TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Kwankwaso bìrì égo ǹkè úkwú — ụ́gwọ́ Kano steeti jì 1008% rị́á n’etiti afọ 2011 nà 2015
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Kwankwaso bìrì égo ǹkè úkwú — ụ́gwọ́ Kano steeti jì 1008% rị́á n’etiti afọ 2011 nà 2015

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published December 28, 2022 7 Min Read
Share

Rabiu Kwankwaso, onye bụbu gọvanọ Kano steeti, ma bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị òtù New Nigeria Peoples Party (NNPP) màkà ntuliaka ọkwa onye isi obodo na 2023, kwùrù na ọchịchị ya nke afọ asatọ ebighị ego ma ncha.

Kwankwaso kwuru okwu a na Satọde, ụbọchị iri na itoolu n’ọnwa Nọvemba, na mkparịta ụka a na-akpọ presidential town hall series. Onye gbara ajụjụ ọnụ ahụ bụ Kadaria Ahmed, onye nta akụkọ ndị mmadụ ma ama.

“Rabiu Kwankwaso ebighị ego ọbụla n’ụlọ akụ maọbụ n’aka onye ọbụla, na obodo anyị maọbụ na mba ofesi,” nke a bụ ihe o kwuru.

“A bụ m otu gọvanọ nke anabeghị mmadụ ego. Ma n’ezi, a kpọrọ m íbì ego ásị̀. Ọ bụghị sọ ya. N’afọ 1999, mgbe a họpụtara m dịka gọvanọ, eketara m ọtụtụ ụgwọ nke m kwụrụ n’afọ anọ.

“Ha meriri m na ntuli aka nke 2003. Ka afọ asatọ gara, a biara m ọzọ ma keta ụgwọ ọzọ, nke m kwụchapụrụ n’afọ anọ. Oge m hapụrụ Kano, ejighị m ụgwọ ọbụla”.

Kwankwaso kwuru ótù ihe ahụ na Sunday, ụbọchị iri na atọ n’ọnwa Nọvemba, mgbe ọ gàrà presidential tow n hall meeting nke Channels TV kwadoro.

N’azịza ya gbasara ka ọ ga esi kwàdó mmefu ego obodo na-enweghi iji ụgwọ ọzọ, Kwankwaso sị na ọchịchị ya ebighị ego mgbe ọ bụ gọvanọ Kano.

“Nnukwu ego dị na obodo a. Onye ọbụla sị́ nà ego adịghị n’obodo Naijiria nwere ike bụrụ onye amaghị, maọbụ onye nwere ebumnuche ọjọọ. Ego anyị nwere zùrù okè inekwata onye ọbụla nọ n’obodo a anya.

“Anyị emela ya mbụ na Kano n’afọ 1999, ma na 2003. Anyị ketara ọtụtụ ụgwọ, ma kwụchapụ ha. Ka afọ asatọ gachara, m nagachiri azụ ịbụ gọvanọ. Anyị ketara ọtụtụ narị nde ego dollar nke ọchịchị mbụ bìrì. Anyị kwụchapụrụ ha ncha tupu anyị pụọ n’afo 2015.

“A na m ekwu maka igbazi ego n’aka ụlọ akụ maọbụ n’aka ndị mmadu. Anyị agbazighi ego n’afọ asatọ niile ọchịchị m dịka gọvanọ”.

Na afọ 2021 niime okwu yá na Arise TV nwere, Kwankwaso bòrò Abdullahi Ganduje, gọvanọ Kano ugbua, ebubo na ọ bụ ya mere nya bụ steeti jiri jide ụgwọ nke ukwu. Ọ mere ọnụ ọzọ; sị na o bighị ego mgbe niile ọ chịrị Kano steeti dịka gọvanọ.

Ọ̀ BỤ̀ EZIOKWU NA KANO STEETI EBIGHỊ EGO MGBE KWANKWASO BỤ GỌVANỌ?

Rabiu Kwankwaso bu gọvanọ Kano steeti site na afọ 1999 ruo 2003.

E meriri ya na ntuliaka nke 2003. Ka e mesiri, a họpụtara ya ịbụ minister of defense site na afọ 2003 ruo afọ 2007.

Na afo 2011, a họpụtakwara Kwankwaso ọzọ dịka gọvanọ Kano steeti.

