Eniola Badmus, onye ejije Nollywood, kwùrù sị na ọnụ ego mmanụ ụgbọala kachasịrị dị́ ọnụ-ala na Naijiria, n’agbanyeghị nkwụsị ego enyemaka, ǹkè ndị bekee na-akpo “fuel subsidy”.
Nya bụ onye na-eme ihe nkiri, ma bụrụkwa onye ńkwàdó á mà àmá nke Bola Ahmed Tinubu, onyeisi ala Naijiria, tụnyere ọnụ n’okwụ mgbe onye nta akụkọ bụ Daddy Freeze nwèrè mkparitụka na Instagram.
Badmus kwuru na ọtụtụ ndị na-akọtọ ọchịchị Tinubu amaghị úrù nkwụsị nya bụ ego enyemaka subsidi maka mmanụ ụgbọala bàrà.
Ọ kwùrù sị: ‘’Dika nwa afọ Naijiria, Enwere m ike ịnwe uche óbì nkem. Enwekwaram ike ịkwado onye ọbụla m chọrọ.
“Ọtụtụ ndị a ji usoro mgbasa ozi ịntanetị dị iche iche wèré akọtọsị ọchịchị Tinubu amaghị ihe ọbụla gbasara subsidi.
“Ọ bụ mgbe e wepụrụ ya bụ subsidi kà ụfọdụ ndị mmadụ matara ịhe gọọmenti na-eme. Ruo ugbu a, anyị na-àzụ́ mmanụ n’ọnụ dikarịchara ọnụ-ala.”
ŃKWỤ́SỊ́ SUBSIDI MÀKÀ ḾMÁNÚ Ụ́GBỌ́ÀLÀ
N’ụbọchị ịrị na itoolu nke ọnwa May, onyeisi ala Bola Tinubu, ka ọ na-enye ozị mbụ ya dịka onye ịsị ọchịchị, kwùrù na mgbe gọọmenti na-akwụ ụgwọ subsidi maka mmanụ ụgbọala agaala.
O kwuru sị: ‘’Ọ bụ ihe nwute na bọjetị nke dị tupu m bata dịka onye ịsị ala eweputaghị ego maka subsidi. Nke a pụtara na oge ịkwụnye ego enyemaka bụ subsidi agaala.”
Tinubu gara n’ihu gbakwụnye na ego e jì ágbàchí subsidi bịara na arịzi elu nke ukwu, nke na ọ naghịzi arụ ọrụ ejị webata ya.
“Anyi na-ekele gọọmenti na-apụ apu màkà mkpebi ha nwere n’iwepu subsidi dị na mmanụ ụgbọala, nke bịara dịka ọ kachasịrị menyere ndị ọgaranya karịa ndị ogbenye.
“Kámà, ihe anyị ga-eme bụ̀ iwere nya bụ ego susidi mmanụ tinye ya n’ọtụtụ atụmatụ màkà mmepe obodo dịka agụmakwukwọ, ahụike, ya na ịrọputa ọrụ nke ga ákwàlíté ndụ ọtụtụ mmadụ.”
Nwantinti oge kà Tinubu kwụchara ịhe ndị a, ọnụ ego mmanụ ụgbọala bịara sí na ótù narị Naira na iri itoolu kwa lita ruo ịhe karịrị narị Naira ise kwa ótù lita.
N’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa Julaị, ndị na-ere mmanụ esibeghị esi, nke ndị bekee na-akpọ “crude oil”, welịri ọnụ ego ha na-ere mmanụ ụgbọala ọzọkwa ruo narị Naira isii na iri n’asaa kwa lita na Abuja. Na Lagos, o ruru narị Naira ise na iri isii na asatọ kwa lita.
Fuel a na-ere na Naijiria ọ̀ dịkarịchara ọnụ ala? TheCable nyochara ọnụ ego a na-ere mmanụ n’ụwa niile. Ihe ndị a kà anyị chọpụtara.
ŃNYÒCHÁ Ọ́NỤ́ ÉGÓ ḾMÁNỤ N’Ụ̀WÀ NÍÍLE
Globalpetrolprices bụ̀ ndị ǹdú ahịa á màrà màkà ilenye ányá n’ọnụ ego mmanụ ụgbọala , nke ọkụ eletrik, yana nke natural gas n’obodo karịrị ótù narị na iri ise. Ha kwùrù na ọnụ ego a na-ere mmanụ ụgbọala na Venezuela bụ Naira atọ n’uma ótù puku, nari abụọ n’iri asaa n’anọ kwa lita. Ọnụ ego a, dịka ha kwùrù, bụ nke dịkarịchara ọnụ ala n’ụwa niile.
