TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Bill Gates èbúbàtàrà óríà diphtheria nà Naijiria?
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Bill Gates èbúbàtàrà óríà diphtheria nà Naijiria?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 19, 2023 5 Min Read
Share

Ị́dọ áká n’ńtị̀: Ákụ́kọ́ à nwèrè fòtó na-awụ ákpátá óyi

Ọbụrụ nà ị́bụ̀ onye Naijiria márá ịhe akụkọ na-ekwu, ó nwèrè ike pụ̀tá nà ịnụla màkà ọrịa Diphtheria ǹké na-efè nà Abuja.

Diphtheria bụ ọrịa bakteria nke na-egbu egbu. Ụdị bakteria na-akpata ya bụ nke a na-akpọ Corynebacterium, nke na-emetụta imi, akpịrị, ma anụ ahụ mmadụ ụfọdụ m̀gbè.

Njirimara na-egosi nà mmadụ bù diphtheria gunyere ahụ ọkụ, imi ịgba mmiri, ọ́nyá akpịrị, ụkwara, anya ịcha obara-obara, akpịrị ịza-aza ya na nsogbu íkù ímé.

Ibelata ọrịa a, ulọrụ màkà mgbochi ọrịa ụmụaka bụ́ Nigeria Childhood Immunisation Schedule họpụtara ọgwụ vaccine atọ màkà ụmụ ntakịrị izu ụka isii, iri, na iri n’ano.

N’agbanyeghị na ọchịchị etịtị, site n’ụlọ ọrụ màkà njikwa ọrịa bụ́ Nigeria Center for Disease Control (NCDC) na-agba mgbọ igbochi ọha, ụfọdụ mmadụ na-atụ aro na ọ bụ Bill Gates, onye òsò-àchị́ ǹké Bill and Melinda Gates Foundation, nwere áká na ntiwapụ ọrịa diphtheria na Naijiria.

N’ọnwa June, Gates bịara Naijiria ka ya na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu kpaa gbasara ahụ ike nke ụwa niile na mmepe obodo.

Njem ya bidoro n’Abuja ebe ya na Bola Tinubu, onyeisiala Naijiria, nwèrè nzukọ. Gates mèchàrà gaa obodo Niger Republic, maghị naghachita Lagos isonye na mmemme ndị ntorobịa.

N’ubochi atọ nke ọnwa Julai, dịka Gate naghachiri mba US, Federal Capital Territory Administration (FCTA), ngalaba ọchịchị màkà ịsị obodo bụ Abuja, kwuputara okwu sị nà ọrịa diphtheria etiwala nà Abuja.

FCTA sị na ha chọpụtara nke a site na nnyocha ha mèrè màkà ótu obodo dị ǹsó na mkpaghara Abuja nke a na-akpọ Dei-Dei.

Sadiq Abdulrahman, onye ntụziaka FCT n’ime ngalaba màkà ahụike ọha, kwuru na nwatakịrị dị naani afọ anọ nwụrụ màkà nya bụ ọrịa.

N’ihi na Gates bịara Nigeria na nsonso a, ọtụtụ mmadụ bịdọrọ kwube na obịbịa ya nwere áká ná ntiwapụ nya bụ ọrịa.

TheCable chọtara ọtụtụ okwu ụmụ afọ Naijiria na mgbasa ozi ọha soshal midia, nke n’atụ aka na Gates bubatara ọrịa a na Naijiria.

So that's what bill gates bring come Nigeria be this?

— Kelvin John (@Kelvinrickjay) July 5, 2023

Bill Gates just vissited Abuja, suddenly we have out break Diphtheria.

— Ifediba (@Ifediba5) July 4, 2023

Hahaha After Bill Gates Visit 🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣

— YUNGROC (@iamyungroc) July 4, 2023

Bill Gates left Souvenir.

Hot pepper soup is the best vaccine.

— PSHEGS (@pshegs) July 5, 2023

Since Bill Gates came. Who knows what he brought to the country?

— DragonBite = Fire 🔥 🔥 🔥 🔥 (@actuareality) July 6, 2023

Nke a atụghị anyi n’anya, ebe ọ bụ na ọha atala Gates ụta mbụ n’obụ ya mepụtara COVID iji belata ọnụ ọgụgụ mmadụ ma nweta ego.

Ònwèrè kà njem Gates bịara na Naijiria sìrì gbasata ntiwapụ ọrịa diphtheria n’ala anyị?

Iji zaa nkea, anyị lere anya n’akụkọ mere-eme oge mbụ.

NTIWAPỤ ỌRỊA DIPHTHERIA ABỤGHỊ IHE ỌHỤRỤ

Diphtheria abụghị ọrịa ọhụrụ n’obodo Naijiria. Abuja abụghị steeti mbụ a na-ahụta nya bụ ọrịa.

N’afọ iri na abụọ gara-aga, n’etiti ọnwa Febụwarị na ọnwa Novemba nke 2011, ọrịa diphtheria tiwara n’obodo Kimba nke dị na Borno steeti, yana gburugburu  ya.

Achọpụtara na mmadu iri itoolu na asatọ bụ ndị butere nya bụ ọrịa. Mmadụ iri abụọ  na ótù nwụrụ n’oge ahụ.

M̀gbè ahụ, ulọrụ NCDC kwuru na ihe kpatara ntiwapụ ọrịa a na ọtụtụ ọnwụ ha hụrụ bụ ọgwụ mgbochi nke n’ezughị ebe niile, ma igbu oge n’ichọpụta nya bụ ọrịa.

N’ọnwa Dezemba nke 2022, ulọrụ NCDC chọpụtara ntiwapụ ọria diphtheria ọzọ na Kano, Lagos, yana ọtụtụ steeti ọzọ dịka Kastina, Crossriver, Kaduna, Osun, na FCT.

📜

Since December 2022, we have reported multiple #diphtheria outbreaks in different states across the country.

Despite the availability of a safe and cost-effective vaccine in the country, the majority of confirmed cases were unvaccinated

🔗Read our statement following the… pic.twitter.com/pVxgmOSw5f

— NCDC (@NCDCgov) July 6, 2023

N’etiti ọnwa December nke afọ garara-aga na ụbọchị iri atọ nke ọnwa June, enwela ọnụ ọgụgụ mmadụ nari asaa na iri itoolu n’asato butere ọrịa diphtheria, ebe mmadụ iri asatọ anwụọla na local gọọmenti iri atọ na atọ dị na steeti asatọ.

Nanị ótù onye butere ọrịa a na Abuja. Nanị ótù onye nwụrụ na nya bụ isi obodo.

NCHỊKỌTA

Ebubo na Gates bụ onye butere ntiwapụ ọrịa diphtheria na Naijiria bụ asị.

Obodo Naijiria enwela ọtụtụ ọnụọgụgụ mmadụ butere ọrịa diphtheria na steeti Borno, n’afọ iri na abụọ gara-aga, ma kwuputakwa okwu na ńsó-ńsó a màkà ntiwapụ nya bụ́ ọrịa na steeti isii tupu Gates abịa Naijiria.

Nke a pụtara na akụkọ ụgha na-efegharị na Gates bubatara ọrịa a na Naijiria bụ otu n’ime m̀gbá òkpúrù éjì emegide nya bụ onye isi ụlọrụ Microsoft.

TAGGED: Bill Gates, cableigbo factcheck, factcheck, NCDC, outbreak

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 19, 2023 July 19, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?