TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ònyònyò ébé ónyé ǹdú Zambia kwùrù nà ọ̀ gághị àzọ́ òchị́chị́ ọ̀zọ́ bụ̀ ákáọ́rụ AI
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ònyònyò ébé ónyé ǹdú Zambia kwùrù nà ọ̀ gághị àzọ́ òchị́chị́ ọ̀zọ́ bụ̀ ákáọ́rụ AI

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published October 17, 2023 4 Min Read
Share

Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị United Party for National Development (UPND) àgbághágó ihe nkiri na-akọwa nà onye isi ala Zambia bụ Hakainde Hichilema agaghị azọ ọchịchị nke ugboro abụọ ya n’afọ 2026.

N’ihe nkiri ahụ nke gazuru ebe niile, á hụrụ kà Hichilema yì ákwà suit, kwụrụ n’ihu ọkọlọtọ Zambia ikwuputa mkpebi ya nà ọ̀ gaghị àzọ́ ọchịchị na ntụli aka 2026.

“A chọrọ m ikwenye nà anyị hụrụ ihe isike n’ọchịchị m dịka onye ǹdú obodo a. Ọ́ bụ̀ n’atụghị àsị́ ọbụla kà m jì na-ekwuputa mkpebị m nà agaghị m azọ ọchịchị nke ugboro abụọ na ntulị aka 2026. Ekwenyere m nà mkpebi à bụ nke ga-abara obodo anyị
nà ọdịnihu ya uru,” bụ ihe onyonyo à kwuru.

Hichilema azọla ọ́kwá onye isi ala ugboro ise tupu o mecha merie n’afọ 2021.

Na Zambia, onye isi ala nwere ike ịchị afọ ise ugboro abụọ.

Site n’inyocha ihe nkiri ahụ ọfụma, mmegharị ọnụ ya, ịkwụsị mgbe kwa mgbe nke nya bụ ihe nkiri, ya na apụtachaghị ihe nke ọtụtụ ihe dị na nya bụ onyonyo mere nnọọ kà anyị mata n’ọbụ ihe nkiri ejiri ngwa ọrụ AI rụpụta.

Ihe nkiri a na-abịa n’oge mba Zambia na-enwe mkparịtụka gbasara ntulịaka obodo há nke afọ 2026.

Dịka na mba ndị ọzọ, n’oge ntụlị aka, a na-enwekarị ọtụtụ ihe ngosị na ozi n’abụghị eziokwu. Ozi ndị a bụ nke a na-ejikarị emegide ụfọdụ ndị mmadụ ya na uche obi ọtụtụ.

Onye secretary general òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị UPND bụ́ Batuke Imenda zigara ozi màkà nya bụ onyonyo.

Há bụ ndị nọ ọchịchị tàrà ndị nwere “njirimara ndị ohi” ụ́ta nà ha “jiri ńgwá ọrụ AI bipụta, mà na-ezisa ihe nkiri na-akọtọ onye isi ala há” iji dúhìè ndị mmadụ.

UPND dọrọ ndị mmadụ aka na ntị gbasara ihe ngosị ahụ nke ọ sị bụ “ịgosighe onye isi ala bụ Hichilema”.

“Anyị ghọtara obi ọkụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ kwụsị n’ebe há dị ńkwádó ime m̀pụ́ megidere onye ǹdú obodo niile họpụtara dịka onye isi ala,” ozi à gụpụtara.

“Anyị mara na ufọdu ndị ǹdú ọchịchị na-ama anyị aka nà ndị òtù há na-esonyezi n’ihe ga-akwatu onye isi ala á họputara site n’ọchịchị onye kwuo uche ya.

“Anyị ghọtara nà há na-achọ kà á hụta òtù há n’anya, mana anyị ga-achọ ichetara há ọzọkwa n’iwu ala anyị amaghị onye bụ onye.

“Ọ bụ ihe amara nke ọma na ufọdu n’ime ụnụ na-amara ụma na-esonye n’ihe adịghị mma nihu iwu ala anyị, nke ga-adọta ndị iweoji. Ọbụrụzie na ndị uwe ojii kpozie ụnụ maka ajụjụ ọnụ, ụnụ ebekarịa n’ákwá.

“Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị chọrọ ịgwa onye ọ bụ nọ n’isi ibipụta ihe nkiri dị otu a nà ọ́ ga-akwụ ụgwọ ya mà ọbụrụ nà áká kpàrá ya.”

Onye isi obodo Zambia ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ya bụ ihe nkiri.

K’osiladị, ndị uweoji mba Zambia kwùrù nà há ebidola ileba anya ịmata ebe ihe ngosị ahụ sì, mà nwuchikwa onye mere nya bụ m̀pụ́.

TAGGED: Igbo Fact Check, Zambia

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu October 17, 2023 October 17, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?