TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ị́gbọ ńchà ò nà-èmé ụ́mụ̀ nwóke ísí ńkwọ́chá
Share
Latest News
Video wey tok sey Nigerian church dey on fire na lie, na Ghana school
Ị́hé ńgósị́ ụ́lọ́ákwụ́kwọ́ Ghana gbáráọ́kụ́ ká á sị́ n’ọ́bụ́ ụ́lọ́ ụ́ká dị́ nà Naijiria
Bidiyon gobarar da ta faru a makarantar Ghana da aka bayyana karya a matsayin kona cocin Najeriya
Ghana ni ìṣẹ̀lẹ iná ní ilé ìwé kan tí àwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ kiri ti ṣẹlẹ̀, kìí se ilé ìjọsìn àwọn Kristẹni ní Nàìjíríà
FACT CHECK: Video of Ghanaian school fire incident falsely described as razed Nigerian church
RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ị́gbọ ńchà ò nà-èmé ụ́mụ̀ nwóke ísí ńkwọ́chá

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published September 5, 2022 4 Min Read
Share

Ọtụtụ mmadụ na mgbasa ozi ọha kwùrù sị na ụmụ nwoke imetụ onwe ha aka n’amụ bụ ótù ihe na-eme kà ha nwee ísí ńkwọ́chá.

Onye bu ụzọ tinye ókwú a na Twitter bụ ótù onye na-aza Eric (@amerix). Ọ sị na óké ị́gbọ ńchà na-ème ńtùtù ísi ụmụ nwoke ịdapụ.

“Ótụ ihe na-eme kà ụmụ nwoke nwee ísí nkwọcha bụ imetụ ònwé ha aka n’amụ. Óké ị́gbọ ńchà na-eme ka ńrí dị mkpà màkà òtító ńtùtù ísi nwụọ. Mgbe ọbụla ị hụrụ nwoke nwere ńtùtù isi na-ala àzụ́, chetere ya kà ọ kwụsị ị́gbọ ńchà,” nke a bụ ihe Eric dèrè.

Ndị kere okwu a karịrị ótù puku na narị anọ. Ndị ọ màsị̀rị̀ rùrù pụkụ asatọ na narị asatọ.

Na Facebook, ekere ótù mbiputa a ọtụtụ ugboro na akaụntụ dị iche iche. Otu n’ime ha bụ nke Emem Nelson, onye kwuru na ọ bụ dọkịta. Ndị na-eso ya karịrị puku asatọ.

Onye ọzọ na Facebook, Jay Ade, tinyere okwu a na Medriod Elite City, ótù ọha na Facebook nke nwere mmadụ puku itoolu na-eso ya.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Akwụkwọ nkọwa okwu, Merriam-Webster Dictionary, kọwara Ị́gbọ ńchà dị ka ị́kpalite agụụ mmekọahụ síté n’imetụ ònwé mmadụ áká, ébé ebumnobi bụ̀ inwete ụtọ aramara.

Dika nkọwa a sìrì kwuo, o nwere ike ísite na mmetu aka ma ọ bụ íji ngwa aramara ma e wezụga mmekọahụ nnwoke na nwayị, ma ọ bụ ngwakọta ihe a niile, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.

TheCable kpọtụrụ ọkachamara ahụ ịchọpụta ma o nwere ụzọ sayensị sì kwàdó okwu nke sị na ị́gbọ ńchà na-eme kà ụmụ nwoke nwee isi ńkwọ́chá.

Best Odinioha, prọfesọ public health & community medicine, sị na ọ bụghị eziokwu.

Ọ sị na isi ńkwọ́chá na ị́gbọ ńchà enweghị mmekọrịta. Ọ sị na onye dere nya bụ okwu na Twitter chọrọ iji ya dọta ndị mmadụ.

O kwukwara na o nwèrè ike iji ya na-eme ka ndị mmadụ tụọ égwù na ihere n’ebe ndị ísí ńkwọ́chá nọ̀.

Odinioha sị na ndị mmadụ nwèrè íké ịhụ nwoke nwere ísí ńkwọ́chá, ma chee na ha na-emetụ onwe ha áká n’amụ.

ÍHÉ NWERE ÍKÉ ÍME ḾMÁDỤ̀ ÍNWE ÍSÍ ŃKWỌ́CHÁ

Francis Agbaraolorunpo, ọkachamara ahụ na Mahadum Lagos, sị na o nwere ihe dị iche iche nwere ike ime kà nwóke nwee ísí ńkwọ́chá, mana ọ bụghị imetụ ámụ̀ áká.