TheCable nyomikwuru anya ma chọpụta na, ewepu Venezuela, a na-ere mmanụ ihe n’erughị narị Naira isii na iri na asaa n’obodo iri abụọ.
Obodo ndị ahụ gụnyere Iran, Libya, Algeria, Kuwait, Angola, Egypt, Turkmenistan, Malaysia, Kazakhstan, Bahrain, Bolivia, Iraq, Qatar, Azerbaijan, Russia, Oman, Saudi Arabia, Ecuador, Kyrgyzstan, ya na Afghanistan.
NỌMBA | OBODO | ỌNỤ EGO NA DỌRLA NKE ỤBỌCHỊ IRI N’ABUO NKE ỌNWA JULAỊ | MGBAKỌ EGO CBN NKE ỤBỌCHỊ ỊRỊ N’ANO NKE ỌNWA JULAỊ | ỌNỤ EGO NA NAIRA |
---|---|---|---|---|
1. | Venezuela | 0.004 | 781.85 | 3.1274 |
2. | Iran | 0.029 | 781.85 | 22.67365 |
3. | Libya | 0.031 | 781.85 | 24.23735 |
4. | Algeria* | 0.34 | 781.85 | 265.829 |
5. | Kuwait* | 0.342 | 781.85 | 267.3927 |
6. | Angola | 0.364 | 781.85 | 284.5934 |
7. | Egypt* | 0.372 | 781.85 | 290.8482 |
8. | Turkmenistan | 0.429 | 781.85 | 335.41365 |
9. | Malaysia* | 0.448 | 781.85 | 350.2688 |
10. | Kazakhstan | 0.488 | 781.85 | 381.5428 |
11. | Bahrain | 0.531 | 781.85 | 415.16235 |
12. | Bolivia* | 0.542 | 781.85 | 423.7627 |
13. | Iraq | 0.573 | 781.85 | 448.00005 |
14. | Qatar* | 0.577 | 781.85 | 451.12745 |
15. | Azerbaijan | 0.588 | 781.85 | 459.7278 |
16. | Russia* | 0.589 | 781.85 | 460.50965 |
17. | Oman* | 0.621 | 781.85 | 485.52885 |
18. | Saudi Arabia* | 0.621 | 781.85 | 485.52885 |
19. | Ecuador* | 0.634 | 781.85 | 495.6929 |
20. | Kyrgyzstan* | 0.741 | 781.85 | 579.35085 |
21. | Afghanistan | 0.743 | 781.85 | 580.91455 |
22. | Nigeria | 0.778 | 781.85 | 608.2793 |
23. | UAE* | 0.787 | 781.85 | 615.31595 |
24. | Tunisia | 0.832 | 781.85 | 650.4992 |
25. | Bhutan | 0.845 | 781.85 | 660.66325 |
26. | Lebanon* | 0.863 | 781.85 | 674.73655 |
27. | Indonesia* | 0.864 | 781.85 | 675.5184 |
28. | Colombia* | 0.867 | 781.85 | 677.86395 |
29. | Pakistan* | 0.878 | 781.85 | 686.4643 |
30. | Argentina* | 0.924 | 781.85 | 722.4294 |
31. | Belarus* | 0.935 | 781.85 | 731.02975 |
Mara amara na obodo iri na itoolu n’ime iri abụọ na-ere mmanụ ihe n’erughị narị Naira ise na iri isii na asatọ màkà ótù litre, nke bụ ọnụ ego mmanụ dịkarịchara ọnụ nà Naijiria taata.
NCHỊKỌTA
Okwu ahụ onye na-eme ihe nkịri bụ Eniola Badmus kwùrù, na mmanụ ụgbọala a na-ere na Naijiria dịkrichara onu ala n’uwa niile, abụghị eziokwu.
K’ọdi ugbu a, obodo iri na itolu n’ụwa niile na-ere mmanụ ụgbọala ihe n’erughị narị Naira ise na iri isii n’asatọ ana-ere na Lagos.
Ngbakọ ego anyị jiri kọọ akụkọ a bụ $1 = 781.85, dika ụlọ ọba ego ala anyị bụ Central Bank of Nigeria (CBN) kwupụtara n’ụbọchị iri na anọ nke afọ 2022, mgbe onye omee ihe ejije a kwụrụ okwu ya.