, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?