“Ótù ihe na-eweta ísí ńkwọ́chá bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa. Mmadụ nwere ike iketa ya site n’aka nne na nna ya”, ihe a kà ó kwùrù.

“Ọ̀zọ́ bụkwa na ndị arụ adịrọ nwere ike ịnwe ísí ńkwọ́chá. Ọrịa ndị bekee na-akpọ alopecia, ma ọ bu cancer, nwekwara ike ime ka ha nwee ísí nkwọcha. Na ụdịrị ọnọdụ a, ụmụ nwaanyị nwere ike ịnwe ísí nkwọcha.”

Ọkachamara kwusiri ike, sị na imetụ aka n’amụ bụ ókwú gbasara uche. Ọ sị na onweghị ihe gbasara ị́gbọ ńchà n’ebe ísí nkwọcha nọ, ma ọ bụ òtú nwoke dị.

Ọ gara n’ihu ikwu na ọ bụrụ na nwoke enweghị oke onwe ya, onwere ike ime ka ọ na emetụ onwe ya aka n’amụ.

“Ị́gbọ ńchà nwere ike ime ka nwoke atunyenwune nwanyị ime. Nwoke na-emetu onwe ya aka n’amu nwere ike ịnwe obere spam ma ya na nwaanyị nwee mmekọ,” ihe a kà ọ kwùrù.

ÍKPÉ

Mgbarakwa na mmadụ imetụ onwe ya aka n’amụ bụ ihe nke mbụ na-eme ka nwoke nwee isi nkwọcha bụ okwu adịgboroja. Dị ka sayensị kwuru, nwoke ị́gbọ ńchà na inwe isi nkwọcha enweghị mmekorita.

TAGGED: Best Odinioha, Francis Agbaraolorunpo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora September 5, 2022 September 5, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Video wey tok sey Nigerian church dey on fire na lie, na Ghana school

One TikTok user claim sey jihadists burn church for di northern part of Nigeria. One…

December 12, 2025

Ị́hé ńgósị́ ụ́lọ́ákwụ́kwọ́ Ghana gbáráọ́kụ́ ká á sị́ n’ọ́bụ́ ụ́lọ́ ụ́ká dị́ nà Naijiria

Ótú onye na TikTok ekwuola na ndị jihad a gbaala ụlọ ụka ọkụ na mpaghara…

December 12, 2025

Bidiyon gobarar da ta faru a makarantar Ghana da aka bayyana karya a matsayin kona cocin Najeriya

Wani mai amfani da TikTok ya yi ikirarin cewa mayakan jihadi sun lalata wata Coci…

December 12, 2025

Ghana ni ìṣẹ̀lẹ iná ní ilé ìwé kan tí àwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ kiri ti ṣẹlẹ̀, kìí se ilé ìjọsìn àwọn Kristẹni ní Nàìjíríà

Ẹnì kan tó ń lo TikTok, ibì kan lórí ayélujára tí áwọn ènìyàn ti máa…

December 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey tok sey Nigerian church dey on fire na lie, na Ghana school

One TikTok user claim sey jihadists burn church for di northern part of Nigeria. One TikTok user — @WakaWakaplanet —…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 12, 2025

Ị́hé ńgósị́ ụ́lọ́ákwụ́kwọ́ Ghana gbáráọ́kụ́ ká á sị́ n’ọ́bụ́ ụ́lọ́ ụ́ká dị́ nà Naijiria

Ótú onye na TikTok ekwuola na ndị jihad a gbaala ụlọ ụka ọkụ na mpaghara ụ́gwụ́ nke Naịjiria. @WakaWakaplanet jiri…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 12, 2025

Bidiyon gobarar da ta faru a makarantar Ghana da aka bayyana karya a matsayin kona cocin Najeriya

Wani mai amfani da TikTok ya yi ikirarin cewa mayakan jihadi sun lalata wata Coci a yankin arewacin Najeriya. Wani…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 12, 2025

Ghana ni ìṣẹ̀lẹ iná ní ilé ìwé kan tí àwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ kiri ti ṣẹlẹ̀, kìí se ilé ìjọsìn àwọn Kristẹni ní Nàìjíríà

Ẹnì kan tó ń lo TikTok, ibì kan lórí ayélujára tí áwọn ènìyàn ti máa ń fi àwòrán tàbí fídíò…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 12, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?