TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn
Share
Latest News
FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria
FACT CHECK: Video showing people using ropes to cross river NOT from Nigeria
Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà
Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso
Bidiyon da ke nuna yan ta’adda na kwace motoci masu sulke daga Burkina Faso – BA Najeriya ba
FACT CHECK: Video showing gunmen seizing armoured vehicle from Burkina Faso — NOT Nigeria
Viral post wey claim sey dem don pass ‘Cybercrimes Act 2025’ no correct
Ózí na-ekwu nà é mepụ̀tálá ìwú megidere cybercrime bụ̀ àsị́
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 4, 2025 5 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu gọvanọ ụlọ akụ etiti Naijiria, weghachiri tari Naira anọ (N4 trillion) nye gọọmentị etịtị.

N’ime ihe ngosị ahụ ruru nkeji iri n’ise (15 minutes), onye ahụ kwuru n’ọbụ na ‘ọ́bá nzisa ozị’ ka o nwetara akụkọ ya.

“A gụtara m na akụkọ na Emefiele eweghachiela tari Naira anọ (N4 trillion). Ọ bụghị nde Naira anọ (N4 million), ọ bụghị nde Naira iri n’anọ (N40 million), maọbụ nde nari Naira anọ (N400 million). Ọ bụghị otu ijeri Naira(N1 billion), ijeri Naira anọ( N4 billion), ijeri naira iri anọ( N40 billion), ijeri narị Naira itolu( N900 billion) otu tari Naira ( N1 trillion) maọbụ tari Naira abụọ(N2 trillion),” onye ahụ kwụrụ.

“Ótù onye dịka onye bụ bụrụ gọvanọ… weghachitara ya na òbá ege Naijiria, onye dị otú a bụ onye otu okpukperechi n’ụlọ ụka.”

Ọ jụrụ ma ndị Naịjirịa a ma ego ole onye ọbụla ga-eketa ma ekee nya bụ ego.

Onye a gara n’ihu kwuo na a chọpụtara nya bụ ego achọpụta, tinyere na ego ahụ esoghị na ndị na na òbá ego dị na mba ofesi.”

CableCheck chọpụtara na ọ bụ asafe Facebook  akpọrọ @Gio TV bipụtara nya bụ ozị n’ubochi ịrị abụọ n’itolu nke ọnwa June (June 29).

Ozi ahụ e nwetala nkirị karịrị puku itolu (9,000 views), nkwenye otu narị n’ịrị n’abuo (112 likes), na ntụnye ọnụ iri abụọ n’itoolu (29 comments) nke n’ekwuputa mgbagwoju anya ha ma nya bụ ozi o ziri ezi.

ŃTỌ́GHÉ ÁKỤ́KỌ́

Emefiele na-agabiga ọtụtụ ebubo, nke gụnyere ịji ọnọdụ ya dịka onye gọvanọ CBN nweta ọtụtụ ụlọ nya na ego nke a siri n’ositere n’ụzọ n’ezighi ezị nweta.

N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Novemba nke afọ 2024, Deinde Dipeolu, onye ọ̀kà ịkpe ụlọ ikpe high court dị na Lagos, nyere ịwụ ka Emefiele hapụru gọọmenti ego niile nke gụnyere nde dollar abụọ n’uma pụku iri anọ n’ise ($2.045 million), ụlọ nọ ọbasara ala asaa (seven choice landed properties), na asambodo o jị nwere òkè n’ụlọ nchekwa ego Queensdorf Global Fund Limited Trust.

Akụ n’ụba ndị ahụ, ka e kwuru na o nwetara site n’ego ọ kpatara n’ụzọ n’ezighi ezị.