Ụlọ ọrụ nlekọta ụgwọ obodo, Debt Management Office (DMO), enweghị edemede ḿgbàkọ́ kwadoro ihe Kwankwaso kwuru.

ỤGWỌ MBA OFESỊ BELATARA SITE NA 9.89% N’ETITI AFỌ 2011 NA 2015

Dịka DMO kwuru, na afọ 2011, Kano jì mba ofesi ụgwọ pụtara $63.94 million oge Kwankwaso nagachiri n’ọchịchị dịka gọvanọ.

Oge ọ hapụrụ ọchịchi na 2015, ọnụ ọgụgụ ụgwọ ahụ belatara ruo $57.61 million, mgbanwe nke pụtara 9.89%.

ỤGWỌ IME OBODO JÌRÌ 1008% GBÁGÓ

N’afọ 2011, ka ọ batara na ọchịchị ọzọ, e nwere ụgwọ ime obodo dị adị bụ ₦5.87 billion. Na afọ 2015 oge ọ hapụrụ ọrụ, ego obodo ji mgbe ahụ arịgo, ruo ₦65 billion, nke pụtara mgbago 1008%.

N’ụzọ doro anya, ọrịrị ụgwọ ime obodo nwere ike abụna màkà ego gọọmenti bìrì ebi, ọkachasị ma anyị gbanye ihe dịka ọnụ íbì ego maọbu ọnụ mgbanwe ego ka ọ si metụta ụgwọ mba ofesi.

Ótú ọ dị, TheCable kpughere na ihe dị iche n’ọnụ mgbanwe ego ka ọ sị metụta ụgwọ mba ofesi abụghị ya mere ụgwọ Kano jiri rịa nke ukwu. Ma ọrịrị ọnụ íbì ego nke afọ anọ erughị ime ka ụgwọ Kano jírí 1008% gbago.

N’ezi, nkezi ọnụ mgbanwe ego bụ ₦155 maka $1 n’afọ 2011 na ₦197 maka $1 na 2015.

ABDULLAHI GANDUJE KWETERE NA KANO STEETI BÌRÌ EGO

Tupu ha sèé okwu, Ganduje, onye bụbu òsòté Kwankwaso, maghị mechaa bụrụ gọvanọ na 2015, kwuru na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka Kwankwaso hapụ Kano n’ụgwọ pụtara ₦300 billion.

Ganduje tunyekwara ọnụ n’okwu gbasara ndị kọrọ Kwankwaso ọnụ maka ụgwọ nya bụ gọvanọ mbụ dọkọrụ na Kano. Ọ sị na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị maka akụ na ụba si na mmanụ obodo belatara mgbe ahụ.

Dịka akụkọ ọzọ na 2015, ndị ọrụ nkwekọrịta Kano gwara ụlọ ọrụ mgbochi nrụrụ aka ka ha jụọ Kwankwaso maka ụgwọ ₦200 billion ọ dọkọrụ. Ha sị na Kwankwaso kụrụ ndị ọrụ ngo nọ na Kano ọrụ.

Muhammad Garba, onye bụbu commissioner of information, bokwara Kwankwaso ebubo na ọ gbaziri nchikọta nke ₦4.1 billion irụ ụlọ obibi nke ọha.

Daily Trust dere akụkọ maka ihe Garba kwuru; sị “Kwankwaso gbaziri ₦4.1 billion ego ezumike ndị ọha nka ịrụ ụlọ obibi na Bandirawo na Amana, búrú ebumnuche na ndị ezumike nka nwere ike irite uru na ụlọ a.

“Oge ọ chọpụtara na nya bụ ụlọ dị oke ọnụ ndị ezumike ikwaba na ya, Kwankwaso bere ọnụ ego ụlọ ndị a ruo ọkara. Ndị ezumike a mechara, ha enweghị ike ịzụta ụlọ ndị a.”

IKPE

Okwu Kwankwaso kwuru na ọchịchị ya ebighị ego abụghị eziokwu. Ihe akaebe zuru oke na-egosi na ụgwọ ime obodo Kano jiri 1008% rịa. Nakwa, ndị ọchịchị bu Kwankwaso ụzọ na ndị ọrụ ngo na steeti ahụ kwetere na ụgwọ ime obodo nke Kano jì gbagoro nke ukwu

TAGGED: Abdullahi Ganduje, daily trust, Kano state, Rabiu Kwankwanso

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora December 28, 2022 December 28, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?