TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Fòtó ìgwé mmadụ̀ à ò sì nà Osun PDP rally?
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Fòtó ìgwé mmadụ̀ à ò sì nà Osun PDP rally?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published July 26, 2022 4 Min Read
Share

Okwu na-ewù na mgbasa ozi ọha na-akọwa na Foto igwe mmadụ a sì na ḿgbákọ òtu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na Osun state.

Ụbọchị Thursday, PDP hàzìrì mgbakọ òtù nke ndị bekee na-akpo rally na Osun steeti tupu ụbọchị ndọrọ ndọrọ nke edokwara ga-eme na Saturday, ụbọchị ịrị na isii n’ọnwa Julaị.

Abban Atiku, onye mgbasa ozi na Twitter na-aza @abbalala3, kere foto were dee n’okpuru ya sị: “Osun steeti abụghị ọgbọ gị.”

Foto ahụ zikọrọ igwe mmadụ nọ n’okporo ámá, ébé osisi dị iche iche dịgasị.

Ndị nya bụ foto masịrị rùrù pụkụ atọ na narị ịtọolu. Ndị kèrè ya rùrù narị ise. Ndị dere ìhè màkà ya rùrù narị ịse na iri ise na abụọ.

Osun State no be your mate. pic.twitter.com/46lQ8sdRed

— Abban Atiku (@abbalala3) July 13, 2022

Anyị nyochara akaụntụ Twitter nya bụ onye mgbasa ozi, were hụ na ọ bụ onye kwụdosịrị PDP ike.

Nya bụ foto agbasago ebe niine. E jiri ya were kọwaa na rally ikpeazụ nke PDP mèrè na Osun state gàrà nke ọma.

Ndị mmadụ nọ na Twitter nere ya anya, were tòó igwe mmadụ ha sị bịara nya bụ ḿgbákọ̀.

Otu onye dèrè sị: “Obi dị m ụtọ ma ọ bụrụ na ọ bụ Osun. PDP masịrị m ugboro iri karịa APC ndị ori. Ọ bụrụ na onye ndọrọ ndọrọ Labour Party (LP) enweteghi [ọchịchị], ka senator PDP nke ma agba égwu nweta ya. Obi ga-adị ndị kwadoro Peter Obi ụtọ ma Adeleke bụrụ onye isi.”

Onye ọzọ tụnyere ọnụ sàrà ya okwu sị: “Tiketi efu ga-adị íji kiri Davido na ndị égwu ọzọ. Kedụ ihe ga-eme na ndị mmadụ agaghị agbakọta? Senator ma agba égwu ga-agbara ndị mmadụ egwu ofụọ. Abụm onye na-akwàdó LP mana obụrụ na m ga-aga Osun steeti echi, m ga-aga nwere onwe m obi ụtọ.”

E bipụtara nya bụ okwu na Facebook.

Nchoputa

TheCable ji ngwá ọrụ digitalụ nke a na-akpo Labnol iji chọpụta ebe foto a si na nke yiri ya.

Anyị chọpụtara na foto ahụ bụ nke e sere na Ilorin na Kwara steeti. Ọ̀ bụghị na Osun ka esere ya, dị ka ndị mmadụ kwùrù.

Anyị gara n’ihu ime nnyocha, wee chọpụta na foto ahụ bụ nke esere na èkpéré Eid-el-kabir, nke e mere na Kwara steeti.

E buru ụzọ gbasaa ya n’ụbọchị ịtoolu na ọnwa Julaị.

E bipụtara foto ahụ na akaụntụ gọọmenti Kwara steeti nke Twitter kwadoro.

Ihe e dere gbasara ya gụrụ sị: “Ndị na-efe ofufe na Ilorin, isi ọbọdọ Kwara steeti, ụbọchị Saturday pụtara nnukwu iso Governor @RealAArahman ikpe ekpere Eid-el-kabir ndebe ala nke ọma maka udo.”

TheCable chọpụtara na onye mgbasa ozi na Twitter kere foto dị iche iche nke zikoro ekpere Eid-el-kabir emere nso nso a na Ilorin.

https://twitter.com/TheWorldCamera_/status/1546220740487282690?s=20&t=kOMmm_Hz2dh3QS-UwzTo7w

Kwara State Eid Prayers today ❤️ pic.twitter.com/lbUldv0RIV

— Mohammed Jammal (@whitenigerian) July 9, 2022

 

Nke a gosịrị na foto a esighi na rally ndị PDP mere na Osun.

Ikpe

Foto a na ekegharị iji gosi na igwe mmadụ nọ na rally ndị PDP meere na Osun State na eduhie ụzọ.

TAGGED: Adeleke Ademola, Davido, Eid-el-Kabir prayers, Kwara State, Obidient, Osun PDP rally

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora July 26, 2022 July 26, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?