TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
Share
Latest News
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
FACT CHECK: No, Nwifuru didn’t suspend officials for failing to attend child’s birthday party
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 1, 2025 3 Min Read
Share
Francis Nwifuru

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n’ise (25 commissioners) na ndị ọrụ gọọmenti ndị ọzọ ọrụ maka na ha jụrụ ịbịa mmemme ncheta ọmụmụ nwa ya.

Ozi a nke asafe Igbo History & Facts bipụtara na X enwetala nkiri otu narị na iri na isaa (117k views), nkwenye otu puku na ụma narị atọ (1.3k likes), nkesa narị asaa na iri n’asaa (777 reposts), na ntụnye ọnụ narị ise n’ise (505 comments).

Ejikwara ihe ngosị ebe Nwifuru na nwunye ya na nwa ya nwanyị nọkọtara ọnụ were bipụta nya bụ ozị. Anyị hụtara ozi ahụ ka e bipụtara ya ebe a, ebe a, n’ebe a.

N’ụbọchị Tuesday, Nwifuru kwụsịrị ndị kọmịshọna ya dị iri abụọ n’ise, ndị ọrụ ógó dị elu iri n’anọ, ndị special assistant iri abụọ n’anọ, na ndị permanent secretary iri abụọ n’abụọ n’ọrụ maka na ha abịaghị mmeme dị mkpa.

Nwifuru kwuru na ndị ọrụ a ga-akwụsị ọrụ otu ọnwa, n’enweghị ụgwọ ọnwa ọbụla a ga-akwụ ha, nakwa na ha agaghị abịanye aka ná akwụkwọ ọbụla n’oge ahụ.

ŃNYÒCHÁ

CableCheck nyochara asafe Facebook gọvanọ ma chọpụta na ihe ngosị ahụ ejiri bipụta ozi ahụ sitere na ụka ncheta ọmụmụ nwa ya nwanyị nke e mere n’ụbọchị Sunday, July 27— ụbọchị abụọ tupu ekwupụta nkwụsị ọrụ ndị comịshọna ahụ.

Anyị kpọturụ Monday Uzor, onye nkwuchita ọnụ Nwifuru, onye kọwara na mbipụta ahụ bụ aka ọrụ “ndị ochonganoko”.

Uzor kwuru na nkwụsị ọrụ ahụ bụ maka na ndị ọrụ ahụ abịaghị mmeme egwuregwu basic school sports competition, nké ngalaba Universal Basic Education Board (UBEC) hibere na steeti ahụ.

O Kwukwara na gọvanọ gwara Patricia Obila, osote ya, ka ọ nọchita anya ya na ọgbakọ ahụ, ma gwakwa ndị ọrụ ndị ahụ ka ha ga nonyere Obila, mana ha agaghị.

“Gọvanọ anọghị, ọ gwara osote ya ka ọ nochita anya ya na mmeme egwuregwu Basic School Sports competition nké ngala Universal Basic Education Board (UBEC) hibere. Mana ọtụtụ ndị ọrụ ahụ abịaghị,” Uzor gwara CableCheck.

“Mgbe gọvanọ nụrụ nke, ọ bịara kwụsị ha ọrụ, maka nke a abụghị mbụ ha na eme ihe dị otú a.

“Ndị na-ekesa ozi a bụ ndị ochonganoko. Ha ma nke bụ eziokwu.

“Ihe ngosi nke ha ji ekesa ozi ahụ enweghị ka o siri gbasata ozi ahụ, e sere ya na ọgbakọ naanị ezinụlọ gọvanọ gara na onwa July.”

Anyị mekwara ọchịchọ n’asafe Facebook Obila ma hụ na nya bụ mmeme UBEC bụ nke e mere n’ụbọchị iri abụọ n’ise — ụbọchị abụọ tupu e mee mmeme ncheta ọmụmụ nwa Nwifuru.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na Nwifuru kwụsịrị ndị kọmịshọna na ndị ọrụ ngó ndị ọzọ ọrụ n’ihi na ha abịaghị ncheta ọmụmụ nwa ya nwanyị bụ asị.

TAGGED: commissioners suspended, Ebonyi state, Factcheck in igbo, Francis Nwifuru, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 1, 2025 August 1, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025

Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI

One video wey show as bridge dey collapse dey waka for social media, especially Facebook.…

July 29, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI

One video wey show as bridge dey collapse dey waka for social media, especially Facebook. For di five-second video, di…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 29, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?