TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading:  Ḿbà, ọ́gwụ̀ ḿkpụ́rụ paracetamol énweghị ọ́rị́à ńjé Machupo
Share
Latest News
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal
No, Nigeria no send peace support mission go Israel
A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba
Ǹjẹ́ Tinubu àti Alexander Zingman lọ sí ilé-ìwé kan náà? Èyí ni ohun tí a mọ̀
Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà
Tinubu go di same school wit Alexander Zingman? Na wetin we sabi be dis
Shin Tinubu ya halarci makaranta daya da Alexander Zingman? Ga abin da muka sani
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

 Ḿbà, ọ́gwụ̀ ḿkpụ́rụ paracetamol énweghị ọ́rị́à ńjé Machupo

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 21, 2023 4 Min Read
Share

Ótù ozi a hụtara n’ọ́bá ozi WhatsApp aduọla ọtụtụ ọ́dụ̀ màkà ịṅụ ọgwụ paracetamol, ọkachasị nke e dere “P/500” n’ahụ ya.

Ozi a dọrọ aka na ntị n’ọgwụ à nwere ọrịa nje Machupo. Ọ kọwara na onye ọbụla ṅụrụ ya ga-ebute  ọrịa a.

“Kpachara anya kà ị ghara ịṅụ Paracetamol nke e dere P-500 n’ahụ ya. Ọ pụtara ọhụrụ ma na-achakwa ezigbo ocha. Ndị dọkịta kwuru na o nwere ọrịa nje Machupo nke a sị na ọ bụ ótù n’ime ọrịa nje kacha egbu-egbu n’ụwa niile,” ihe à kà ọzị à kwuru.

Ọ bụghị naanị n’ọba ozi WhatsApp kà a hụtara ozi a. Ozi a pụtakwara na Facebook.

“Biko gbasaa ozi a kà ó rúó ákàrà ndị niile nọ na ekwentị gị, mà ndị ezinụlọ gị. Nke à bụ màkà ịzọ ndụ. Emego m nke dị m n’áká. Ugbua, Odizi gi n’aka ịme nke gị áká… Chetakwa na ọ bụ ndị na-enyere onwe ha nà ndị mmadụ áká kà Chineke na-enyere áká! Kesaa k’isi nweta,” ihe à kà ozi à kwuru nà Facebook.

Ọzị a ekwughị mà ònwèrè onye dọkịta m’ọbụ ụlọ mmepụta ọgwụ á kpọtụrụ màkà nya bụ ókwú, ịchọpụta ma ọ bụ eziokwu.

Paracetamol bụ ọgwụ na-akwụsị àhụ́ mgbu nke ndị dibịa oyibo ji àgwọ́kwá obere ahụ ọkụ. Ọnụ ọgụgụ ọgwụ paracetamol ǹkè okenye kwesịrị ịṅụ pụtara milligram narị ịse maọbụ ótù gram.

Machupo bụ ọrịa esi n’anụmanụ ebute nke amara dịka black typhus maọbụ Bolivan hemorrhagic fever. A chọpụtara ya n’ọnwa 1959 na Bolivia, mà kwupụta nà ndị butere nya bụ ọrịa nọ nanị n’obodo South Africa.

Dịka Mahadum Standford kwụrụ, ọrịa nje a na-agbasa site n’ikuku, nri, maọbụ mmekọrịta gị n’onye bu ọrịa a.

Mana mkpụrụ ọgwụ Paracetamol ò nwèrè nje Machupo n’ime ya?

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Nnyocha TheCable mere gosịrị nà okwu à bidoro ń’éfèghárị́ n’ọba ozi dị iche-iche n’afọ 2017, nke mere kà ọtụtụ ndị mbipụta akụkọ kwupụta nà nya bụ ókwú abụghị eziokwu.

N’afọ 2017, ngalaba na-ahụ màkà ahụike n’obodo Malaysia kwùrù nà ozi a bụ àsị́.

Ngalaba à gbakwunyere sị nà ha enwetaghị ozi ọbụla nà paracetamol nwere ọrịa nje Machupo n’ime ya n’aka ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ịrụpụta ọgwụ n’obodo ha maọbụ obodo ndị ọzọ.

N’ụbọchị asaa nke ọnwa May, ngalaba na-ahụ màkà njikwa ọgwụ na Zambia, nke bụ Zambia Medicines Regulatory Authority, bipụtara ozi sị na ókwú a na-agbasa na soshal midia “bụ ókwú ụgha ma bụrụkwa nke ndị mmadụ ekwesịghị itinye uche na ya”.

Ngalaba à gbakwunyere na o nweghị ihe na-egosị na ndị niile ekwuputara bú ọrịa Machupu butere ya site n’ịṅụ ọgwụ paracetamol.

Nonso Odili, onye na-ere ọgwụ mà bụrụkwa onye ụlọrụ DrugIT, gwara TheCable nà ozi a bụ nnọ asị, mà bụrụkwa ozi n’ezighi-ezi nke ekwutọgoro ọtụtụ oge.

“Ozi a bụ ozi ochie. O nwere mgbe o na-efeghari ọtụtụ oge gara-aga. Anyị pụtakwara sị na ọbụghị eziokwu. Mgbe ahụ, WHO na NAFDAC ekwughị ihe ọbụla gbasara ya. O nwere ike bụrụ nà ọbaghị uru,” ihe à kà Odili kwuru.

“O dị mkpa ka anyị ṅụọ ọgwụ nwere ákàrà NAFDAC n’ahụ ya.”

Onye ọzọ tunyekwara ọnụ n’okwu a bụ Olusayo Akintola, onye na-ekwuchitere ngalaba na-ahụ màkà njikwa ọgwụ n’ala Naijiria bụ National Agency for Food and Drug Administration (NAFDAC), kwuru na e kwesịrị kà eleghara okwu à anya n’ihi na o nweghị nnyocha ndị oyibo sochiri ya bụ okwu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi wuru èwù nà ọgwụ paracetamol nwèrè ọrịa nje Machupo n’ime ya bụ asị. Ókwú ụgha à nke na-apụta kwa mgbe kwa mgbe bụ nke e zisagoro n’ọtụtụ obodo, ma bụrụkwa nke ekwuputagoro ọtụtụ mgbe dịka asị.

TAGGED: Machupo virus, nafdac, Paracetamol

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 21, 2023 August 21, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí…

June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa…

June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission.…

June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin…

June 28, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí orílẹ̀ èdè Ísírẹ́lì kí rògbòdìyàn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission. One male broadcaster wey dey…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin gwiwa na tallafawa zaman lafiya…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?