Òkè ndị ahụ ọ hapụrụ gọọmenti gụnyere ụlọ abụọ nọchapụrụ onwe ya dị na No. 17b n’okporo ụzọ Hakeem Odumosu na Lekki Phase 1, nke Lagos; àlà ana emetubeghi áká ọbasara ya rụrụ square meter otu pụku na narị itoolu n’ịrị n’itolu n’uma narị ise n’iri itoolu n’abuo  (1919.592 sqm) nke akara nyocha ya bu (No. DS/LS/340) di na Oyinkan Abayomi Drive (nke a maburu dika Queens Drive), na Ikoyi, Lagos; ulo bungalow nke di na No. 65a Oyinkan Abayomi Drive (nke a maburu dika Queens Drive), nokwa na Ikoyi, Lagos, ya na ọnụ ulo duplex anọ nke dị na 12a n’okporo ụzọ Probyn na Ikoyi.

Ndị ọzọ bụ ụlọrụ industrial complex nke aka na-arụ aru nọ na obosara ala ruru iri abụọ n’abuo na Agbor, Delta steeti; ọnụ ụlọ asatọ nokọtara ọnụ n’àlà obosara ya dị square meter pụku abụọ na narị anọ n’iri ise n’asaa n’uma iri isii (2457.60sqm) dị na No. 8a n’okporo ụzọ Adekunle Lawal, di na Ikoyi, tinyere ulo duplex na ihe niile e jiri chọọ ya mmá  nke nọ n’àlà obosara ya rụrụ square meter pụku abụọ na narị abụọ n’iri n’asaa (2217.87sqm) dị na 2a n’okporo ụzọ Bank Road, dị na Ikoyi, Lagos.

K’osiladị, ụlọ ikpe kachasị elu nyere iwu ka Emefiele ghara iweghachiri gọọmenti akụ n’ụba ndị ahụ.

ŃNYÒCHÁ

CableCheck jiri ị́gwé nyocha reverse image search were nyocha akụkụ ihe ngosị ahụ.

Ihe anyị chọpụtara kwụrụ na nya bụ ihe ngosị pụtara ihe kamgbe afọ 2023.

Ótù onye na X a kpọrọ @Gen_Buhar, bipụtara nya bụ ozi n’onwa Novemba nke afọ 2023.

Nya bụ ozi pụtara ìhè ọzọ n’onwa Januwari nke afọ 2024, May 2024 nakwa na June 2024.

CableCheck nyochara ozi si ụfọdụ oba ozi amara ofuma n’ebiputa ozi gbasara nya bụ okwu, ma chọpụta na enweghị ozi dị otu a ebipụtara.

Na mgbakwunye, anyị jiri ígwè nyocha Google were mee mfokasi ma chọpụta na nya bụ ozi ezighị ezị, kama ọ bụ ozi nke a na ebipụta dịka ozi ọhụrụ kwa afọ nke n’abughi eziokwu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na Emefiele weghachiri gọọmenti etiti tari Naira anọ bụ asị.

 

TAGGED: fact check in Igbo, godwin emefiele, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 4, 2025 July 4, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria

Some pesin for social media don dey put Naija name on top one video wey…

September 3, 2025

FACT CHECK: Video showing people using ropes to cross river NOT from Nigeria

On August 9, a Facebook user identified as Asare Obed posted a video showing people…

September 3, 2025

Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo ohun íbaraẹnise orí ayélujára tí sọ pé fidio…

September 2, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso

Ótù ihe ngosi ebe ndị ojiegbe egbu na-ákụ̀rụ́ ụgbọala ndị agha bụ nke ndị ji…

September 2, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria

Some pesin for social media don dey put Naija name on top one video wey show some men wey mount…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 3, 2025

Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo ohun íbaraẹnise orí ayélujára tí sọ pé fidio kan tí ó sàfihàn àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso

Ótù ihe ngosi ebe ndị ojiegbe egbu na-ákụ̀rụ́ ụgbọala ndị agha bụ nke ndị ji soshal midia ebipụta ozi sịrị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

Bidiyon da ke nuna yan ta’adda na kwace motoci masu sulke daga Burkina Faso – BA Najeriya ba

Wani faifan bidiyo da ke nuna yadda wasu ‘yan bindiga ke karbar motocin sulke na da alaka da wani lamari…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?