TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
Share
Latest News
FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG
FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women
Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal
No, Nigeria no send peace support mission go Israel
A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba
Ǹjẹ́ Tinubu àti Alexander Zingman lọ sí ilé-ìwé kan náà? Èyí ni ohun tí a mọ̀
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published June 10, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-achọ nnwere onwe bụ́ Indigenous People of Biafra (IPOB), na ngá.

Okwu a nke @NgoziCommedy bipụtara, bụ nke e jiri ihe ngosị ebe Tinubu na ụfọdụ ndị Bishop na-akpa ńkàtá sochie.

Ihe ngosị nkeji abụọ na tinkom tinkom iri abụọ n’itoolu a enwetala nkiri puku ise na ụma narị itoolu (5.9k views), nkwenye iri isii (60 reactions), ntụnye ọnụ iri n’atọ (13 comments), na nkesa iri n’isii (16 shares).

“Pope Leo nke iri na isii na ụfọdụ ndị Bishop ayọla Tinubu ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu na ǹgá, ka udo chịa na mpaghara south-east,” ozi ahụ kwuru.

Asafe ọzọ akpọrọ @United Nations Mission for Referendum in Biafra Land biputakwara ozi dịkwa ka nke a, ma kwuo na Pope Leo yọrọ ọchịchị Naijiria ka ọ tọpụ Nnamdi Kanu na ǹgá iji kwalite udo na Naijiria nakwa na Afrika.

A nwụchiri Kanu na na afọ 2015, mgbe a sịrị na o mere mpụ megide obodo ya, mana e mechara hapụ ya mgbe o zutechara ọnọdụ niile e nyere ya.

Ọ gbapụrụ Naijiria ka a tọpụrụ ya na ǹgá mgbe ahụ, mana a bịara nwụchikwa ya ọzọ n’afọ 2021 n’ụzọ nwere ka ọ dị.

Mkpọchi ya na ǹgá kpalitere ọtụtụ ị́gba akwụkwọ n’ụlọ ikpe, tinyere ụfọdụ ndị na-akpo maka ntọhapụ ya na ǹgá.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

CableCheck nyochara akụkụ ihe ngosị ahụ, ma chọpụta na ọ pụtara ìhè mgbe e hibere Pope Leo dịka onye isi ụka Catholic.

Mmemme a nke e mere n’ụbọchị asatọ nke ọnwa May bụ n’ihi ọnwụ Pope Francis nwuru n’ụbọchị iri abụọ n’otu nke ọnwa April ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.

Onyeisiala Bola Tinubu so na ndị a ma-ama bịara nya bụ mmemme.

N’akụkụ nya bụ mmemme, Tinubu na ụfọdụ ndị Bishop sò na ndị si Naijiria bịa Vatican zutere ịnwe mkpakorita ụka.

N’ihe ngosị nke ezigbo ya, a nụrụ ka ndị Bishop ahụ na-ekele Tinubu maka ime ka ọbịbịa ha na Vatican nwe isi, ya na iwepụta oge ịbịa nya bụ mmemme n’onwe ya.

Pope esoghị na ndị nọ n’ime ụlọ ebe Tinubu na ndị Bishop a na-enwe mkparịta ụka a. O nweghịkwa mgbe ha jiri yọ Tinubu ka ọ tọpụ Kanu na ǹgá.

Anyị chọpụtara na asafe ndị biputagasịrị nya bụ okwu na-akwado otu nnwere onwe Biafra.

Na mgbakwunye, onweghị ụlọ ọrụ nzisa ozi a mara ọfụma biputara nya bụ ozi.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na Pope Leo na ndị Bishop yọrọ Tinubu ka ọ tọpụ Kanu na ǹgá bụ asị.

TAGGED: fact check in Igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu June 10, 2025 June 10, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG

A video circulating on social media shows a Facebook user claiming Godwin Emefiele, the former…

July 2, 2025

FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency

The presidency says reports on George Akume, secretary to the government of the federation (SGF),…

June 29, 2025

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí…

June 28, 2025

Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women

In the early hours of April 15, 2025, armed men wielding firearms and cutlasses attacked…

June 28, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí orílẹ̀ èdè Ísírẹ́lì kí rògbòdìyàn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission. One male broadcaster wey dey…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin gwiwa na tallafawa zaman lafiya…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?