TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
Share
Latest News
HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert
Seven ways to detect an AI-generated video
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published June 10, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-achọ nnwere onwe bụ́ Indigenous People of Biafra (IPOB), na ngá.

Okwu a nke @NgoziCommedy bipụtara, bụ nke e jiri ihe ngosị ebe Tinubu na ụfọdụ ndị Bishop na-akpa ńkàtá sochie.

Ihe ngosị nkeji abụọ na tinkom tinkom iri abụọ n’itoolu a enwetala nkiri puku ise na ụma narị itoolu (5.9k views), nkwenye iri isii (60 reactions), ntụnye ọnụ iri n’atọ (13 comments), na nkesa iri n’isii (16 shares).

“Pope Leo nke iri na isii na ụfọdụ ndị Bishop ayọla Tinubu ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu na ǹgá, ka udo chịa na mpaghara south-east,” ozi ahụ kwuru.

Asafe ọzọ akpọrọ @United Nations Mission for Referendum in Biafra Land biputakwara ozi dịkwa ka nke a, ma kwuo na Pope Leo yọrọ ọchịchị Naijiria ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu na ǹgá iji kwalite udo na Naijiria nakwa na Afrika.

A nwụchiri Kanu na na afọ 2015, mgbe a sịrị na o mere mpụ megide obodo ya, mana e mechara hapụ ya mgbe o zutechara ọnọdụ niile e nyere ya.

Ọ gbapụrụ Naijiria ka a tọpụrụ ya na ǹgá mgbe ahụ, mana a bịara nwụchikwa ya ọzọ n’afọ 2021 n’ụzọ nwere ka ọ dị.

Mkpọchi ya na ǹgá kpalitere ọtụtụ ị́gba akwụkwọ n’ụlọ ikpe, tinyere ụfọdụ ndị na-akpo maka ntọhapụ ya na ǹgá.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

CableCheck nyochara akụkụ ihe ngosị ahụ, ma chọpụta na ọ pụtara ìhè mgbe e hibere Pope Leo dịka onye isi ụka Catholic.

Mmemme a nke e mere n’ụbọchị asatọ nke ọnwa May bụ n’ihi ọnwụ Pope Francis nwuru n’ụbọchị iri abụọ n’otu nke ọnwa April ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.

Onyeisiala Bola Tinubu so na ndị a ma-ama bịara nya bụ mmemme.

N’akụkụ nya bụ mmemme, Tinubu na ụfọdụ ndị Bishop sò na ndị si Naijiria bịa Vatican zutere ịnwe mkpakorita ụka.

N’ihe ngosị nke ezigbo ya, a nụrụ ka ndị Bishop ahụ na-ekele Tinubu maka ime ka ọbịbịa ha na Vatican nwe isi, ya na iwepụta oge ịbịa nya bụ mmemme n’onwe ya.

Pope esoghị na ndị nọ n’ime ụlọ ebe Tinubu na ndị Bishop a na-enwe mkparịta ụka a. O nweghịkwa mgbe ha jiri yọ Tinubu ka ọ tọpụ Kanu na ǹgá.

Anyị chọpụtara na asafe ndị biputagasịrị nya bụ okwu na-akwado otu nnwere onwe Biafra.

Na mgbakwunye, onweghị ụlọ ọrụ nzisa ozi a mara ọfụma biputara nya bụ ozi.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na Pope Leo na ndị Bishop yọrọ Tinubu ka ọ tọpụ Kanu na ǹgá bụ asị.

TAGGED: fact check in Igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu June 10, 2025 June 10, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert

The Cross River state government has disowned a viral image of a purported Cally Air…

August 15, 2025

Seven ways to detect an AI-generated video

A video announcing the launch of a free nationwide diabetes treatment recently went viral across Nigerian…

August 13, 2025

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?