[tps_footer][/tps_footer]
Onyonyo nke zikọrọ Abdulrahman Abdulrazaq, gọvanọ Kwara steeti, ébé ìgwé mmadụ na-akpari ya pụtara ọzọ na mgbasa ozi ọha.
A nụrụ ka ìgwé mmadụ na-akpọ nya bụ gọvanọ onye ohi n’asụsụ Yoruba.
Ndị na-eke onyonyo a sị̀ nà nke a mere nso nso, oge gọvanọ na ụfọdụ ndị òtù All Progressive Congress (APC) gàrà na polytechnic nke dị na Kwara steeti màkà ḿgbákọ̀, nke ndị bekee na-akpo rally.
Ha kèrè akụkọ a na akaụntụ Facebook ndị na-ákwàdó Peter Obi ụbọchị Monde.
Ndị lere ya ruru puku abụọ na narị isii.
Ibe ọzọ nke aha ya bụ Nigeria Youth Movement kèrè onyonyo ọzọ nke ndepụta isiokwu ya bụ: “Kwara Steeti gọvanọ, onye ndị hapụrụ APC ịga PDP chụrụ ọsọ. Ha na-abụ abụ, na-akpọ aha ya Sai Buky Bukola Saraki.”
Ndị lere onyonyo a kemgbe ọ pụtara n’ụbọchị Tuzdee ruru otu puku na narị abụọ.
Anyị wepu Facebook, onyonyo a pụtakwara na YouTube, WhatsApp na TikTok.
Onwere ibe dị na YouTube aha ya bụ E-vibez TV. Ha kere onyonyo a ụbọchị Monde, sị na Abdulrahman na-eme kampeenu màkà ntụlị aka ọzọ n’afọ 2023. E lere onyonyo a na ibe a ugboro puku asaa na narị itoolu.
Nchọpụta
The Cable ji ngwá ọrụ a na-akpọ InVID wee nyochaa onyonyo a. Anyị chọpụtara na ebe mbụ etinyere nya bụ onyonyo bụ na YouTube n’afọ 2018.
E buru ụzọ tinye onyonyo a na ibe YouTube na-aza Kwara Gist ụbọchị iri abụọ na ise n’ọnwa Desemba n’afọ 2018.
Ọ nwere nkọwa so ya wee bịa. Ọ gụrụ sị: “Ogbaaghara na-eme na Ilorin na ḿgbákọ̀ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke iri ise na asato nke ndi Ilorin Emirate Progressive Descendant Union (IEPDU) na-eme. Nke a bụ màkà ndị na-akwado onye bụbụ onyeisi oche sineti, Dr. Bukola Saraki, kwụsịrị omume ahụ”.
Ụbọchị ịtoolu n’ọnwa Ọgọstụ, Kwara steeti gọọmenti meghachiri omume gbasara onyonyo site na edemede ha dere na ibe Facebook.
Bashir Adigun, onye ndụmọdụ gọvanọ pụrụ iche, si na onyonyo a bụ nke ụbọchị iri abụo na isii n’ọnwa Desemba na afọ 2018, oge ndị omempụ na ndị na-ákwàdó Bukola Saraki gbasasiri mmemme ndị Ilorin Emirate Descendants Progressive Union (IEDPU) haziri.
Adigun sị na esere onyonyo a mgbe gọvanọ bụ̀ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, wéé gaa mmemme nke ọ bụ onye ọbịa pụrụ iche na obodo ya.
Ọ sị na mmemme ahụ mere na Kwara Polytechnic ụbọchị asaa n’ọnwa Ọgọstụ na afọ 2022, ime ka gọvanọ nọrọ ebe ahụ.
“Ndị gbasara onyonyo a na-achosi ike ka ha ziko na a na-akọ gọvanọ ọnụ,” ihe a ka o kwuru.
Ikpe
Onyonyo nke na-egosị igwe mmadụ ka ha na-akpari gọvanọ Kwara steeti na-eduhie eduhie. Esere ihe nkiri ochie a n’afọ 2018. Ọbughị onyonyo esere nso nso a.