TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ụ́lọ̀ ị́kpe ékwupụ̀tàghị̀ ónyé ji LP dọ́ ọ́kwá gọ́vanọ̀ Delta dị́kà ónyé ḿmérí ńtụ̀lị́ áka
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ụ́lọ̀ ị́kpe ékwupụ̀tàghị̀ ónyé ji LP dọ́ ọ́kwá gọ́vanọ̀ Delta dị́kà ónyé ḿmérí ńtụ̀lị́ áka

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 8, 2023 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị nke Hichief Sunny Odogwu, onye ji Facebook ezisa ozi, tinyere n’ọba ozi ya kwùrù sị na ụlo ikpe ntụlị aka ekwupụtala Kennedy Pela, onye ji Labour Party (LP) dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ Delta stéétị̀, dịka onye meriri na ntụlị aka ahụ.

Ebiputara nya bụ ihe ngosị nkeji isii à n’ụbochị iri atọ nà ótù nke ọnwa August.

“Ụlọ ikpe mgbagha ekwupụtala Ken Pela, onye ji Labour Party dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ na Delta steeti, dịka onye meriri na ntụli aka ahụ,” nke a bụ̀ ihe ísí okwu mbipụta ahụ kwuru.

Ókwú a nwetara nkiri puku iri asaa na ntunye ọnụ narị abụọ na iri isii n’isii. Ndị okwu à masịrị ruru otu puku na nari iri atọ.

 

Odogwu gwara ndi n’ile kirigoro nya bụ ozi ka ha kesaa ya nye ndị ọzọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

N’otu akụkọ TheCable bipụtara, ụlọ ikpe mgbagha bụ́ appeal court nà Abuja nyere iwu kà ndị ikpe ntụlị aka gọvanọ Delta steeti nye ohere inụta mkpebi ikpe Pela nke Labour Paty bùrù gá ụlọ ikpe.

Òtù Independent National Electoral Commission (INEC) kwuputara Sherriff Oborevwori, onye jiri Peoples Democratic Party (PDP) dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ, dịka onye meriri na ntụlị aka nke ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa March na steeti ahụ.

Oborevwori jiri vote puku narị atọ na iri isii na narị iri atọ n’anọ merie Ovie Omo-Agege nke APC, onye nwetara vote puku narị abụọ na narị anọ na narị abụọ n’iri abụọ n’itolu.

Pela bụ onye nke atọ, ma nwetakwa vote iri anọ n’asatọ na iri abụọ n’otu.

Pela na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya gara n’ihu ịgbagha mpụta nya bụ ntụlị aka. Há sị na onye meriri enweghị di ikike ịzọ ọkwa ọchịchị. Há sị na onwere ọtụtụ nrụrụ aka mere na nya bụ ntụlị aka. Há kwukwara sị na odara iwu ntụlị aka ahụ n’onwe ya.

Ha gwara ụlọ ikpe ka o kwupụta Pela dịka onye mmeri na ntụli aka ahụ maọbụ kagbuo ya, mà mee ntụli aka ọhụrụ .

ḾKPÉBÌ ÚLỌ̀ ÍKPÉ ḾGBÁGHÁ

Tupu ụlọ ikpe ntụlị aka ègèé nchegbu há, Damian Dodo, onye isi ndụmọdụ nyere gọvanọ na osote ya, rụ̀rụ̀ aba, sị na há ahapụgo nkpesa LP.

O kwuru na há bụ ndị butere ikpe à jụrụ ịgosị onwe ha n’ụlọ ikpe n’ụbọchị asaa e mechara ntụli aka dịka há kwesịrị.

Dodo gbakwunyere sị na Pela na LP agaghị n’ihu ịnata ohere ọzọ íkpesa ikpe ha, nke mere ka ikpe ha bụrụ nke abazighị uru.

Dodo gara n’ihu kwuo na onye ḿkpésá à gara nata ohere ikpesa ikpe ya n’ụbọchị iri na itolu tupu emeghe ohere íkpesa ikpe, nke mere ḿkpésá ya jiri bụrụ nke bịara ọsịsọ, mà bụrụkwa nke ékwèsị̀rị̀ itufu.

C.H Ahuchaogu, onye isi oche ikpe ntụlị aka, nke mmadu atọ nọchiri, tufuru ḿkpésá Pela.

Pela na LP jiri iwe buru nya bụ ikpe gazie ụlọ ikpe mgbagha, nke bụ court of appeal.

N’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August, ụlọ ikpe mgbagha mezuru uche obi onye ḿkpésá, ma nye iwu kà eweghachi ikpe à n’ụlọ ikpe ntụlị aka ebe ha nọbu ekpe nya bụ ikpe.

ŃCHỊ́KỌTÁ

Mbipụta nke na-akọwa nà ụlọ ikpe ekwuputala Pela dịka onye mmeri ntụlị aka ọkwa gọvanọ Delta steeti abụghị eziokwu.

Ụlọ ikpe mgbagha bụ̀ naanị iwu kà ó nyèrè iweghachi ḿkpésá Pela na LP n’ụlọ ikpe ntụlị aka mgbe TheCable dere akụkọ a.

Onwebeghị ikpe ikpeazụ e nyere gbasara ḿkpésá ya.

TAGGED: Delta Tribunal, igbocablefactcheck, INEC, LP, Pela

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 8, 2023 September 8, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?