TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, ICC ényeghị ìwú kà á kpọ̀chìé Akpabio nà ǹgá
Share
Latest News
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal
No, Nigeria no send peace support mission go Israel
A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba
Ǹjẹ́ Tinubu àti Alexander Zingman lọ sí ilé-ìwé kan náà? Èyí ni ohun tí a mọ̀
Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà
Tinubu go di same school wit Alexander Zingman? Na wetin we sabi be dis
Shin Tinubu ya halarci makaranta daya da Alexander Zingman? Ga abin da muka sani
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, ICC ényeghị ìwú kà á kpọ̀chìé Akpabio nà ǹgá

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 5, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na soshal mịdia ekwuola na ụlọikpe ndị omekome nke mba ụwa bụ International Criminal Court (ICC) enyela iwu ka ndị uwe ojii kpọchie onye isi ụlọ omeiwu Naijiria bụ Godswill Akpabio na ǹgá.

Ozi a nke otu asafe na Facebook bụ  @VoiceUpNaija biputara enwetala nkwenye otu narị na iri anọ (140 likes), ntụnye ọnụ iri itoolu n’abụọ (92 comments), na nkesa iri isii n’abụọ (62 shares).

Ụfọdụ asafe na Facebook nakwa LinkedIn kesakwara nya bụ ozi

“Ozi mgberede: ICC enyela iwu ka a kpọchie onye ịsị ụlọ ome ịwụ Naijiria na ngá maka ebubo akwamịkọ,” ozi a kwụrụ.

“Ụlọ ikpe International Criminal Court (ICC) amabidola onye isi ụlọ omeiwu Naijiria iwu ịga obodo ọzọ, ma nye iwu ka a kpọchie ya na nga ma a hụ ya n’obodo ọbụla.”

Ozi a na-abịa n’ihi nghọtaghe nke dị n’etiti Akpabio na Natasha Akpoti-Uduaghan, onye omeiwu na-anọchite anya ndị Kogi central, n’ihi ọnọdụ oche na ụlọ omeiwu kacha elu na Naijiria.

Ka nke a gachara, ụlọ omeiwu senate wegara nya bụ okwu nye nnokọ na-ahụ maka ikpe gbasara ezi àgwà, ọnọdụ ruru onye na mkpesa ndị omeiwu, iji taa Akpoti-Uduaghan ahụhụ ruru ya.

N’ụbọchị iri abụọ n’asatọ, Akpoti-Uduaghan bòrò Akpobio ebubo na ọ kpasoro ya agwa dịka ọ chọrọ ịkwasaya iko n’ike n’ime ụlọ ọrụ ya nakwa n’ụlọ ya nke dị na Akwa Ibom steeti.

E nyere ya oche azụ ọnwa isii n’ụbọchị isii nke ọnwa March n’ihi nsogbu gbasara ọnọdụ oche n’ụlọ omeiwu nke Naijiria.

N’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa March, onye senator nke Kogi a kpesara oche azụ a e nyere ya nye nnokọ mba ụwa nke ụlọrụ United Nations (UN) bu Inter-Parliamentary Union (IPU).

ICC Ò NYÈRÈ ÌWÚ KÀ Á KPỌ̀CHÍÉ GODSWILL AKPABIO NÀ ǸGÁ?

ICC bụ ụlọ ikpe ndị omekome mba ụwa nke na-enyoba anya ma na-emegide ndị mmadụ e bòrò ebubo arụ dị ụkwụ n’obodo ọbụla.

Inyocha okwu a, CableCheck lebara anya na webusite ICC ịmata ma ha ebiputara nya bụ ozi maka ịnwụchi onye ome iwu a, mana anyị ahụghị ihe dị otu ahụ.

Anyị chọpụtakwara na onweghị ụlọ ozi bipụtara nya bụ okwu.

CableCheck kpọtụkwara Fadi El-Abdallah, onye nkwuchita ọnụ ICC, onye kwuru na onweghị ozi ịnwụchi Akpabio maọbụ onye ọbụla si Naijiria ha bipụtara.

El-Abdallah kwuru na ọ bụ ọrụ ICC ikwuputa mbido nnyocha ọbụla ha na-akwado ime na webusite ha tupu ha enye iwu ka a kpọchie onye dị ótú ahụ.

“Enweghị iwu ịkpochi onye ọbụla na Naijiria. Ebe ndị na-eme nya bụ nchọpụta e kwupụtabeghị nya bụ ozi na webusite ha, usoro dị mkpa tupu ICC enye iwu maka ịkpochi onye dị ota a,”El-Abdallah kwara Cablecheck site na ozi email.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na ICC enyela iwu ka a kpọchie Akpabio na nga bụ asị.

TAGGED: arrest, Factcheck in igbo, Godswill Akpabio, ICC, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 5, 2025 April 5, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí…

June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa…

June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission.…

June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin…

June 28, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí orílẹ̀ èdè Ísírẹ́lì kí rògbòdìyàn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission. One male broadcaster wey dey…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin gwiwa na tallafawa zaman lafiya…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?